Igbo Culture: Ihe omimi dị n'ichi ọzọ n'ala Igbo

Echichi bụ ihe ejiri mara ndị Igbo na mba ndị ọzọ nọ na Naijirịa.
Okammụta Chigozie Nnabuihe, bụ onye nkuzi gbasara asụsụ Igbo na Mahadum nke dị na Legọs steeti gwara BBC Igbo ihe onye igbo ọbụla kwesiri ịma maka ichi echichi n'ala Igbo.
Nnabuihe mere ka anyị ghọta na ọbụghị ebe niile n'ala Igbo na-echi echichi ọzọ.
Lee etu Ọkammụta Chigozie Nnabuihe siri saa ajụjụ anyị jụrụ ya maka ichi echichi n'ala Igbo oge gboo.
Chigozie Nnabuihe kọwara na ọtụtụ ihe agbanweela etu e si echi echichi oge gboo na etu ihe dị ugbu a,
Kedụ ihe a na-ele anya tupu echie mmadụ Ọzọ?
Chigozie Nnabuihe kwuru na e nwere ụfọdụ ihe a na-ele anya tupu echie mmadụ echichi n'ala Igbo nke gụnyere :
- Akparama agwa ya
- Okwu ọnụ ya
- Ihe ọ na-arụ
- Etu o si enye aka n'obodo
- Ọ ga-abụrịrị nwaafọ, ọgaghị abụ mbiarambia maọbụ onye ohu
Kedụ usoro eji echi ọzọ?
"Onye chọrọ ichi ọzọ ga agakwuru ndị chirila ọzọ were gwa ha na ya chọrọ ichi ọzọ", dịka Nnabuihe siri kọwaa.
Nnabuihe kọwara na ugbua, ndị ọzọ ga-enye ya oge ka ha were lezie anya mara ma ọ na-ekwu eziokwu ma nwee kwa ezigbo agwa.
Ọ bụrụ na ihe ha hụrụ juru ha afọ, ha agwazie ya ihe ọ ga-eme were chie ọzọ.
Gịnị bụ ịsa ire?
Chigozie Nnabuihe kwuru sị, " mgbe mmadụ mechara ihe ndị ọzọ gwara ya mee ka ọ bụrụ ọzọ, nke ikpeazụ bụ Isa ire".
Nnabuihe mere ka anyị ghọta na ịsa ire bụ emume nke bụ emechaa ya, onye ọzọ agaghị eji ọnụ ya sia asị na ndụ ya niile.
E nwere njirimara ndị ọzọ?
Nnabuihe kwuru sị na enwere njirimara atọ kachasị eji mara ndị ọzọ, nke bụ :

- Onye ọzọ na-eyi okpu mmemme
- Ọ na-agba eriri ọzọ n'ụkwụ ya
- Ọ na-ejikwa akupe
- Onye ọzọ na-eji kwa ọfọ
Kedụ ihe onye chiri ọzọ na-asọ nsọ?
Nnabuihe gụpụtara ihe ọnye chịrị ọzọ agaghị eme, ha gụnyere
Onye chiri ọzọ agaghị asị asị, nara ngarị maọbụ kpee ikpe ụgha
Onye chiri ọzọ agaghị aga njem hie na mba ọzọ
Onye ọzọ na nwunye ya maọbụ nwaanyị ọzọ anaghị akpa nkata n'ehihe
Onye chiri ọzọ ekwesịghị ịnwụ na mba ọzọ, onye ọzọ nwụrụ na mba nwụrụ ọnwụ ọjọọ.
Onye nze anaghị ebu ihe n'isi.
Kọwara anyị etu e si eli onye ọzọ?
"Anaghị asị na onye ọzọ anwụọla kama a na-ekwu na eriri onye ọzọ adọbiela", dịka Nnabuihe siri kọwaa.
O kwukwara na anaghị eli onye ọzọ n'akpati ogolog dịka esi eli onye nkịtị.
Nnabuihe kwukwara na onye ọzọ agaghị agba eriri ọzọ ya n'ụkwụ e were lie ya.
O kwuru sị, " Omenala emere mgbe a na-etinye ya eriri a n'ụkwụ, ka a ga-emekwa ma achọrọ ịwepụ ya".
O kwukwara na onye ọzọ ga-anọ n'oche ọzo ya e lie ya.
Ụmụnwaanyị a na-echi echichi n'ala Igbo?

