"Gwam ihe nwoke na-eme nwaanyị anaghị eme karịa rị"
Ị nụla na Ụmụnwaanyị esonyela n’obi ọchịchị nke Eze obodo a kpọrọ “Igwe Cabinet”
Ihe ịrịbama mere n’Enugwu steeti ebe ọtụtụ ụmụnwaanyị sozi n'otu na-ekwu ihe na-eme n’obodo iji nọchite ọkachasị anya ụmụnwaanyị na ụmụaka.
Mbọ itinye ụmụnwaanyị ahụ na ya bụ ihe malitere n’afọ ise gara aga site na njikọta aka ọtụ Gọọmentị Canada.
Ihe ọ pụtara ugbua bụ na ụmụnwaanyị ndị ahụ sozi n'ọchịchị obodo ga na-etinye anya na mmegbu dị iche iche a na-emegbu ụmụnwaanyị n’obodo.
Ụfọdụ ndị BBC gwara okwu kọwara na ọ bụghị naanị Igwe obodo ha nabatara ha kama na ndị nwoke so n'ọchịchị nyekwara ha nnabata.

Ihe mere e ji nabata ụmụnwaanyị ndị a n'obiọchịchị

Ufọdụ omenala ndị Igbo nwegasiri na-emegide ọnọdụ ụmụnwaanyị n’obodo dịka, nwaanyị di ya nwụrụ, nwaanyị amụtaghị nwoke, nwaanyị eketaghị oke na be nna ya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
N’ihi nke a, ndị Igwe obodo niile di n’Okpuruọchịchị Aninri, Igboeze-north na Udị kwekọrịtara wee họpụta ụmụnwaanyị nwere ugwu n’obodo ma tinye ha n’obiọchịchị.
Otu jikọrọ aka ọnụ wee gbaa ya bụ mbọ gunyere “WNL Womens voice and Leadership, Action Aid na Gọọmentị mba Canada.
Ọtụtụ ụmụnwaanyị ahụ yi uwe njirimaara ndị ichie na ndị nze wee gbaa egwu ọṅụ mgbe a nabatara ha n'obiọchịchị.
Ha amalitela ọrụ ugbua n’obodo ha dị iche iche.










