Gọọmentị Anambra Steeti agbachiela ụlọekpere 'Children of Light Anointing Ministry' nke Onye eze Jesus nwee

Onye amụma Onye eze Jesus

Ebe foto si, Prophet Onye eze Jesus Ministries/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

Gọọmentị Anambra Steeti agbachiela ụlọ okpere a kpọrọ "Children of Light Anointing Ministry" dị n'obodo Nkpor, nke onye amụma Onye eze Jesus nwee.

A gbachiri nke a maka ebubo na Onye eze Jesus na-achụ aja ma na-agwọ ọgwụ 'okeite'.

Ụlọ ekpere a dị n'obodo Amafor, Nkpor nke okpuruọchịchị Idemili North ka ndị ọrụ nchekwa Agụnaechemba gbachiri mgbe ha gara ebe ahụ n'ụbọchị Sọnde.

Ken Emeakayi, bụ onye ndụmọdụ Gọvanọ Soludo n'okwu nchekwa obodo kwuru na a gbachiri ụlọ ekpere ahụ site na mkpesa ndị mmadụ Nyere nakwa ihe onyonyo ebe nwamadị a kwuru na ọ na-achụ aja okeite.

O kwuru na a ga-enyocha mmiri nsọ nakwa ihe ndị ọzọ a hụrụ n'ọdọmmiri Bathsaida dị n'ụlọekpere ahụ.

O kwuru na gọọmentị emegideghi okpukperechi ọdịnala kama na ha agaghị anabata ndị na-akwado ego mbute.

Etu e si nwuchie 'aka na-asa ụchụ worldwide'

Onye eze Jesusu

Ebe foto si, Onye eze Jesusu/Facebook

Agụnaechemba bụ otu nchekwa pụrụiche nke gọọmentị Anambra Steetị hiwere anwuchiela onye amụma a ma ama bụ Onye eze Jesus n'ụbọchị Satọde 15 Febụwarị 2025.

Ihe onyonyo na-efegharị na sohal midia gosiri ka ndị ọrụ nchekwa a wuchiri n'ụlọụka ya dị n'obodo Nkpor ma kpọro ya na-apụ.

Akụkọ kwuru na ụfọdụ ndị otu Agụnaechemba bịa n'obi ebe Onye eze Jesus dịka ndị chọrọ ka ọ chụọrọ ha aja, ka nwamadịa a malitere ịchụrụ ha aja, ndị otu ha ndị ọzọ wuchiri ma nwuchie ya n'ihu ọrụ.

A na-ebo ya ebubo na ọ na-agwọ ọgwụ ma na-achụ aja nye ndị ntoroọbịa na-egwu chandum a maara dịka "yahoo boys" ka ha nwee ego mbute.

Mana mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Law Mefor, ọ gwara anyị na ya amaghị ma nke a ọ bụ eziokwu maọbụ ụgha.

N'aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara anyị na o nweghị ihe ndị uweojii ma banyere ya bụ nnwụchi.

Onye Eze Jesus

Ebe foto si, Facebook/Onye Eze Jesus

Nkọwa foto, Onye Eze Jesus

Mana Onye eze Jesus kwupụtara n'otu ihe onyonyo o tinyere n'akara Facebook ya n'abalị Fraịde 14 Febụwarị na obi adịghị ọtutụ ndị mmadụ mma banyere ya.

O kwuru na ụfọdụ ndị a nwuchiri nna ha ukwu bụ dibịa na-aga n'ihu na-ewepụta ihe onyonyo ya bụ Onyeze Jesus mere n'afọ 2020 na 2021 mgbe ọ ka bụ dibịa.

O kwuru na nne nna ya bụ dibịa; nna nne ya bụkwa oke dibịa n'Umuoji nke mere ka ịbụ dibịa jiri maa ya.

O kwukwara na Chineke kpọkwara ya oku ka o jeere ya ozi mana enweghị onye nkụzị mere ka o tinye aka n'ihe omenala tupu Chineke were gosi ya ụzọ eziokwu n'afọ 2024.

Ọ gara n'ihu kwuo na egwu anaghị atụ ya maka na ya anaghị egbu mmadụ, ọ anaghị arụrụ ndị ọjọọ maọbụ ndị ekperima ọrụ.

Ọ gwara ndị Gọọmentị na ha nwere ike ịbịa n'ụlọ ya mee nnyocha maọbụ kpụrụ ya na ha hụ ihe gosiri na ya ka na-eme ihe o kwuru na ya adịghị emezi.

A nwuchikwara Eke Hit bụ dibia a ma ama n'Okija

Dibia ahụ bụ otu n'ime dibia ndị na-ewu ewu na-eji soshal midia ekesa ọrụ ya nke gụnyere etu o si emere ndị mmadụ ọgwụ ego.

