Baboon in Awka: Ejidela enwe 'JohnBull' tara nwata akwụkwọ n'Awka, Anambra State

Awka Baboon: Ejidela enwe 'JohnBull' tara nwata akwụkwọ n'Awka, Anambra State
Nkọwa foto, Awka Baboon: Ejidela enwe 'JohnBull' tara nwata akwụkwọ n'Awka, Anambra State

Ejidela utobo ya bụ enwe 'JohnBull' ahụ tara nwata akwụkwọ n'Awka, Anambra State.

Ndị nwe ụlọọgwụ 'Centre for Psychic Healing' dị n'Awka bụ Flora Ilonzo agwala BBC etu a.

Nwata akwụkwọ enwe tara

Ebe foto si, Getty Images/BBC

Flora Ilonzo onye nwe ụlọọgwụ 'Centre for Psychic Healing' dị n'Awka dị n'Awka gwara BBC na ọ bụ ụdị enwe bụ utobo, o dosara n'ụlọ anụmanụ gbapụrụ, na ọ bụghị ozodimgba dịka ndị mmadụ siri akọ.

Ilonzo kwuru na ọ zụtara enwe a kamgbe afọ iri na abụọ gara aga dịka otu n'ime ọtụtụ anụmanụ o ji mere ihe nkiri n'ụlọọgwụ ya.

Mgbe BBC rutere n'ogige ahụ, a hụrụ ọtụtụ anụmanụ ndị ọzọ mana enwe a tara mmadụ alaghachibeghị n'ụlọ nchekwa e dosara ya.

Ilonzo gwara BBC Igbo na ọ bụ na Tuzdee ka enwe ahụ a kpọrọ Johnbull richara nrị wee pụọ n'ebe e dosara ya.

Flora Ilonzo
Nkọwa foto, Flora Ilonzo bụ onye nwe ụlọọgwụ 'Centre for Psychic Healing' dị n'Awka.

Mgbe ọ pụrụ ezi ka ụmụakwụkwọ malitere ịma ya okwute nke mere o ji taa otu nwata akwụkwọ.

Flora Ilonzo kwuru na ọ bụ ya zụtara ọgwụ 'anti-rabbies' nke a gbara nwata akwụkwọ ahụ.

Nwata akwụkwọ enwe tara

Ndị uweojii mekwara nchọpụta hụ na ya bụ nwatakịrị alaghachila n'ụlọakwụkwọ kamgbe a gbachara ya ọgwụ ahụ.

Enwe ahụ bụ Johnbull ka nọkwa n'ime ọhịa gburugburu ụlọọgwụ ahụ

Utobu na-awakpo ndị mmadụ n'Ọka, Anambra Steeti

Baboon Utobo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Awka Baboon: Ejidela enwe 'JohnBull' tara nwata akwụkwọ n'Awka, Anambra State

Utobo si ebe edowere ya agbapụ na-enye ndị bị na mpaghara Commissioners Quaters nke dị n'Ọka, Anambra steeti nsogbu

Otu onye ji akara @Zomsy na Twitter dere na utobo si n'ụlọ ọgwụgwọ akpọrọ "Centre for Psychic Healing Awka" gbapụ ma na-enye nsogbu na mpaghara obi gọọmenti dị n'Ọka, Anambra steeti. Na nkọwa nwa amadị a, utobo a na-agbapụ aga gburugburu ụka St. Thomas Acquinas na ụzọ Commissioner's Quarters were na-awakpo ma na emerụ ndị mmadụ ezigbote ahụ.

O kwuru na mwakpo utobo a emerụọla ụmụaka na-aga akwụkwọ ahụ site na mwakpo ya.Awka Baboon: Ejidela enwe 'JohnBull' tara nwata akwụkwọ n'Awka, Anambra State

Foto nwa amadị a tinyere n'akara Twitter ya gosiri mmerụ ahụ ụfọdụ ọ si adaka a merụrụ ndị mmadụ.

Ebe ya bụ anụmanụ siri gbapụ
Nkọwa foto, Awka Baboon: Ejidela enwe 'JohnBull' tara nwata akwụkwọ n'Awka, Anambra State

Ọ na-arịọ gọọmenti ka ọ gbatara ndị mmadụ enyemaka maka ihe a.

Ọka bụ obodo eji nsọ enwe mara, mana adaka adịghị ka ọ bụ nke akpa ala ya si Ọka.

Anụmanụ ndị ọzọ nọ ebe ahụ

Ebe a dịka ha e nwere ogige anụmanụ ndị ọzọ:

Crocodile
Nkọwa foto, Agụiyi
Enyi Nnụnụ
Nkọwa foto, Enyi Nnụnụ

Dịka ọ dị ugbu a, onye ntaakụkọ BBC Igbo awụchiela na ebe ya bụ ihe na-eme ka ọ mara etu aka ya bụ enwe siri banye n'ofe.

Aha onyonyo, Lee ụmụanụmanụ dị icheiche bi n'ogige ha n'Imo steeti