Nwata, nwa agbọghọ, ogoli, Eze nwaanyị, agadị nwaanyị, ajadu na aha ndị ọzọ ndị Igbo na-akpọ ụmụnwaanyị

Aha e ji mara ụmụnwaanyị
Nkọwa foto, Nwata, nwa agbọghọ, ogoli, Eze nwaanyị, agadị nwaanyị, ajadu dgz socha aha a na-etu ụmụ nwaanyị site n'ogogo ha n'obodo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ịmụta nwata nwaanyị n'ala Igbo bụ ihe oke aṅụrị maka na a na-ahụta nwaanyị dịka akụ.

Nwata nwaanyị a mụrụ ọhụrụ ga-agafe ogogo dị iche iche dịka ọ na-eto tupu o ruo na nka.

E nwere aha ndị Igbo na-agbakwunyere ogogo ọbụla ụmụnwaanyị ndị a ruru, nke na-egosipụta afọ ole nwaanyị gbara nakwa ọnọdụ ha nọ n'obodo.

Aha ndị a na-amalite site na mgbe a mụrụ nwaanyị ọhụrụ ruo mgbe ọ kara nka bụrụ agadi.

Akụkọ ndị ọzọ anyị dere maka ụmụ nwaanyị n'omenala Igbo

Aha ụmụnwaanyị n'ogogo dị iche iche

Nwata a mụrụ ọhụrụ

Ebe foto si, Jidenna Jesse Osondu/ Abia Info

Nkọwa foto, Nwata a mụrụ ọhụrụ

Ndị ọkachamara n'omenala Igbo gụnyere Durueke Nwangene na Ihunanya Anusiem tinyere ọnụ na nkọwapụta ọnọdụ ndị a, wee kwuo na aha a na-etu umu nwaanyị gunyere ndị a:

Nwata nwaanyị

Nke a bụ aha a na-akpọ nwaanyị site na mgbe a mụrụ ya ọhụrụ ruo mgbe ọ gbara ihe dịka otu afọ.

Ọ bụrụ na o ruo afọ abụọ gawa afọ ,a kpọọ ya 'nwata nwaanyị na-etolite etolite'.

O nwereike ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị e bu ụzọ mụọ, a ga-akpọ ya 'Nwada nwaanyị'.

Akụkọ ndị wuru n'oge e dere akụkọ a

Obere agbọghọ

A na-akpọ nwaanyị 'obere agbọghọ' ma ọ bụrụ na o tolite site n'afọ itoolu ruo afọ iri na itoolu.

Mgbe ahụ e nweela mgbanwe n'ahụ ya nke gụnyere; ịkpụ ara, ịgba ajị abụ na nke ngada, ịhụ nsọ ya nakwa mgbanwe ndị ọzọ.

Site n'afọ iri na asatọ gawa ruo afọ iri abụọ na otu, e nwereike ịkpọ ya 'Agbọghọ nwaanyị'.

Nwaagbọghọ tozuruoke

Ebe foto si, nemz_photography

Nkọwa foto, Nwaagbọghọ tozuruoke

Nwaagbọghọ tozuruoke

Ogogo a bụ mgbe nwaanyị tozuru etozu ịlụ di dịka mkpụrụosisi chara acha na-eche ọghụghọ,

Nke a bụ mgbe ọ gbara ihe dịka afọ iri abụọ na otu ruo afọ iri atọ.

Nwaanyị lụrụ di

Ebe foto si, Franklyn Idika

Nkọwa foto, Ogoli nwaanyị

Ogoli nwaanyị

Nke a bụ aha a na-enye nwaanyị ma ọ bụrụ na ọ lụọ di. Mgbe ọ lụrụ di ọhụrụ, ndị mpaghara Bende n'Abia Steeti na-akpọ ya 'mgbirichi'.

Dịka nwaanyị lụchara di, aha ndị ọzọ a na-etu ya gụnyere Ori aku, Odozi akụ, Oso di eme, Oso di akpa akụ dgz.

Di ya maọbụ nwoke nwereike kpọọ ya 'nwunye m', mgbe ahụ ọ ga na-eme ihe a tụrụ anya n'aka ya dịka ị na-achịkọta ezinaụlọ.

E nwere ụfọdụ mmemme na omenala e nwere imere nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ, n'otu aka ahụ ka e nwere omenala imere nwata bịara ụwa ọhụrụ

Ebe foto si, Regina Daniels/Insta

Nkọwa foto, Nne nwa maọbụ nne ọmụgwọ

Nne nwa maọbụ nne ọmụgwọ

Ọ bụ aha a na-etu nwaanyị lụrụla di ma mụọ nwa maọbụ ụmụ.

