Ihe mere ndị Igbo ji akwanyere ụbọchị Eke, Orie, Afọ na Nkwọ ugwu

- Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
N'ahụmihe ndị Igbo, ụbọchị ahịa dị icheiche nwere nkwanye ugwu dị icheiche maka na ndị Igbo kwenyere na ha bụ arụsị.
Otu izuụka n'ala Igbo nwere ụbọchị anọ gụnyere; Eke, Orie, Afọ na Nkwo.
Igbo weere ha dịka ụbọchị ahịa Chi Ukwu nyere ma nwerekwa ụbọchị ndị a dịka ụzọ arụsị anọ ndị Igbo na-efe. Nke a dị iche n'obodo dị icheiche.
Ndị Igbo kwenyere na Eke kere ụbọchị ma bụrụkwa isi ahịa n'ala Igbo. Igbo hụrụ Eke dịka ụbọchị ukwuu. Ụfọdụ na-akwanyere ya ugwu a na-akwanyere ụbọchị ụka ndị ọcha.
Ahịa na-eso Eke bụ Orie. A zụchaa Orie e nweta Afọ, tupu a zụọ Nkwọ.

Ihe dị iche n'izu ndị Igbo na nke ndị ọcha
Site na mgbe ochie ruo ugbu a, ndị Igbo nwere izu gbara mkpụrụ abalị anọ.
N'aka nke ọzọ, ahịa a na-azụ n'ala Igbo bụkwa izu.
Otu ihe e ji asị na Igbo amaka bụ na e wezụga izu ndị ọcha wetaara, ọ bụ naanị ndị Igbo nwere izu n'Afrịka niile.
Oyibo nwere izu gbara abalị asaa mana ndị Igbo nwere izu gbara abalị anọ.
Dịka Ọkankụzi Alex Anedo siri kọwaara onye ntaakụkọ BBC, ahịa ndị na-azụ na-egosikwa ụbọchị ndị nwe obodo batara n'obodo ahụ.
Ọ kwuru na ụbọchị ndị batara ala ebe ha bi, bụkwa ụbọchị ahịa ha.
Ọkankụzi Anedo kwuru na ahịa ọbụla dị n'ala Igbo nwere ukwu arụsị dị na ya.
Ọ sị na-arụsị ahụ na-enwe onye na-enye ya nri.
Dịka o siri kwuo ndị obodo ahụ na-aga n'ihu iwepụtara arusị nwe ahịa ha ọnọdụ, dobere ya ebe ịchụaja ma na-asọpụrụ ya.
Ụbọchị ahịa bụkwa ụbọchị e ji asọpụrụ mmụọ nwe ahịa obodo ahụ.
Ị bịa n'Ọnịcha dị n'Anambra steeti, ha na-azụ ahịa ụbọchị Nkwọ, nke a mere ka obodo niile nọ Ọnịcha nso na-azụ ahịa dị iche iche na-aga ahịa Ọnịcha ụbọchị Nkwọ.
Ọkankụzi Anedo kwuru na ọ bụ mmepe Ọnịcha mere o ji azụ ahịa ụbọchị niile ugbua, nke a na-akpọ 'ọzụ ụda' nke ndị oyibo kpọrọ 'daily market'.
Gịnị mere ndị Igbo ji asọpụrụ ụbọchị ahịa ha?

Ụbọchị ndị batara obodo ha bi, ndị ahụ na-eji ụbọchị ahụ eme ụbọchị ezumike.
Ọkankụzi Anedo kwuru na otu ihe mere ndị Igbo ji asọpụrụ ụbọchị ahịa ha bụ na ejighị ụbọchị ndị batara obodo ha eje ọrụ maọbụ eru uju.
Nke a mere obodo dị iche iche n'ala Igbo anaghị eje ọrụ maọbụ eru uju ụbọchị ahịa ha.
Obodo na-azụ ahịa Eke na-eji ụbọchị ahụ mere ụbọchị ezumike ma na-aga ọrụ ụbọchị ndị ọzọ nke gunyere Orie, Afọ na Nkwọ.
Mgbe ndị obodo ahụ na-ezu ike ka ha na-asọpụrụ mmụọ nwe ahịa ahụ obodo ha na-azụ.
N'ala Igbo, iwu abụghị na ndị niile pụtara ahịa ga-azụ maọbụ ree ahịa maka na e nwere ọtụtụ ụzọ dị iche iche ndị mmadụ si azụ ahịa.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-apụta ire ahịa, ụfọdụ na-apụta ịzụrụ ahịa ebe ndị enweghị ngwa ahịa maọbụ ego ịzụ ihe na-apụta n'ahịa ịma njakịrị, ịtụ okwe, inwe obiọma maọbụ ịṅụ mmanya.
Ọkankụzi Alex Anedo kwuru na ihe ndị ahụ ga-eme ụbọchị ahịa ha bụ naanị ihe aṅụrị.

Nanị ihe mmadụ nwereike ime ụbọchị ahịa bụ ihe na-eweta obiọma dịka ịlụ nwunye, ibupụta egwu ka ndị mmadụ gbakọọ kirie maọbụ emume aṅụrị ndị ọzọ.
A naghị eme ihe mwute ụbọchị ahịa ọkachasị akwamoozu iji sọpụrụ mmụọ nwe ụbọchị ahụ.
Mmadụ nwụọ ụbọchị ahịa, agaghị eme ka ọha mara, ihe a ga-eme bụ ikpuchi ya, chi fotezie ụbọchị ọzọ, ekwuputa na mmadụ nwụrụ.
Ihe ọzọ dị oke mkpa bụ na azụmahịa n'ala Igbo na-eweta mmụba akụnụba na ndụ ndị obodo.
Ndị na-azụ ahịa Afọ na-ga ọrụ ugbo ụbọchị Eke na Orie ịkọta ihe ha ga-ere n'ahịa ụbọchị Afọ, iji nweta ego ha ga-eji zụta ihe ndị ọzọ ha enweghị n'ụlọ.









