Abụghị m 'unknown gunman' – Onyeisi ndị Aka Odo n'Anambra steeti

Ebe foto si, Screenshot
Onyeisi otu na-ebu agha megide ndị agboro n'Anambra steeti bụ State Anti-Touting Squad Anambra (SASA) nke eji ndị "Aka Odo" mara apụtala kwuru ọnụ ya.
Maazị Ebuka wepụtara ihe onyonyoo na soshal midịa kọwaa na ọ bụ esemokwu n'etiti ya na Igwe obodo ya bụ Ọba butere nsogbu ahụ, na ọ bụghị ihe ọbụla gbasara "unknown gunmen" maọbụ ESN.
Ọ kọwara na Igwe obodo ya n'Ọba na otu nwoke bụ Pollicarp na-ere ala ndị obodo na-eri ego ya. Nke a mere nnukwu nsogbu jiri dị n'etiti Igwe na ndị obodo.
N'ihi na ya ekweghị abata na ya bụ esemokwu dịka Igwe siri rịọ ya, ọ gara were ndị uweojii Anti-Cult kpụrụ ya kpọchie na SARS Awkuzu rue izuụka abụọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ụbọchị ndị uweojii bu ya n'ụgbọala, tụọ ya ịga wee buru ya site n'ụzọ Ebenebe na Ogberu na-aga ịkpọchi ya, ka ndị "Unknown Gunmen" wakporo ha.
"N'agbanyeghi na ha tụrụ m ịga, ndị uweojii ahụ na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gbara ọsọ ma chefuo na ha tụrụ m ịga. Na m dị ndụ taa bụ amara Chukwu."
Anọ m ebe m na-anara ọgwụgwọ na-ahụzị na soshal midịa ka ndị ọrụ nchekwa na-akụtu ụlọ m.
Ebuka kelere Gọọmenti Anambra steeti maka ohere ha nyere ya ịrụ ọrụ dịka onyeisi ndị "Aka Odo".
"Abụghị m onye otu "unknown gunmen", ESN, maọbụ otu nzuzo. Enweghịkwa m ike ịbụ onye otu ọbụla Gọọmenti Naijiria machibidoro," ka Ebuka kwuru.
O kwuru na ọ bụ ndị iro ya na ndị ntajianya na-agba mbọ ibo ya ebubo niile ahụ. O bere akwa na a kwaturu ụlọ ya n'ụzọ na-ezighi ezi.
Etu Gọọmentị Naịjirịa siri kụtuo ụlọ Onyeisi "Ndị akaodo" n'Anambra steeti maka ebubo na ọ bụ onye "Unknown Gunman"

Ebe foto si, Screenshot
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọnọdụ nchekwa n'Anambra steeti nakwa ebe ndi ọzọ n'ala Igbo ugbua n'agba anyammiri.
Nke na-ahịọ n'Anambra steeti ugbua bụ ihe onyonyo na-efegharị na soshal midịa gosiri ka ndị ọrụ nchekwa ji igwe "buldozer" kụtuo ụlọ Maazị Ebuka, onye bụ Onyeisi ngalaba nchekwa na-achụ ndị "agboro" ọsọ a kpọrọ "State Anti-Touting Squad Anambra (SASA).
SASA bụ otu Gọvanọ Chukwuma Soludo hiwere iji chụpụ ndị ọrụ agboro na-enye nsogbu n'Anambra steeti, ọkachasị ebe dịka Onitsha, Nkpor, Nnewi, Ekwulobia, Awka nakwa ebe ndị ọzọ.
Ngwa ngwa gọmenti Anambra nyere ha ike na ikikere, ịrụ ọrụ, ha malitere kpọwa onwe ha ndị "otu akaodo" ma ọ bụ "ndị akaodo".
Kemgbe otu a bidoro ọrụ, enweela ọtụtụ oge ha merụrụ mmadụ ahụ nke ukwuu nke ndị mmadụ ji tigaara gọmenti mkpu n'ọbaozi soshal midịa.
A na-ebo ebubo na Maazị Ebuka na-achịkọta otu akaodo bụ otu n'ime ndị isi ndị omekome a kpọrọ "Unknown Gunmen".
N'ụbọchị abụọ gara aga bụ 26 Ọgọst 2025 ka ndị ọrụ nchekwa si Abuja wakporo ụlọ Maazị Ebuka ma kụtuo ya.
Ka ọ dị, nwoke ahụ gbara ọsọ, o nwebeghị onye hụrụ ya.
Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo kpọrọ Kọmịshọna mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Law Mefor n'ekwentị, ọ sịrị na ya hụrụ ihe onyonyoo ahụ mana ya enweghị ike kọwaa ma ebubo e boro nwaamadị ahụ ọ bụ eziokwu.
O kwere nkwa ime ka anyị mata nke bụ eziokwu oge ọbụla ọ chọpụtara.

Gịnị ka Mazi Benard Idemezue Kwuru gbasara ya bụ ihe?

Ebe foto si, Anambra News/Facebook
Onye na-anọchite anya Anyamelum n'ụlọomeiwu Anambra steeti bụ Bernard Udemezue kwuru na ọ bụ ihe ihere nye gọọmenti Soludo na onye ha ji achụ ndị na-ada iwu bụkwa onye ohi n'onwe ya.
Udemezue kọwara na ndị otu Ebuka emeela ọtụtụ arụ n'Anambra steeti, nke gụnyere iji akaodo kụjisịa ọtụtụ ụmụokoroọbịa ụkwụ ma gbuokwa ọtụtụ mmadụ site n'ịrụ ọrụ adịgboroja.
Ihe onyonyoo ahụ gosiri ka ndị ọrụ nchekwa karịrị iri abụọ na ndị bu ụgbọala buldozer na-akụtu ụlọ na mgbidi niile dị be ya bụ Onyeisi ndị "Akaodo".









