Gịnị ga-eme ka a lụọ nwaanyị n'ozu n'ala Igbo?

Ebe foto si, Getty Images
A na-enwetakarị ndị ntoroọbịa na agbọghọbịa hụrụ onwe ha n'anya, ma kwekọrịtara ibikọta ọnụ dịka di na nwunye, mana ha emeghị omenala alụmdinanwunye dịka ha kwesịrị.
A na-ahụtakwa mgbe ụfọdụ ihe mberede dị iche iche n'ọnọdụ a, ọkachasị nwaanyị ịnọ n'ụlọ nwoke ahụ nwụọ na-enweghị mmemme alụm ọbụla e mere n'ụzọ omenala.
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara ụmụnwaanyị BBC Igbo mere
Ka o sila dị, nke a na-etinyekarị ezinaụlọ dị iche iche na gbagharịa.
N'ihi ajọ ọnọdụ a, ụfọdụ obodo dị n'ala Igbo, mere ya ka ọ bụrụ iwu na nwoke ga-alụ nwaanyị ya na ya bi n'ozu, bụ nke ọ na-emeghị mgbe ọ dị ndụ.
Ihe ga-eme ka alụọ nwaanyị n'ozu:

Ebe foto si, Getty Images
N'ala Igbo, anaghị ekweta na nwoke alụọla nwaanyị, maọbụrụ na o mezubeghị ihe n'isi ya.
Ọ bụrụgodu na o mere nke ụlọikpe, a tụrụ anya na ọ ga-abịa mekwaa ihe dịka ndị nwe nwa siri chọọ.
Dịka ọkachamara n'okwu gbasara omenala bụ Nze Olueze Ụkaejuoha (Duruagwụ nke abụọ) n'Ụmụakara, Isu dị na Nwangele nke Imo steeti siri gwa BBC Igbo, iwu a dị ezigbo ire n'obodo ha, bụkwa nke nwere ntaramahụhụ dị iche iche so ya.
Mana n'obodo Akọkwa dịkwa n'Imo steeti, atụmatụ a adịghị ire ọbụla, ebe ezinaụlọ mụrụ nwaanyị na-abịa eburu ozu nwa ha ma gaa lie n'ụlọ ha.
Usoro esi alụ nwaanyị n'ozu:
- Onye ahụ ga-abịa gwa ndị mụ nwa na nwa ha nwere ahụ ọkụ (ọ gaghị ebu ụzọ agwa ha na ọ nwụọla).
- Ha ga-eso ya gaa 'leta' nwa ha, mgbe ha hụrụ ozu ya, ha ga-ebo nke nwoke ebubo na ọ bụ ya gburu nwa ha, nke ga-eme ka ọ gọwa ụkwụ na aka ya
- Iji gosi na ọ bụghị ya gburu ya ọ ga-ekwenye ịlụ ozu nwaanyị ahụ
- Ọ ga-abịa lụọ ya
- Ọ ga-abịaghachị gwazie ndị mụ nwa na nwunye ya anwụọla
- Nwoke ahụ ga-agazi n'ihu mee mmemme akwamozu ya.
Ihe ga-eme onye jụrụ ịlụ nwaanyị n'ozu:
Dịka Nze Ụkaejuọha siri kọwaa, ihe ndị a bụ ihe ga-eme onye jụrụ ịlụ nwaanyị omeghị ihe isi ya n'ozu:
- Onye ahụ ga-enweta ntaramahụhụ n'ụzọ dị iche iche
- Ihe ọjọọ dịkwa iche iche na-ezute onye ahụ
- Ihe anaghị agara onye dị otu a nke ọma
- Onye ahụ nwekwara ike ịnwụ ọnwụ ihere
Mana onye ahụ nwere ike ichegharị, tụmadụ ma ọ bụrụ na ihe ndakwasị niile a bido ịdakwasị ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe onye ahụ ga-eme ma o chegharịa
Ọ bụrụ na nwoke ahụ kpọchiri ntị ma mechaa chegharịa n'ihi ihe mkpọbi ụkwụ ọ na-enweta, ihe ndị a ka ọ ga-eme:
- Onye ahụ ga-ezite ndị okenye obodo ha ka ha bịa mee ka ala daa jụụ
- A ga-enye ya ntaramahụhụ site n'ịhụ na o mezuru ihe ndị o kwesịrị ime n'ụzọ okpuku abụọ.