Ọkammụta Nnabuihe kwuru sị eee, na e nwere ụfọdụ ebe na-echi ụmụnwaanyị echichi n'ala Igbo
Ọ mara atụ sị obodo dịka Umuhu Okabia nke dị n'okpuruọchịchị Ọsụ nke Imo steeti na-echi ụmụnwaanyị ha Lọlọ.

Ebe foto si, BBC Sport
O kwuru sị, " ha na-akpọ onye ha Ndụm Lọlọ n'obodo Unuhu Okabia ebe ụfọdụ ebe n'Anambra steti na-echi ụmụnwaanyị ha Ịyọm".
Kama ọ kowakwara na mpaghara ala Igbo dị iche iche nwekwara nke ha na-echi.
Ufọdụ ndị chiri echichi n'ala Igbo na ihe mere ha jiri chie ya
Lee ndị Igbo chiri echichi n'obodo dị iche iche na ihe kpatara ha jiri chie echichi:
'Ifekaego nke Nnewi'

Ebe foto si, Kingsley Moghalú/Twitter
Ọkaibe ma bụrụ kwa onye zọburu ọkwa onyeisiala mba Naijirịa bụ Kingsley Moghalụ bụ kwa nwaafọ Igbo ọzọ ama ama chiri echichi.
Aha a na-etu ya bụ 'Ife Ka Ego' nke Nnewi.
Ya bụ aha pụtara onye maọbụ ihe karịrị ego.
Ihe mere e jiri chie ya echichi

Ebe foto si, Kingsley Moghalu/Twitter
O kwuru na ọ bụ ugwu pụrụ iche ka Igwe nnwei bụ Igwe K.O.N Orizu nke atọ kwanyere ya.
O kwukwara na ya bụ echichi dịịrị ya oke mkpa n'ihi na o gosiri na ịkwụba aka ọtụ na ime ihe ziri ezi dị mkpa maka ọdịmma obodo.
O kwuru sị, " Echichi a ga-agba m ume iji gbasie mbọ ike n'ịrụ ezigbo ọrụ m na-arụ".
'Chinyeluife nke Nimo'

Ebe foto si, Toby Obiefuna
Okaibe bụ Tobe Obiefuna bụ odogwu n'ụdị nke ya.
Aha ntu ya bụ 'Chinyeluife'.
O kwuru sị, " Aha a na-etu m bụ Chinyelụife n'ihi na Chukwu nyere m akọnuche, onwe m zuru m ma Chineke zara m ekpere m niile".
Ihe mere e jiri chie ya echichi

Ebe foto si, Toby Obiefuna
Obiefuba zara sị, " Nke a bụ omenala anyị, ọ na-enye kwa anyị ohere inyere obodo anyị aka ma hụ kwa na echekwara obodo nke ọma".
'Kpakpando mbụ nke ọhụhụ'

Ebe foto si, Iheanyi Igboanulam
Igbo kwuru na ahụ dimkpa ahụ ogologo imi ya, Iheanyi Igboanụlam bụ dimkpa n'ezie.
A na-etu yakpakpando nke mbụ nke obodo Ọhụhụ.

Ebe foto si, Iheanyi Igboanulam
Ọ bụ Gwurugwuru Eze Innocent Adiele Nwaigwe, Ike Oha abụọ nke Okaiuga-Alike chiri Igboanulam echichi a.
Igboanulam bụkwa onye ndụmọdụ nke pụrụiche nke Gọvanọ Abia steeti maka ihe gbasara ịkpata ego na Abia steeti.
Ihe mere e jiri chie ya echichi

Ebe foto si, Iheanyi Igboanulam
Igboanulam kwuru sị, " Oge a bụ oge a na-arụ ọrụ impebi obodo anyị, echiri m echichi nke ga-agba m ume dịka onye na-arụ ọrụ imepe obodo ọhụhụ".
Ọ kọwakwara sị," Ihe ọzọ echichie pụtara bụ a ga-eji ịkwụba aka ọtọ were mara m oge niile na n'ihe niile m na eme".














