A nwụchiela ndị a na-enyo gburu Omeiwu Azuka Justice n'Anambara steeti

Ebe foto si, JUSTICE AZUKA/FACEBOOK
Ndị uweojii ekwuola na ha ejidera onye kwetere na aka ya dị n'ogbugbu e gburu omeiwu n'Anambra steeti bụ Azuka Justice.
Dịka akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ikenga Tochukwu zitere BBC Igbo, ha jidere onye ahụ n'Iyowa Odekpe, dị n'okpuru ọchịchị Ogbaru na Desemba 8, 2025.
Aha onye ahụ bụ Ugochukwu Uzor, dị afọ iri abụọ na isii ma bụrụkwa onye a na-enyo maka izu ohi.
Ndị uweojii kwuru na mgbe ha na-agba ya ajụjụ ọnụ ka o kwetere na ya bụ onyeisi ọtụtụ out ndị ekpereme n'Anambra steeti.
"O kwuru na ya so na ndị tọrọ ma gbuo Omeiwu Azuka Justice bụ onye omeiwu n'ụlọomeiwu n'Anambra steeti na Desembs 24, 2024".
Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga nwere, ọ kọwara na ọ dị mwute na ndị omekome abụọ ahụ gbara ọsọ ma kwe nkwa nd ndị uweojii steeti ahụ dị njikere iji hụ na a nwụchiri ha.
Etu ndị a na-enyo na ha gburu onyeomeiwu Anambra Steeti si rie mbọmbọ ọsọ n'aka ndị uweojii
Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na mmadụ abụọ a na-eyo eyo n'aka ha dị n'ọnwụ onyeomeiwu steeti ahụ bụ Justice Azuka a tọọrọ n'ọnwa Disemba 2024 ma gbuo ya, eriela mbombo ọsọ n'aka ndị uweojii.
Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara, kwuru na mmadụ abụọ ahụ gbara ọsọ dịka ha gara igosi ndị uweojii na-eme nnyocha ebe onye ha na-eresi ụgbọala ha zuru n'ohi.
Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii nwụchiri onye ahụ na-azụ ụgbọala ahụ e zuru ezu ka mmadụ abụọ ahụ gbapụrụ ọsọ.
Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Ikioye Orutugu kwuru na ngwangwa o nwetara ozi banyere mmadụ abụọ ahụ gbara ọsọ, o nyere iwu ka a malite ịchọ ma nwuchie ha ma kwuo ka a nwụchie ndị uweojii ndị ahụ ndị omekome ahụ gbapụrụ n'aka ha ma nye ha ntaramahụhụ zuru ezu ma ọbụrụ na a chọpụta na ọ bụ ha tọhapụrụ ndị omekome ahụ.
Orutugu kwere nkwa na ndị ọrụ kwụrụ chịm inweta ezi nchekwa na steeti ahụ ma kwuo na ha ga-anwụchi mmadụ abụọ ahụ gbara ọsọ ma taa ha ahụhụ dịka iwu siri kwu.
Ihe ndị ụlọomeiwu Anambra Steeti kwuru

Ebe foto si, Anambra House of Assembly
Onyeisi ụlọomeiwu Anambra steeti bụ Somtochukwu Nkem Udeze akatọọla ozi ahụ kwuru na mmadụ abụọ a na-enyo gburu Justice Azuka riri mbo mbo ọsọ n'aka ndị uweojii steeti.
Somtochukwu Nkem Udeze kwuru na akụkọ a bụ nke bụ ihe aka mgba nye mbọ ndị uweojii na-agba iji nwụchie ndị niile aka ha dị n'ọnwụ nwamadị ahụ.
O mere ka o doo anya nd ndị omeiwu steeti ji otu olu na-ekwu ka ndị uweojii chọọ ma nwụchie mmadụ abụọ ahụ.
Ọ gwara kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ ka o wepụta aha mmadụ abụọ gbara ọsọ nakwa foto ha iji mee ka ọhanaeze mara ndị ha bụ ma nyere aka nwụchie ha.
Justice Azuka: Lee ka e si mee oliliozu onyeomeiwu ahụ ndị ntọ gburu n'Anambra Steeti