Ebe foto si, EKE HIT/FACEBOOK

Nkọwa foto, Dibia ahụ bụ otu n'ime dibia ndị na-ewu ewu na-eji soshal midia ekesa ọrụ ya nke gụnyere etu o si emere ndị mmadụ ọgwụ ego.

Ndị ọrụ nchekwa n'Anambra steeti anwụchiela otu dibia a ma ama aha ya bụ Ekene Igboekweze onye e ji Eke Hit mara.

Nwụchi ya gbadoro ụkwụ n'iwu ọhụrụ Gọvanọ Chukwma Soludo binyereaka na ya n'ọnwa Jenụwarị iji nweta ezi nchekwa na steeti ahụ.

Iwu ọhụrụ a a kpọrọ 'Anambra State Homeland Security Law 2025', bụ nke gọọmenti kọwara dịka nke ga-ekpochapụ ndị dibia adigboroja na ndị eze nwaanyị e kwuru na ọ bụ ha na-enweta ajọ ọnọdụ nchekwa na mpaghara ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Vidio oge ndị ọrụ nchekwa nwụchiri Eke Hit n'ụlọ ya dị n'Okija gbara n'anwụ na soshal midia.

Dibia ahụ bụ otu n'ime dibia ndị na-ewu ewu na-eji soshal midia ekesa ọrụ ya nke gụnyere etu o si emere ndị mmadụ ọgwụ ego.

Nwụchi ya na-abịa n'ime ụbọchị ole na ole gọọmenti steeti ahụ nwụchiri dibia ọzọ a ma ama aha ya bụ Chidozie Nwangwu e ji Akwa Ọkụkọ Tiwara Aki mara.

Onye ka Eke Hit bụ?

Oge ndị ọrụ nchekwa nwụchiri Eke Hit

Ebe foto si, ANAMBRA BROADCASTING SERVICE

Nkọwa foto, Oge ndị ọrụ nchekwa nwụchiri Eke Hit

Ezigbo aha ya bụ Ekene Igboekweze. Ọ bụ onye Umuofo Okija obodo dị n'okpuru ọchịchị Ihiala, Anambra steeti.

O kwuru na ọ bụ otu onye ọ rụọrọ ọrụ nyere ya aha Eke Hit maka na ọgwụ o meere ya rụrụ ọrụ. Eke si na aha ya bụ Ekene ebe 'Hit' bụ maka na ọgwụ na-arụ ihe e ji maka ya gwọ ya.

Ọ kọwara na o nwetara onyinye ịgwọ ọgwụ n'aka nna ya bụ Nwokocha Igbokweze. Dịka o si kwuo, nne na nna ya mụrụ ụmụ 12 mana ọ bụ naanị ya dị ndụ ugbua.

Eke Hit kwuru na ọ bụbu onye man server n'ụlọụka Katọlik tupu ọ malite ịrụ ọrụ onye nche. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ gara mba Gana ije zụọ ahịa mana ọ lọtara n'ihi na mmụọ nna ya na-achụgharị ya.

Eke Hit bụ otu dibia na-etu ọnụ na ọ na-akwụghachi ndị na-abịa na nke ya ego ma ọ bụrụ na ọgwụ o meere ha arụghị ọrụ n'ime abalị anọ. O kwuru na o kwenyekwara na Chineke ma kọwaa na ọ na aga ụlọụka otu ugboro n'afọ.

Iwu 'Anambra State Homeland Security Law 2025'

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ajọ ọnọdụ nchekwa na mpaghara ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ nke gọọmenti Anambra steeti kwuru na aka ndị dibia adigboroja dị na ya.

Dịka Gọvanọ Soludi si kwu, ha hụrụ ihu agbara n'ọtụtụ ogige ndị ntọ ndị ọrụ nchekwa wakporo na steeti ahụ.

Ọ bụ nke a mere ka ụlọomeiwu Anambra steeti mepụta iwu Homeland Security Bill nke Gọvanọ Soludo binyereaka na ya n'ọnwa Jenụwarị 2025.

Iw u a bụ ebumnobi ya bụ ihiwe ndị ọrụ nchekwa a kpọrọ Agunechemba. Mana mpaghara 18 iwu ahụ kwuru okwu banyere ịmachi ime ọgwụ ego na steeti ahụ.

Mpaghara a kwuru na 'Onye dibia ọbụla nyere mmadụ ọgwụ iji mee mpụ ọbụla, kpata ego n'ụzọ na-ezighị ezi emegidela iwu steeti ahụ. Onye dị etu a nwereike ịga ụlọmkpọrọ ruo afọ isii maọbụ kwụọ ego ruru nde iri abụọ maọbụ ha abụọ.

Iwu a kwuru na iwu megidere onye ọbụla ikwu na na o nwere ikike pụrụiche, ebe onye ọbụla a nwụchiri maka nke ga-egosi na ikike ya bụ eziokwu. Ọ bụrụ na o meghị nke, onye di etu a nwereike ịga ụlọmkpọrọ ruo afọ isii maọbụ kwụọ ego ruru nde iri abụọ maọbụ ha abụọ.

