Jennifer na Kọpa ndị ọzọ otu Agunechemba mekpara ahụ akpụpụla Gọvanọ Soludo na gọọmenti Anambra Steeti n'ụlọikpe

Ọkaiwu Cyrus Onu sị ọ chọrọ ka gọọmenti kwụọ ndị kọpa ahụ otu ijeri dịka ego itinye aka na obi maka mmejọ nakwa ntaramahụhụ ụmụaka kọpa ndị ahụ gabigara n'aka ndị agunechemba.

Ebe foto si, BBC/Haven360 Foundation

Nkọwa foto, Kọpa Jennifer, akwụkwọ o ji kpụpụ Gọvanọ Soludo na gọọmenti Anambra Steeti n'ụlọikpe
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 14

Nwaagbọghọ Kọpa ndị otu nchekwa 'Agunechemba' mekpara ya na kọpa ibe ya ahụ n'Ọba dị n'okpuru ọchịchị Idemili South n'Anambra steeti na 23 Julaị, 2025 bụ Jennifer Edema Elohor, akpụpụla aka na-achị Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo, steeti ya, otu nchekwa Agunechemba nakwa ọkaikpe ukwu steeti ahụ n'ụlọikpe.

Akwụkwọ ikpe ọkaiwu na-anọchiteanya ndị kọpa ahụ bụ Cyrus Onu, mere ka o doo anya na ọ chọrọ ka gọọmenti kwụọ ndị kọpa ahụ otu ijeri naịra dịka ego iti aka n'obi maka mmejọ nakwa ntaramahụhụ ndị kọpa ahụ gabigara n'aka ndị otu Agunechemba.

Ọkaiwu Cyrus Onu gara n'ihu kwuo na ọ ga-amalite ikpe mpụ megide ndị otu Aguenechema nke a na-ebo ebubo na ha mere mwakpo ahụ.

Ụlọikpe ukwu dị n'Anambra ga-amalite ịnụ ikpe ahụ n'ụbọchị Wenezde Nọvemba 12, 2025.

Akwụkwọ kọpa Jennifer na ndị otu ya ji kpụpụ aka na-achi steeti Anambra bụ Chukwuma Soludo na ndị ọzọ ụlọikpe

Ebe foto si, BBC/Haven360 Foundation

"Anyị ga-echekwa Jennifer na kọpa ndị ọzọ ruo oge ha ga-efecha ala nna" - NYSC
Enye fere m ha n'aka ndị agha batalion 302 dị n'Ọnịcha maka nchekwa ha kemgbe

Ebe foto si, screenshot

Ojisua Pauline bụ onye nchịkọba ndị ji otu afọ efe ala nna ya bụ NYSC n'Anambra steeti ekwuola na a ga-echekwa Jennifer Edema na ndị kọpa ọzọ ndị otu nchekwa 'Agunechemba' mekpara ahụ n'Anambra Steeti.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere mgbe ọ na-azaghachi okwu Jennifer Edema kwuru site n'ọnụ ọkaiwu ha bụ Cyrus Onu na ndụ ha nọ n'ihe iyi egwu.

Ọkaiwu ahụ kwuru na NYSC gbahapụrụ Jennifer na ndị kọpa ndị ọzọ kamgbe ndị nchekwa agunechemba kụchara ihe ma kọwaa na ndị mmadụ na-eyizi ha egwu n'ebe ha bi.

Na nzaghachi, onye nchịkọta NYSC n'Anambra steeti kwuru na kamgbe ihe a mere na ya agwala ndị ọrụ nchekwa steeti (DSS) ka ha na-eleba ha anya n'ime obodo.

O kwuru na "E mechara m tinye aka n'akwụkwọ ka Jennifer na kọpa ndị ọzọ ihe a metụtara gaa n'ogige ndịagha batalion 302 dị n'Ọnịcha ma nyefee ha n'aka ndịagha maka nchekwa ha"

N'ịza ajụjụ mere ihe NYSC ebugaghị ha na steeti ha dị iche iche, ọ kọwara n'iwu NYSC, akwadoghị ka a kpọrọ ndị nwere onwa ole ma ole ka ha fechaa ala nna pụọ na steeti ebe ha na-efe ala nna, nke mere o ji agba mbọ ịhụ na ha nwetara nchekwa zuru oke.