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo/Facebook
E lieela ozu Justice Chukwunenye Azuka bụ onyeomeiwu Anambra steeti a tọọrọ ma gbuo na steeti ahụ n'ọnwa Disemba, 2024.
N'ozi ya oge a kara nwamadị ahụ ụka ikpeazụ n'ụlọụka St Mary's Catholic Church Church Onitsha, Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra steeti katọrọ ọnwụ Justice Azuka onye ọ kọwara dịka onyte chọrọ ọdịmma obodo.
O kwuru na nwamadị ahụ gbara mbọ ịhụ na Anambra steeti nwere ezi udo.
Gọvanọ Soludo gara n'ihu too ndị uweojii maka mbnọ ha gbara iji nwụchie ndị ahụ aka ha dị n'ọnwụ Justice Azuka ma kwe nkwa n gọọmenti ya ga-ahụ na ha nwetara ntaramahụhụ dịka iwu siri kwu.

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo/Facebook
Gọvanọ Charles Soludo ji ohere ahụ dọọ ndị omekome aka na nti ma kwuo na ọchịchị ya dị njikere igbochi ajọ agwa ha dị iche iche ma nweta ezi nchekwa na steeti ahụ.
Ọ gara n'ihu tie ezinaụlọ Justice Azuka aka n'obi ma kwuo na gọọmenti ya ga-enye ha nkwado zuru ezu.
Oliliozu ya dọtara ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Anambra steeti ndị bịara kwanyere ya ugwu ikpeazụ. Ha gụnyere aka chịburu steeti ahụ bụ Peter Obi na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo/Facebook
Justice Azuka: Ndị uweojii ahụla ozu onye omeiwu Anambra Steeti a tọọrọ n'ọnwa Disemba 2024

Ebe foto si, JUSTICE AZUKA/FACEBOOK
Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na ha ahụla ozu onye omeiwu ahụ aha ya bụ Justice Azuka, a tọọrọ n'Ugwunabankpa Road dị n'Ọnịsha dịka ọ na-aga njem n'ụbọchị 24 Disemba, 2024.
Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na a hụrụ ozu onye omeiwu ahụ n'ụtụtụ Tọzde 6 Febụwarị 2025 n'akụkụ akwammiri Niger nke abụo.
O kwuru na ọ bụ ndị nchekwa si n'ụlọọrụ nchekwa dị iche iche gụnyere ndị uweojii na AVG Operatives bụ ndị na-agba mbọ ịchọpụta onye omeiwu ahụ na-anọchite anya Onitsha North, hụtara ozu onye omeiwu ahụ a tọọrọ.
O kwuru na ndị uweojii ewerela ọnọdụ n'ebe ahụ a hụrụ ozu onye omeiwu ahụ ka ha nwee ike nwụchie ndị a na-enyo enyo aka ha dị n'ọnwụ Justice Azuka.
Ndị uweojii amalitela ịchọ onye omeiwu a tọrọ n'Anambra Steeti

Ebe foto si, JUSTICE AZUKA/FACEBOOK
Ndi uweojii Anambra steeti ekwuola na ha amalitela ịchọ onye omeiwu na-anọchiteanya mpaghara Onitsha Nọt 1 n'ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Justice Azuka, a tọrọ n'abalị Tuzde 24 Disemba, 2024.
Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara, kọwara na ndị omekome a maghị aha ha tọrọ onye omeiwu ahụ n'ụzọ Ugwunapampa n'abalị Tuzde, oge ọ na-alọta ụlọ ya.
Ikenga kwuru na ndị uweojii amalitela ọrụ iji ịchọta onye omeiwu ahụ ma nwụchie ndị omekome ahụ tọọrọ ya.
Justice Azuka, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ onye otu Labour Pati bụ onye na-anọchiteanya Onitsha Nọt 1 n'ụlọomeiwu Anambra steeti.
Cheta na ụlọikpe kpebiri na ọ bụ Justice Azuka meriri na ntuliaka e mere n'afọ 2023 ka ụlọọrụ INEC kpọpụtara Douglas Egbuna nke pati PDP dịka onye meriri na ntuliaka.









