Mwakpo Kwara: Ihe anyị ma maka ihe na-akpọtụ n'ala Afonja

Ndị dinta

Ebe foto si, Screenshot

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa na-akpọ ghara ghara dịka akụkọ mwakpo ndị a na-enyo na ha bụ ndị oyiọhaegwu na-akpọtụ n' ala Afọnja (Kwara steeti) kemgbe otu ọnwa.

Ndị gụrụ maka akụkọ ihe mere oge gboo n'ụlọakwụkwọ Sekọdịrị ga-echeta akụkọ maka Alaeze Oyo (Oyo Empire) na etu Afọnja nke Ilọrịn bụ Onyesisiagha/Ọchịagha ndị alaeze Oyo oge gboo si kpaa dịka ike n' agha dị iche iche megide ọtụtu obodo nakwa alaeze gbara ha gburu gburu ma merie.

Mwakpo na-eme na Kwara Steeti ghọrọ isiokwu dịka mwakpo riri ibe ya elu na mpaghara dị iche iche na ngwụcha izuụka gara aga.

Ndịagha wụbara n'okeọhịa dị na Kwara steeti gbuo ọtụtụ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ojiegbe na ndị ntọrị na-akpa mkpamkpa na steeti ahụ na nsonso a.

Nke a na-abịa dịka otu ndị welitere isi n'Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa gụnyere otu Afenifere tiri mkpu maka gbuo gbuo gbuo na-akpọtụ na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ ọkachasị n'abalị atọ gara aga.

N'Ụbọchịụka, abalị 28 nke ọnwa Septemba afọ 2025, ndị bu egbe gburu mmadụ iri na abụọ e chere na ha bụ ndị nche ma merụkwaa ọtụtụ ahụ n'obodo Oke-Ode dị n'Okpuru Ọchịchị na Kwara steeti.

Otu onye nọ ebe ihe mere na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Yoruba na ndị ojiegbe ahụ na-agba egbe, ndị nche asaa ha mana ike ndị ojiegbe karịrị ike ndị nche.

Ndị oyi ọha egwu

Ebe foto si, Screenshot

Mwakpo mere Ụbọchịụka bụ otu n'ime mwakpo merela na steeti ahụ n'otu ọnwa.

N'abalị 24 nke ọnwa Septemba,2025, ndị bu egbe wakporo obodo Isanlu dịkwa na Kwara steeti, gbuo otu dinta, ebe a ka na-achọ dinta abụọ achọ.

N'abalí 23 nke ọnwa Septemba afọ 2025, ndị a na-enyo na ha bụ ndị oyiọhaegwu wakporo obodo Maganiko Ndanangi dị n'Okpuru Ọchịchị Edu dị na steeti ahụ tọrọ otu nwaanyị na otu obere agbọghọ.

N'abalị 18 nke ọnwa Septemba, 2025, mwakpoo e mere n'obodo Oke-Odo dị n'Okpuru Ọchịchị Ifelodun na steeti ahụ tara isi mmadụ iri na ise gụnyere onye uweeojii.

Ihe Gọvanọ Abdulrahman Abdulrazaq nke Kwara steeti kwuru

Gọvanọ Kwara steeti bụ Abdulrahman Abdulrazaq

Ebe foto si, Abdulrahman Abdulrazaq/X

Aka na-achị Kwara steeti bụ Govanọ Abdulrahman Abdulrazaq kpọrọ oku nkwado ndịagha ma kasie ndị ihe metụtara obi.

N'ozi nkasiobi o zipụrụ, Gọvanọ Abdulrahman Abdulrazaq rịọrọ ka ọdachi ahụ ghara ibute tigbuo zọgbuo.

Ozi ahụ nke odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Rafiu Ajakaye binyere aka, kwuru sị:

"Ana m eti ezinaụlọ ndị ọdachi a metụtara aka n'obi. O nweghị nkọwa m nwereike inye ga-akasi obi ndị e merụrụ ahụ."

Ihe ndị nwere agba n'ala Yoroba na-ekwu

Otu jikọrọ ndị Yoroba a kpọrọ Afenifere gbarụrụ ihu banyere oke ogbugbu mmadụ na-eme na Kwara.

N'ozi nke ọnụ na-ekwuru otu a bụ Jare Ajayi binyere aka ma wepụta n'abalị atọ nke ọnwa Ọktoba afọ 2025, boro ebubo na etu ndị ahụ wakporo Kwara si mee na-arụtụ aka na ha abụghị ndị ntọrị nkịtị.

"Ụdị ngwaọgụ ha ji bịa ya bụ ije gosiri na ha nwere ndị nwere agba na-akwado ha n'ala nakwa ofesi."

"A na-enyo ndị a na-asị na ha bụ ndị na-egwupụta ọnatarachi megidere iwu (illegal miners)."

Gani Adams

Ebe foto si, Gani Adams

N'aka nke ọzọ, onye Yoroba ọnụ na-eru n'okwu bụ Gani Adams kwuru na oge eruola mgbe ndị mpaghara Ọdịda Anyanwụ ga-enwe atụmatụ nchekwa zuru ala Yoroba niile ọnụ.

Adams kwuru na ọ bụ ime ka nchekwa kwụsie ike ga-egbochi ihe na-akpọtụ na Kwara nakwa mpaghara ndị ọzọ na Naịjirịa.