Justina Azuka ekeleela Mimi Azikiwe na mmeri ya na ntuliaka ụlọomeiwu Ọnịcha Nọt 1

Justina Azuka vootu nwetere 1,909 iji gbaa onye nke abụọ na ntuliaka ahụ. Justina Azuka bụ nwunye Justice Azuka jibu ọkwa dịka onye na-anọchiteanya Ọnịcha Nọt 1 n'ụlọomeiwu Anambra Steeti.

Ebe foto si, facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Justina Azuka ezigarala Ọkaiwu Mimi Azikiwe meriri ntuliaka ụlọomeiwu Ọnịcha Nọt 1 ozi ekele maka mmeri ya na ntuliaka ahụ.

Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ Independent National Electoral Commision kwupụtara na ọ bụ Mimi Azikiwe meriri ntulaiaka ahụ e mere n'ụbọchị Satọde 16 Ọgọst, 2025.

Cheta na onye rụrụ ọrụ dịka 'returning officer' na ntuliaka ahụ bụ Ọkammuta Ibiam Ikwo-Ekpe kwuru na Ọkaiwu Mimi Azikiwe ji vootu 7,774 merie Justina Azuka nke pati African Democratic Congress (ADC) na ntuliaka ahụ.

Ka ọ dị ugbua, Justina Azuka ekeleela Mimi Azikiwe na mmeri ya.

N'aka nke ọzọ, Sịnetọ na-anọchiteanya Anambra Nọt n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa bụ Sinetọ Tony Nwoye ahọpụtala Justina Azuka dịka onye ndụmọọdụ ya pụrụiche n'ihe gbasara ọrụ pụrụiche bekee kpọrọ 'Special Duties'.

Sinetọ Nwoye kwuru na ọ họpụtara Justina Azuka n'ihi na o kwenyere na ọ bụ nwaanyị kara aka ma nwee obi umeala.

N'okwu ya, Justina Azuka kelere Sinetọ Nwoye maka nhọpụta ahụ ma kwuo na ọ ga-eji obi ya niile rụọ ọrụ n'ọkwa ahụ.

Foto Justina Azuka na Sinetọ Tony Nwoye

Ebe foto si, Justina Azuka

Nkọwa foto, Foto Justina Azuka na Sinetọ Tony Nwoye

Nwa Nnamdi Azikiwe emeriela ntuliaka ịnọchịteanya Onịcha Nọt 1 n'ụlọomeiwu Anambra Steeti

Ọkaiwu Mimi Azikiwe nọ n'aka ekpe meriri ntuliaka iji nọchie Justice Azuka nọ n'aka nri n'ụlọomeiwu Anambra Steeti dịka onye na-anọchiteanya Ọnịcha Nọt 1. Ndị ojiegbe tọọrọ Justice Azuka n'ọnwa Disemba 2024 ma gbuo ya.

Ebe foto si, Justice Azuka/Facebook

Ụlọọrụ Independent Nationala Electoral Commission (INEC) ekwupụtala na ọ bụ Ọkaiwu Mimi Azikiwe nke pati All Progressives Grand Alliance (APGA) meriri na ntuliaka iji họpụta onye ga-anọchiteanya mpaghara Ọnicha Nọt 1 n'ụlọomeiwu Anambra Steeti n'ụbọchị Satọde, 16 Ọgọst, 2025.

Ọkaiwu Mimi Azikiwe bụ nwa nwaanyị Nnamdi Azikiwe bụ onyeisiala mbụ na Naịjirịa.

Onye rụrụ ọrụ dịka 'returning officer' na ntuliaka ahụ bụ Ọkammuta Ibiam Ikwo-Ekpe kwuru na Ọkaiwu Mimi Azikiwe ji vootu 7,774 merie Justina Azuka nke pati African Democratic Congress (ADC) na ntuliaka ahụ.

Foto Ọkaiwu Mimi Azikiwe na Justina Azuka

Ebe foto si, ABS/BBC

Nkọwa foto, Ọkaiwu Mimi Azikiwe ji nke pati APGA meriri Justina Azuka nke pati ADC na ntuliaka ahụ.

Justina Azuka vootu nwetere 1,909 iji gbaa onye nke abụọ na ntuliaka ahụ. Justina Azuka bụ nwunye Justice Azuka jibu ọkwa dịka onye na-anọchiteanya Ọnịcha Nọt 1 n'ụlọomeiwu Anambra Steeti.