Mgbe ọ mụrụ nwaanyị ọhụrụ ka a na-akpọ ya 'nne ọmụgwọ' mana ọ bụrụ na ụmụ ya tolite a ga-akpọ nwaanyị ji nwa maọbụ ji ụmụ.

Mgbe ahụ nwaanyị a nwereike nọrọ n'ihe dịka afọ iri abụọ na otu gbagoo elu.

Ọ bụrụ na nwaanyị lụọ di na-amụtaghị nwa, a na-akpọ ya 'Nwaanyị Aga' mana ọ bụ ọnọdụ mwute.

Ụfọdụ nwaanyị dị etu a na-anọ n'ihe iru uju, n'ihi na ụfọdụ ndị na-ahụta ya dịka osisi na-amịghị mkpụrụ na-eche ụbọchị a ga-egbutu ya.

Ugoeze na lọlọ: Aha a na-akpọ ụmụnwaanyị chiri echichi

Aha a na-akpọ ụmụnwaanyị chiri echichi maọbụ bụrụ agbara nwaanyị
Nkọwa foto, Aha a na-akpọ ụmụnwaanyị chiri echichi maọbụ bụrụ agbara nwaanyị

Dịka nwaanyị lụrụ dị ma mụọ ụmụ, na-azụ ụmụ ya ka ha na-eto n'otu aka ahụ ọ ga na-etokwa.

Ọ ga na-eto ruo ogogo e nwereike chie di ya echichi dịka Eze, Nze, Ọzọ maọbụ Ichie.

A na-eso na-echi nwaanyị dị etu a echichi dịka 'Ugoeze, Lọlọ. A na-akwanyere ha ugwu ebe ọ pụrụiche karịa ụmụnwaanyị ndị ọzọ.

Ezenwaanyị, Dibia na Nnekwu nwaanyị

Nke a bụ aha a na-etu ụmụnwaanyị maka echichi e chiri ha nke mere ha ji pụọ iche na ndị ọzọ.

Ezenwaanyị bụ aha a na-etu nwaanyị na-eme ihe mmiri, Dibia a bụrụ nke a na-etu nwaanyị na-eme ihe mmụọ ebe Nnekwu nne nwaanyị bụ echichi e chiri nwaanyị maka ọrụ ọma ọ na-arụ n'obodo.

A na-akwenyechara ụmụnwaanyị dị etu a ugwu pụrụiche.

Nwaanyị isimkpe (Ajadu)

Ebe e liri mmadụ 73 nwụrụ na mwakpo emere na Benue n'ọnwa Jenụwarị 2020

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaanyị isimkpe (ajadu) bụ aha a na-akpọ nwaanyị lụrụ di ma di ya anwụọ

Nke a bụ aha a na-akpọ nwaanyị lụrụ di ma di ya anwụọ.

Ọ ga-eji otu afọ ruo uju ọnwụ di ahụ ebe ọ ga-ewezuga onwe ya iche na-esoghi ndị mmadụ na-eme ihe ha na-eme.

Mgbe otu afọ gachara, a ga-eme omenala iji tọpụ ya na mkpe mana ọ ga na-azakwa nwaanyị isi mkpe.

Agadi nwaanyị

Mgbe nwaanyị tofere ajadu, o nwere ogogo ọ ga-eru mgbe afọ ya na-agbada ala, a kpọọ ya 'Agadi nwaanyị'
Nkọwa foto, Agadi nwaanyị

Mgbe nwaanyị tofere ajadu, o nwere ogogo ọ ga-eru mgbe afọ ya na-agbada ala, a kpọọ ya 'Agadi nwaanyị'

Ọ bụ nwaanyị nọrọla ndụ hụ ụmụ ụmụ ya, onye a na-akpọtụrụ n'obodo ma ihe sie ike.

A na-ahụta agadi nwaanyị dịka nwoke n'agbanyeghi na ọ bụ nwaanyị, a na-akwenyere ha ugwu dị elu n'omenala Igbo.

Agadi bụ ogogo ikpeazụ nwaanyị na-eru mgbe ọ katarala ahụ, n'ihe dịka afọ iri asaa na ise gbadawa ala.

Na nchịkọta, uru dị n'ịmata ogogo ndụ ụmụnwaanyị bụ maka igosi nsọpụrụ na nkwanye ugwu.

Igbo tụrụ ilu sị na "ugwu bụ nkwanye nkwanye mere nwaanyị ji mụta ibe ya."