"Amalitela ihazi akwụkwọ asambodo ịpụ NYSC ha dịka ndị fere ala nna ha n'Anambra steeti, ugbua, enweghi ike imegharị ya maka ọ fọrọ ọnwa ole ma ole ka ha mechaa.

Ihe ọzọ kpatara NYSC agaghị akpọpụ ha gaa na steeti ha bụ maka n'okwu ha nọ n'ụlọikpe. Ya bụrụ na ha gaa na steeti ha, kedụ ka ha ga-esi nwee ike ị na-apụta n'ụlọikpe ụbọchị ọbụla ha ga-aga.

"Agwara m ọchịagha ndịagha batalion 302 dị n'Ọnịcha na mgbe ọbụla ikpe ha malitere n'ụlọikpe, ọ ga-enye ha ndịagha ga-akpọrọ ha gaa ụlọikpe"

Ndị uweojii anwuchibeghi onye Agunechemba tiri m ihe – Kọpa Edema

Ken Emeakayi bụ onye ndụmọdụ pụrụiche Gọvanọ maka nchekwa obodo n'Anambra steeti na ndị otu Agunechemba asatọ a chụrụ n'ọrụ maka ebubo na ha metọrọ onye kọpa ha na Jennifer Edema

Ebe foto si, screenshot

Nkọwa foto, Ken Emeakayi bụ onye ndụmọdụ pụrụiche Gọvanọ maka nchekwa obodo n'Anambra steeti na ndị otu Agunechemba asatọ a chụrụ n'ọrụ maka ebubo na ha metọrọ onye kọpa ha na Jennifer Edema
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nwaagbọghọ Kọpa ndị otu nchekwa 'Agunechemba' mekpara ya na kọpa ibe ya ahụ n'Ọba dị n'okpuru ọchịchị Idemili South n'Anambra steeti ekwuola na ndụ ya nọ n'ihe egwu maka ndị mmadụ na-eyi ya egwu kemgbe okwu ya pụtara ihe.

Jennifer Edema onye kwuru okwu site n'aka onye Ọkaiwu ha, Cyrus Onu gwara BBC Igbo na nwaagbọghọ ahụ na ndị ọzọ ka nọkwa n'ụlọ obibi ndị kọpa n'Anambra steeti n'agbanyeghị akwụkwọ ha degaara NYSC ka a kpọpụ ha n'Anambra ma zigaa ha steeti ha.

Ọkaiwu Onu kwuru na ụlọọrụ NYSC zaghachiri ọzi ha ma kwuo na ha agaghị akpọpụ Jennifer Edema na ndị kọpa ọzọ ọnọdụ ahụ metụtara maka na ọ fọdụrụ ọnwa abụọ ka ha fechaa ala nna ha, tinyekwara na iwu NYSC akwadoghị ka a kpọpụ ha maka ọnwa ole fọdụrụ.

Mana Jennifer Edema kọwara na "ndị mmadụ na-abịa n'ụlọ anyị n'etiti abalị na-eyi anyị egwu, na-asi na ọ bụ n'ihi anyị mere e ji chọọ iwepụ ma kwụsị ndị ọrụ nchekwa 'Agunechemba'."

Ọkaiwu Onu boro ebubo na ụlọọrụ NYSC ka na-ewe iwe ihe mere ndị kọpa ahụ jiri mee ka ndị ọha mara ihe mere ha.

Mgbe anyị kpọtụụrụ Onyeisi ụlọọrụ NYSC n'Anambra steeti ka ọ zara ọnụ ya maka ebubo a, ọ gwara anyị na ya "enweghị ohere".

Onu gwara BBC Igbo na ndụ ya nọkwa n'ihe egwu dịka ndị kọpa ọ na-anọchiteanya ha.