Dibia mbụ Gọọmenti Anambra nwuchiri bụ Akwa Ọkụkọ Tiwara Akị

Akwa Ọkụkọ Tiwara Akị ezigbo aha ya bụ Chidozie Nwangwu

Ebe foto si, FACEBOOK/AKWA TIWARA AKI

Nkọwa foto, Akwa Ọkụkọ Tiwara Akị ezigbo aha ya bụ Chidozie Nwangwu

Kemgbe akụkọ pụtara na a nwuchiri dibia a ma ama n'Anambra steeti aha ya bụ Chidozie Nwangwu onye e ji Akwa Ọkụkọ Tiwara Akị mara, ọtụtụ akụkọ amalitela ifegharị n'ịntanet banyere nwuchi nwaamadị ahụ.

Mana ka ọ dị ugbua, ihe na-arụtụ aka na ọ bụ gọọmenti Anambra steeti ji Akwa Ọkụkọ Tiwara Akị dịka ihe onyonyo pụtara ihe gosiri ebe osote Gọvanọ Anambra steeti bụ Onyeka Ibezim na-agba nwaamadị ahụ ajuju ọnụ.

N'ihe onyonyo ahụ, osote Govanọ Anambra kwuru na ha ga-mee nnyocha banyere ọgwụ ahụ akụkọ kwuru na Akwa Ọkụkọ Tiwara Aki na-agwọ a kpọrọ 'okeite' nke gọọmenti steeti machiri ndị dibia ọbụla ịgwọ.

Ihe Gọọmenti kwuru banyere nwụchi Akwa Ọkụkọ Tiwara Aki

Kọmịshịọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Maazi Law Mefor kwuru na ọ bụ eziokwu na a nwụchiri Akwa Ọkụkọ Tiwara Aki

Ebe foto si, FACEBOOK/AKWA TIWARA AKI

Nkọwa foto, Kọmịshịọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Maazi Law Mefor kwuru na ọ bụ eziokwu na a nwụchiri Akwa Ọkụkọ Tiwara Aki

Oge BBC Igbo kpọrtụrụ kọmịshịọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Maazi Law Mefor, ọ gwara anyị na ọ bụ eziokwu na gọọmenti Anambra steeti nwuchiri Akwa Ọkụkọ ma kwuo na ha na-eme nnyocha banyere ebubo na ọ na-agwọ okeite.

N'okwu ya "Agaghị m ekwu ihe ọbụla ugbua maka na anyị na-eme nnyocha n'isa Akwa Ọkụkọ Tiwara Aki".

"Ihe ọbụla m kwuru ugbua nwereike imetụta nnyocha a na-eme ma bute nghọtafe, mana naanị ihe anyị gwara unu na mbụ bụ na iwu dị n'Anambra steeti enweghị onye ọ na-asọ anya." Anyị ga-elebanye anya n'ihe Akwa Ọkụkọ Tiwara Akị na ndị ọzọ na-eme".

Otu onye ọzọ maara Akwa Ọkụkọ Tiwara Aki gwara anyị na "Akwa ka nọ n'aka gọọmenti Anambra Steeti".

O kwuru na "a ka na-eme nnyocha n'isi ya".

N'aka nke ọzọ, BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga onye gwara na ya amaghị ihe ọbụla banyere okwu nwuchi Akwa.

N'okwu Ikenga "enweghị m ihe m nwere ikwu banyere okwu nke a, biko".

Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor katọrọ nwuchi Akwa Ọkụkọ Tiwara Aki

Ejiofor sị na gọọmenti Anambra steeti dara iwu Naịjirịa mgbe ha gara nwuchie ma jide nwaamadị ahụ ma kpọọ oku ka a tọhapụ ya.

Ebe foto si, FACEBOOK/AKWA TIWARA AKI

Nkọwa foto, Ejiofor sị na gọọmenti Anambra steeti dara iwu Naịjirịa mgbe ha gara nwuchie ma jide nwaamadị ahụ ma kpọọ oku ka a tọhapụ ya.

Ọkaiwu a ma ama na Naịjirịa bụ Ifeanyi Ejiofor akatọọla etu e si nwuchie dibia Akwa Ọkụkọ Tiwara Aki ma kwuo na nke ahụ megidere ikike dịaara ya dịka mmadụ.

Ifeanyi Ejiofor bụ onye mere ka amata nke a n'akara ihu akwụkwọ Facebook ya, kwuru na iwu Naịjirịa nyere onye ọbụla ikike ikpere chi ya n'ụdị masịrị ha nakwa ikike ndị ọzọ.

Ejiofor sị na gọọmenti Anambra steeti dara iwu Naịjirịa mgbe ha gara nwuchie ma jide nwaamadị ahụ ma kpọọ oku ka a tọhapụ ya.