Chuka Ojekwe ji aha All Progressives Congress (APC) zọọ ọkwa ahụ nwetara vootu dị 1,371 ebe Njideka Ndiwe nke pati Young Progressives Party (YPP) nwetara akara vootu 655.

Oge anyị kpọtụụrụ Justina Azuka iji nụrụ ọnụ mmiri okwu ya banyere mpụtara ntuliaka a, onye ọrụ ya gwara anyị na ha ga-azaghachi anyị n'oge na-adịghị anya.

Cheta na ntuliaka ahụ bụ iji họpụta onye ga-anọchi Justice Azuka lara mmụọ n'ụlọomeiwu Anambra Steeti.

Emmanuel Nwachukwu ga-anọchi anya Ifeanyi Ubah nwụrụ anwụ

Foto Emmanuel Nwachukwu na Ifeanyi Ubah

Ebe foto si, Ifeanyi Ubah/Emmanuel Nwachukwu/Facebook

Nkọwa foto, Emmanuel Nwachukwu nọ n'aka ekpe meriri ntuliaka Sinetọ ga-anọchiteanya Anambra Saụt n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa. Ifeanyi Ubah nọ n'aka nri, bụbu Sinetọ na-anọchiteanya Anambra Saụt tupu ọ nwụọ n'ọnwa Julaị 2024.

N'aka nke ọzọ, INEC kwuru na ọ bụ Emmanuel Nwachukwu a maara dịka Onodugo bụ onye meriri na ntuliaka iji họpụta Sinetọ ga-anọchiteanya Anambra Saụt n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa.

Emmanuel Nwachukwu nke pati All Progressives Grand Alliance (APGA) ji vootu 90,408 merie ntuliaka ahụ. Azuka Okwuosa nke pati All Progressives Congress (APC), nwetara vootu 19,812 ebe Donald Amamgbo nke pati African Democratic Congress (ADC) nwetara naanị vootu 2,889.

Ntuliaka a bụ iji họpụta onye ga-anọchi Ifeanyi Ubah lara mmụọ bụ onye jibu ọkwa ịnọchiteanya Anambra Saụt n'ụlọomeiwu Sineti.

Mgbe Inec na-akpọpụta ndị meriri na ntuliaka Anambra
Nkọwa foto, Mgbe Inec na-akpọpụta ndị meriri na ntuliaka Anambra

A hụrụ ebe a na-enye ndị tụrụ vootu ego na Ward 4, unit 008 Ọnịsha North

Aha onyonyo, Onyoonyo gosiri ebe a na-enye ndị tụrụ vootu ego na Ward 4, unit 008 Ọnịsha North
otu nwoke nọ na-enye nwannyị tụrụ vootu ego na Ward 4, unit 008 Ọnịcha Nọt
Nkọwa foto, Otu nwoke nọ na-enye nwannyị tụrụ vootu ego na Ward 4, unit 008 Ọnịcha Not

Mgbe BBC Igbo gara wọdu ụfọdụ, ka ntuliaka si a ga-aga n'Anambra steeti, a hụrụ ebe a na-enye ndị tụrụ vootu ego na Ward 4, unit 008 Ọnịcha Nọt.

Otu nwoke nke a na-amaghị pati ọ na-akwado nọ na-enye ndị mmadụ egọ ruru puku iri abụọ maọbụ puku iri ka ha nwereike tụọ vootu.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-aga kwuru ya bụ nwoke ahụ ozugbo ha tụchara vootu ị nara ego nke ha. Ndị anyi gbara ajụjụ ọnụ na-ekweghị ka akpọ aha ha maọbu gosi ihu ha na oyonyo si na ọ bụ pati APGA ka nwoke ahụ na-eke ego na-agwa ha ka ha tunyere vootu.

Ihe BBC Igbo chọpụtara na nwoke ahụ nọ na-eke ego a n'ihu ndị ọrụ nchekwa ha na ndị ọrụ INEC mana enweghị onye jidere.

Etu mpụtara ntuliaka e mere si gaa n'akara

Lee ka Inec ji wee gụkọta mpụtara ntuliaka.

  • Ngụkọta ndị debanyere aha ịtụ vootu 91,261
  • Ọnụọgụ nke ndị ntuliaka enwetara 12,417
  • Vootu ndị agụrụ 11,814
  • Vootu ndi a jụrụ ajụ 419
  • Ngụkọta ntuliaka e mere 12,233
A na-atụanya mpụtara ntuliaka onye nnọchiteanya Ọnịcha Nọt n'ụlọomeiwu Anambra steeti
INEC
Nkọwa foto, Ndị ọrụ INEC

Kamgbe a tụchara vootu na mpaghara dị icheiche n'Ọnịcha Nọt n'Anambra steeti maka onye ga-annọchiteanya ha n'ụlọomeiwu steeti ahụ, ndị ọrụ ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC, e burula mpụtara ntuliaka ahụ gawa n'isi ụlọọrụ gọọmenti nke dị n'okpuru ọchịchị Ọnịcha Nọt.