Ọ sị ruo ugbua, gọọmenti etibeghị ndị kọpa ahụ aka n'obi, maọbụ kpụpụ ndị ọrụ Agunechemba ndị uweojii nwuchiri n'ụlọikpe.

Onu gara n'ihu kọwaa, na e nwere ndị so mekpaa ndị kọpa ahụ na-esoghị na ndị a nwuchiri, ọkachasị onyendu ndị Agunechemba kpara mkpamkpa ahụ.

Ndị Agunechemba wakporo anyị ma tie anyị ihe n'Anambra steeti - Ndị na-efe ala nna ha

Ndị Agunechemba tiri na-efe ala nna ha na NYSC ihe n'Anambra steeti
Nkọwa foto, Ndị Agunechemba tiri na-efe ala nna ha na NYSC ihe n'Anambra steeti
Aha onyonyo, Ihe onyoonyo ndị Agunechemba tiri ihe dịka ha na-ekwu okwu

Ụmụagbọghọ kọpa abụọ ndị otu nchekwa 'Agunechemba' mekpara ahụ n'Oba dị n'okpuru ọchịchị Idemili South n'Anambra steeti akọwala etu ha na ije si gaa n'ụbọchị 23 Julaị 2025.

Oge ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Edema Elohor Jennifer, bụ otu n'ime ndị kọpa a hụrụ n'oyonyoo oge ndị nchekwa Agunechemba na-eti ya ihe ma gbaa ya ọtọ kwuru na ha nọ n'ụlọ obibi ndị kọpa n'ụtụtụ ahụ tupu ha bụ ndị nchekwa abịa ma were ụkwụ gbawaa ụzọ.

Edema kọwara na ha bụ ndị nchekwa fuchiri ihu ma buru egbe oge ha wụchiri n'ụlọ ha n'ụbọchị ahụ.

O kwuru na ndị nchekwa ahụ tiri ha ihe ma gbaa ya ọtọ, ọ bụnadị ka ọ kọwaara ha na ya bụ onye kọpa ma gosi ha akwụkwọ njirimara ya.

Edema gara n'ihu kwuo na ya gara kọsara onye nlekọta ya n'okpuru ọchịchị Idemili South, bụ onye gwara ha ka ha chefuo ihe mere.

Ọ sịrị na mbọ niile ọ gbara iji hụ na ndị uweojii Anambra steeti nakwa ụlọọrụ NYSC nyeere ya aka nweta ikpe ziri ezi furu ọhịa.

Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga maka ihe Jennifer kwuru, ọ sịrị na "ha achọpụtala ndị a na-enyo enyo, mana onye ihe metụtara anoghị ya, ya mere o ji metụ nnyocha."

Onye ọzọ na-efe ala nna ya ihe a metụtara bụ Amore Mordecai Feyisara, onye si Ogun steeti boro ebubo na mgbe ihe ahụ mere, ndị NYSC gbara mbọ imechi ma kpuchie ihe mere.

Feyisara kọwara na ka ọ gara otu mkpụrụ ụbọchị ihe ahụ mechara, a kpọrọ ha oku nzukọ n'isi ụlọọrụ NYSC na mpaghara Idemili South.

"Mgbe anyị rutere, ha kpọrọ anyị otu otu na-agba anyị ajụjụ ọnụ. Dịka nke a mechara, ha nyere anyị puku naịra iri ka anyi jiri gbaa ụgbọala ma sị ka anyị mechie ọnụ ghara ịgwa ndị mmadụ ihe mere"

"Anayo Muoghalu, onye na-elekọta ndị kọpa mechara nara m ekwentị m ma hichapụ oyonyo ahụ ma sị na ọ chọghị ka okwu ahụ gbasaa," ka o kwuru.

Mana BBC Igbo enweghị ike ikwupụta ma ọ bụ n'ezie na NYSC nyere ha ego maọbụ na onye nlekọta ha bụ Anayo Muoghalu ehichapụrụ ihe onyonyo a.

Oge BBC Igbo kpọrọ Muoghalu na'ekwentị, ọ gwara anyị kpọtụrụ onyeisi ụlọọrụ NYSC n'Anambra steeti.

BBC Igbo kpọkwara onyeisi ụlọọrụ NYSC n'Anambra steeti, ọ gwara anyị na ha na-enyocha ihe niile ka ọdi ugbu a

Haven360 Foundation, ndị nnochiteanaya iwu ndi kọpa akụrụ ihe na Jennnifer na nna ya

Ebe foto si, Haven360 Foundation

Nkọwa foto, Haven360 Foundation, ndị ọkaiwu ndị na-efe ala nna ya e tiri ihe, nwa ada Jennnifer na nna ya

Gini ka Gọoment Anambra, ndị uweojii, ndị NYSC nakwa ndị Agunechemba kwuru maka okwu a?

Ndị kọpa e tiri ihe
Nkọwa foto, Ndị na-efe ala nna ha (NYSC) e tiri ihe

Agunechemba - Onye ndụmọdụ pụrụiche Gọvanọ maka nchekwa obodo n'Anambra steeti bụ Ken Emeakayi kwupụtara n'ụbọchị Wenezde 21 Ọgọst, 2025 na-achụọla ndị otu Agunechemba asatọ kpara agwa ọjọọ a.

Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-enyefe ndị ahụ a na-enyo enyo n'aka ndị uweojii maka ikpe ha ikpe.

Gọoment Anambra - N'ozi Kọmịshọna mgbasaozi Anambra steeti bụ Law Mefor wepụtara n'ụbọchị Tuzde 19 Ọgọst 2025, o kwuru na obi adịghị Gọọmenti Anambra steeti mma gbasara ihe mere nụ.

Ọ kọwara na gọọmenti hiwere otu nchekwa Agunechemba na Udo Ga-Achị iji hụ na onye niile gbasoro iwu na ime ihe n'usoro, na-abụghị iweta ọnọdụ tigbuo zọgbuo na mmekpaahụ.

NYSC - Ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ntoroọbịa ji otu afọ efe ala nna ha na Naịjirịa bụ National Youth Service Corps (NYSC) katọrọ omume ọjọọ ndị nchekwa mesoro ndị kọpa ha n'agbanyeghị na ndị agunechemba sị na ọ bụ nnyocha ka ha gara n'ụlọ obibi ndị kọpa ahụ ịme. Ka ọdị ugbua, ha na-enyocha ihe niile mere nụ.

Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-enye nwaagbọghọ ahụ nkwado iji nyere ya aka maka nsogbu anụahụ na nke echiche ọ gabigara n'oge nsogbu ahụ, ma kwuo na ha ka ji ọdịmma na nchekwa ndị na-efe ala nna ha kpọrọ ihe dị mkpa.

Ndị uweojii - Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Anambra steeti kọwara na "ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ogbe tiri nwaanyị ahụ ihe ma majaa ya".

Ọ sị na "a marala ndị ọrụ nchekwa ahụ tiri nwaanyị kọpa ihe mana nsogbu dị ugbua bụ na onye e tiri ihe apụtaghị, nke na-adọghachị nnyocha a na-eme azụ".

BBC Igbo chọpụtara n'ụbọchị Tọzde 21 ọgọst, 2025 na kọpa ahụ e tiri ihe bụ Edema Elohor Jennifer gara n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Awka iji nye mkpesa ya.

Gọọmenti Anambra steeti achụọla ndị otu Agunechemba asatọ maka ebubo imetọ kọpa

Gọọmenti Anambra steeti achụọla ndị otu Agunechemba asatọ maka ebubo imeto kọpa

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Ken Emeakayi bụ onye ndụmọdụ pụrụiche Gọvanọ maka nchekwa obodo n'Anambra steeti na ndị otu Agunechemba asatọ a chụrụ n'ọrụ maka ebubo na ha metọrọ onye kọpa

Gọọmenti Anambra steeti achụọla ndị otu Agunechemba asatọ maka ebubo imetọ nwaagbọghọ kọpa n'Oba dị n'okpuru ọchịchị Idemili South na steeti ahụ.