Ugbua a na-atụanya na a ga-ewepụta etu okwe si gbaa n'ogige ntuliaka niile bụ ebe ndị mmadụ bịara tụọ vootu.

Ndị ọrụ INEC
Nkọwa foto, Ndị ọrụ INEC

Lee ndị na-azọ ọkwa Onye nnọchiteanya Ọnịcha Nọt

Ndị na-azọ ọkwa onye nnọchịtaanya Onicha Nọt n'ụlọomeiwu Anambra steeti

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Justina Azuka, Chuka Ojekwe, Ifeoma Azikiwe na Njideka Ndiwe

Ndị na-azọ ọkwa onye nnọchiteanya ndị Ọnicha North n'ụlọomeiwu Anambra Steeti gụnyere Justina Azuka bu onye ji pati ADC, Africa Democratic Congress, Ezennia Chuka Ojekwe nke pati nọ n'ọchịchị APC bụ All Progressives Congress. Onye ọzọ bụ Mimi Ifeoma Azikiwe nke pati APGA, All Progressive Grand Alliance ha na Njideka Ndiwe si pati YPP, Young Progressives Party.

Cheta na Justina Azuka bụ onye akụkọ kwuru na ndị ntọ gburu di ya n'oche ahụ n'oge garaga nke mere e ji eme ntuliaka mmegharị nke a.

Oge e bidoro ịtụ vootu na ntuliaka mmegharị Anambra steeti

Ọtụtụ ndị mmadụ kwụ n'ahịrị dịka vootu na-aga n'ihu ugbua na Ward 4, ngalaba ntuli aka 008
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ kwụ n'ahịrị dịka vootu na-aga n'ihu ugbua na Ward 4, ngalaba ntuli aka 008

Ndị mmadụ amalitela ịtụ vootu na ntuliaka mmegharị nke ndị nnọchiteanya ụlọomeiwu n'okpuru ọchịchị Ọnịcha North n'Anambra steeti.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwụ n'ahịrị dịka ntuliaka na-aga n'ihu ugbua na Ward 4, ogige ntuliaka 008 sị n'Ọnịcha Nọt na Ward 3, ogige ntuliaka 009 dị n'Ọnicha Nọt.

Ndị ntụliaka ebidola ịtụ vootu na ntuliaka mmegharị nke ndị nnochiteanya ụlọomeiwu n'Anambra
Nkọwa foto, Ndị ntụliaka ebidola ịtụ vootu na ntuliaka mmegharị nke ndị nnochiteanya ụlọomeiwu n'Anambra

A malitela ikesa ihe ndị e ji atụ vootu n'Anambra maka ntuliaka mmegharị

ndị ọrụ nchekwa dị iche iche n'ele anya dịka ndị INEC na eburu ihe ngwa ọrụ ha e ji atụ vootu
Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche n'ele anya dịka ndị INEC na eburu ihe ngwa ọrụ ha e ji atụ vootu

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjiria bụ Independent National Electoral Commission (INEC) amalitela ikesa ihe ndị e ji atụ vootu na mpaghara ugwu Ọnịcha maka ntuliaka mmegharị nke ndị nnochiteanya ụlọomeiwu nke steeti ahụ.

E bu ihe ndị ahụ e ji atụ vootu gaa n'ogige ntuliaka dị iche iche n'okpuru ọchịchị Ontisha North, dịka ndị nchekwa nọ na-elekọta ngwaọrụ ndị ahụ.

Iji hụ na e mere ntuliaka na-enweghị nsogbu, a ga-enwe mmachi maka njem ụgbọala site n'elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere isii nke ehihie na mpaghara ndị a na-eme ntuliaka.

Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ amalitela ịkwụ n'ahịrị, dịka ntuliaka ga-ebido n'oge adịghị anya.

Ụgbọala bụ ngwa ọrụ e ji atụ vootụ na-aga mpaghara dị iche iche ebe a ga-eme ntuliaka
Nkọwa foto, ụgbọala bụ ngwa ọrụ e ji atụ vootụ na-aga mpaghara dị iche iche ebe a ga-eme ntuliaka