Onye ndụmọdụ pụrụiche Gọvanọ maka nchekwa obodo n'Anambra steeti bụ Ken Emeakayi kwupụtara nke a n'isi ụlọọrụ Agunechemba dị n'Awka n'ụbọchị Wenezde 21 Ọgọst, 2025.

Emeakayi kwuru na gọọmenti mere nke a oge ha nwetechara mkpesa maka ebubo ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-enyefe ndị ahụ a na-enyo enyo n'aka ndị uweojii maka ikpe ha ikpe.

Ọ kọwara na ha bụ ndị otu Agunechemba a chụrụ n'ọrụ gara ịchọ ndị otu nzuzo n'ụbọchị Tuzde tupu ha awakpoo onye kọpa, ma kọwaa omume ahụ dịka nke na-abụghị njirimara otu nchekwa Agunechemba.

Emeakayi kwuru na ihe ahụ mere ga-abụ nke ga-eweta mgbanwe n'otu nchekwa Agunechemba, ma bụrụkwa nke ga-eweghachi ntụkwasịobi ọhanaeze n'usoro ọrụ ha.

N'ụbọchị Tuzde ka ihe onyonyoo gosiri ebe ndị ọrụ nchekwa Agunechemba na-amaja ma na-eti otu nwaanyị kọpa ihe fegharịrị n'ịntaneetị, nke mere ka ọtụtụ mmadụ gụnyere ụfọdụ ndị a ma ama n'obodo katọọ omume ahụ.

BBC News Igbo abanyela n'ọbaozi Whatsapp chanelụ
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp chanelụ anyị

Ihe NYSC mere iji mechie ndị na-efe ala nna ha e tiri ihe n'Anambra ọnụ - Ọkaiwu

Ihe NYSC mere iji mechie ndị kọpa e tiri ihe n'Anambra ọnụ - Ọkaiwu

Ebe foto si, Cyrus Onu, NYSC, Screenshot

Onye Ọkaiwu na-ekwuchitere nwaagbọghọ na-efe ala nna ya ndị nchekwa Udo Ga-Achị tiri ihe n'Anambra steeti bụ Cyrus Onu ekwuola na ihe a abụghị nke mbụ a na-emeso ndị kọpa ụdị omume dị etu ahụ.

Onu kwuru nke a oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo na-agba ya ajụjụ n'ekwentị.

Ọ sịrị na nwaagbọghọ ahụ agaala kọsara ndị isi ya ihe ọ gabigara n'aka ndị nchekwa Udo Ga-Achị.

O boro ebubo na ụfọdụ ndị isi NYSC na ndị isi Udo Ga-Achị jikọtara aka nye ndị kọpa e mesoro omume ike puku naịra iri (N10,000) n'otu n'otu ka ha nweeike mechie ọnụ.

"Ihe a abụghị nke mbụ NYSC na-eme ihe dị etu a. Ha na-enwe oke mmasị ichekwa aha ha karịa ndị e nyefere ha n'aka ka ha lekọta".

"Ha na-achọ imechi ndị kọpa ahụ ọnụ site n'iyi ha egwu dị iche iche. Ọ bụnadị oge anyị batara n'okwu ahụ, ọ rara ha bụ ndị kọpa ahụ ịgwa anyị ihe e mere ha," ka Onu kwuru.

Ka o sinadị, o kwuru na ha agakwurula ndị ahụ e boro ebubo iji chọpụta ụzọ a ga-esi weta ikpe nkwụmọtọ.

NYSC akatọọla omume ọjọọ e mesoro onye kọpa n'Anambra steeti

NYSC akatọọla omume ọjọọ e mesoro onye kọpa n’Anambra steeti

Ebe foto si, Peter Obi/X, Screenshot

Nkọwa foto, Njirimara ụlọọrụ NYSC na onyonyoo ndị Udo Ga-Achị na-emekpa nwaagbọghọ na-efe ala nna ya ahụ

Ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ntoroọbịa ji otu afọ efe ala nna ha na Naịjirịa bụ National Youth Service Corps (NYSC) akatọọla omume ọjọọ ndị nchekwa mesoro otu nwaagbọghọ na-efe ala nna ya n'Oba dị n'okpuru ọchịchị Idemili South n'Anambra steeti.

Nke a dị n'ozi NYSC bipụtara n'akara ọbaozi X ha n'ụbọchị Wenezde 20 Ọgọst, 2025.

Ha katọrọ ụzọ na-ezighị ezi ndị nchekwa ahụ jiri rụọ ọrụ ha, n'agbanyeghị na ha sị na ọ bụ nnyocha ka ha gara n'ụlọ obibi nwaagbọghọ kọpa ahụ na ndị otu ya.

Ha kelere ọhanaeze maka igosi mmetụta nyere ọnọdụ ọjọọ ahụ ma tookwa Gọọmenti Anambra steeti maka njem ndị ha zọpụrụla, dịka ha jiri obi ha nabata nnyocha ndị uweojii na-eme ugbua gbasara okwu ahụ iji chọpụta ihe mere kpọmkwem.

"Anyị nwere ntụkwasịobi na nke a ga-ewetere nwaagbọghọ kọpa ahụ na ndị ọzọ ọnọdụ ahụ metụtara ikpe nkwụmọtọ," ka ozi ahụ kwuru.

NYSC gara n'ihu kwuo na ha ga-enye nwaagbọghọ ahụ nkwado iji nyere ya aka maka nsogbu anụahụ na nke echiche ọ gabigara n'oge nsogbu ahụ, ma kwuo na ha ka ji ọdịmma na nchekwa ndị na-efe ala nna ha kpọrọ ihe dị mkpa.

Peter Obi akọwaala omume ndị Udo Ga-Achị dịka ihe na-asọ oyi

Peter Obi akọwaala omume ndị Udo Ga-Achị dịka ihe na-asọ oyi

Ebe foto si, Peter Obi/X, Screenshot

Nkọwa foto, Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra na onyonyoo ndị Udo Ga-Achị na-emekpa nwaagbọghọ na-efe ala nna ya ahụ

Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti akatọọla omume ndị nchekwa Udo Ga-Achị, maka nwaagbọghọ na-efe ala nna ya ha tiri ihe ma gbaa ọtọ na steeti ahụ.

Nke a dị n'ozi onye ahụ zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjịrịa n'afọ 2023 bipụtara n'akara ọbaozi X ya n'ụbọchị Tuzde 19 Ọgọst, 2025.

Obi kwuru na ya bụ ọnọdụ bụ nke na-eme ya ihere dịka onye Anambra, dịka ọ na-agbawa ya obi na ụdị omume ahụ bụ nke a pụrụ ime n'oge a ụwa sara anya.

"O nweghị obodo ọbụla kwesịrị ịnabata mmetọ, mmaja na mmekpaahụ n'ebe ụmụafọ ya nọ, ọkachasị ụmụnwaanyị".

"Ihe ahụ mere abụghị naanị mmebi iwu, kama ọ bụ mmetọ ugwu mmadụ niile. Nwaagbọghọ ahụ nwereike ịbụ nwa onye ọbụla, nwanne ha nwaanyị maọbụ nwa nke m," ka Obi kwuru

Ọ kpọrọ oku ka ndị nchekwa na ndị niile ọnụ na-eru n'okwu hụ na ọ bụghị naanị na a nwuchiri ma kpee ndị aka ha dị n'arụ ahụ ikpe, kama ka e jiri ha gosi ihe ịmaatụ iji gbochie ụdị omume ahụ n'ọdịnihu.

Gọọmenti Anambra steeti ekwuola okwu gbasara nwaagbọghọ kọpa ndị Udo Ga-Achị tiri ihe

Gọọmenti Anambra steeti ekwuola okwu gbasara nwaagbọghọ kọpa ndị Udo Ga-Achị tiri ihe

Ebe foto si, Screenshot

Gọọmenti Anambra steeti akatọọla mwakpo e mere nwaanyị kọpa na steeti ahụ ma kwe nkwa iweta ikpe nkwụmọtọ.

Nke a dị n'ozi Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Law Mefor wepụtara n'ụbọchị Tuzde 19 Ọgọst 2025.

Mefor sịrị na obi adịghị Gọọmenti Anambra steeti mma gbasara ihe onyonyoo fesara ebe niile ugbua, bụ nke gosiri ebe ndị nchekwa Udo Ga-Achị na-emekpa nwaagbọghọ kọpa ahụ n'Oba dị n'okpuru ọchịchị Idemili South.

Ọ kọwara na gọọmenti hiwere otu nchekwa Agunechemba na Udo Ga-Achị iji hụ na onye niile gbasoro iwu na ime ihe n'usoro, na-abụghị iweta ọnọdụ tigbuo zọgbuo na mmekpaahụ.

Ozi ahụ kwuru na ụdị mmetọ ọbụla ndị ọrụ nchekwa mere bụ nke na-esoghị n'ọrụ gọọmenti dunyere ha, dịkwa ka ndị niile aka ha dị na ya ga-eche aka ghọrọ mgbọ.

"Gọọmenti chọrọ ime ka ọhanaeze, ọkachasị ndị na-efe ala nna ha n'Anambra steeti mata na ụjọ ekwesịghị ịtụ ha n'ihi ndị ọrụ nchekwa steeti anyị bụ Agunechemba na Udo Ga-Achi," ka ozi ahụ kwuru.

Mefor kwuru na gọọmenti na-ekele ndị uweojii na ndị nchekwa Udo Ga-Achi maka inwuchi ndị a na-enyo enyo aka ha dị na mmetọ ahụ ma rịọ ndị e mekpara ahụ ka ha gbakọọrọ ndị uweojii na ndị isi otu Udo Ga-Achi aka iji hụ na e wetara ikpe nkwụmọtọ n'okwu ahụ ngwangwa.

Ihe ndị uweojii kwuru maka nwaanyị kọpa e tiri ihe n'Anambra steeti

Mgbe e ndị nche ogbe na-eti nwaanyị ahụ ihe

Ebe foto si, NYSC/X na Screengrab

Nkọwa foto, Mgbe e ndị nche ogbe na-eti nwaanyị ahụ ihe

Ụlọọrụ ndị uweojii n'Anambra steeti ekwuola na a chọpụtala ndị nche ogbe ahụ tiri nwaanyị na-efe ala nna ya ihe n'Oba, gọọmenti okpuru ọchịchị Idemili South dị na steeti ahụ.

Dịka ihe onyonyoo gosiri ebe ndị ọrụ nchekwa na-amaja ma na-eti nwaanyị ahụ ihe na-efegharị n'ịntaneetị, isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Anambra steeti kọwara etu ọnọdụ si dị ugbua n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga kesaara ndị ntaakụkọ.

Tochukwu Ikenga kọwara na "ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ogbe tiri nwaanyị ahụ ihe ma majaa ya".

Ọ sị na "a marala ndị ọrụ nchekwa ogbe ahụ tiri nwaanyị kọpa ihe mana nsogbu dị ugbua bụ onye e tiri ihe apụtaghị, nke na-adọghachị nnyocha a na-eme azụ".

Mana ndị uweojii kwuru na "iti mmadụ ihe n'ụdị ọbụla bụ ịda iwu, ma kwe nkwa na ndị uweoji ga-eji usoro iwu kpee ndị ọrụ nchekwa ogbe ahụ ikpe n'ụlọikpe ma na-eche mgbe nwaanyị ahụ ga-apụta".

"Ha kwere ndị niile na-efe ala nna ha n'Anambra steeti nkwa nchekwa ma gwa ha kpọtụrụ ndị uweojii mgbe ọbụla mmadụ megidere ha maọbụ majaa ha".

Ha ji ohere ahụ dọọ ndị niile na-arụ ọrụ nchekwa n'Anambra steeti aka na ntị banyere ikike dịịrị mmadụ, ma kwuo na ndị uweojii agaghị anabata udiri ajọ agwa ahụ.