Peter Obi akwadola Justina Azuka maka ntuliaka ụlọomeiwu Anambra steeti

Aha onyonyo, Ihe mere m ji azọ ọkwa ịnọchi di m n'ụlọomeiwu Anambra Steeti - Justina Azuka
Peter Obi akwadola Justina Azuka maka ntuliaka ụlọomeiwu Anambra steeti
Peter Obi na Ezinaụlọ Justina Azuka

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook

Nkọwa foto, Peter Obi na Ezinaụlọ Justina Azuka

Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti ma bụrụkwa onye ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ Patị zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 akwadoola nwaada Justina Azuka ịga ụlọ omeiwu na ntụlịaka a ga-eme na steeti ahụ.

Peter Obi bụ onye mere ka a mata nke a n'akara soshal mịdịa ya kwuru na ya na-akwado nwaada Justina Azuka bụ onye dị ya nwụrụ n'aka ndị ntọ.

Obi gara zute azịnaụlọ Justina Azuka ebe ọ nọ nye ya nkwado ahụ ma gwa ndị niile nwere obi omiko nakwa mmetụta mmadụ ka ha donyere ya ukwu.

Ihe mere m ji akwado Justina Azuka - Peter Obi

Peter Obi na Justina Azuka

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook

Nkọwa foto, Peter Obi na Justina Azuka

N'okwu Peter Obi "Nwaada Azuka pụtara ịzọ ọkwa ịnọchịtaanya Onịcha Nọt 1 n'ụlọ omeiwu Anambra steeti n'agbanyeghị ihe mgbanwa obi mere ezinaụlọ ya".

"Ọ ga-anọ ọnwa iri na atọ fọrọ afọ n'ọchịchị di ya e gburuegbu n'aka ndị ntọ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ binyere ya aka".

"Ọ bụ nne ụmụaka atọ. Nwa ya nke mbụ dị afọ asaa, ndị ọzọ dị afọ ise na afọ atọ".

"Nwaada Azuka nwere asambodo HND na 'Public Administration' ma nwee amamụihe ị ga-ozi".

"A na m akpọ ka ndị niile ezi ihe na-amasị n'Anambra steeti nakwa ụwa niile nye ya nkwado ma dọnyere ya ukwu nke ga-enyere ya aka beleta ahụhụ ọnwụ dị ya ndị ntọ gburu egbu".

Obi sị na naanị ihe ga-egosi na ihe mere mmadụ na-emetụta ndị ọzọ bụ ịkwado Azuka na ntuliaka ụlọomeiwu ahụ n'ụbọchị Satọde 16 Ọgọst 2025.

"Na Naịjirịa ọhụrụ, anyị ga-enwe mmetụta agbataobi anyị ọkachasị n'oge mkpa. Anyị ga-akwado ikike dịara mmadụ ma kwalite ndị maara ihe ka ha banye n'ọkwa ọchịchị".

Ihe mere m ji azọ ọkwa ịnọchi di m n'ụlọomeiwu Anambra Steeti - Justina Azuka

    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Justina Azuka bụ nwunye Justice Azuka lara mmụọ, ekwuola ihe mere o ji na-azọ ọkwa ịnọchiteanya mpaghara Onitsha North Constituency 1 n'ụlọomeiwu Anambra steeti na ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị Satọde 16 Ọgọst, 2025.

Na mkparịtaụka Justina Azuka na BBC Igbo nwere, o kwuru na ọ na-azọ ọkwa ahụ iji mezuo mkparịtaụka ya na di ya nwere tupu ọ nwụọ.

Ọ gara n'ihu kwuo ihe mere o ji azọ ọkwa ahụ na pati African Democratic Congress na-abụghị Labour Pati di ya zọrọ ọkwa ahụ na ya.

Cheta na ụlọikpe kpebiri na ọ bụ Justice Azuka meriri na ntuliaka e mere n'afọ 2023 ka ụlọọrụ INEC kpọpụtara Douglas Egbuna nke pati PDP dịka onye meriri na ntuliaka.

Ebe foto si, JUSTICE AZUKA/FACEBOOK

Nkọwa foto, Justice Azuka, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ onye otu Labour Pati bụ onye na-anọchiteanya Onitsha Nọt 1 n'ụlọomeiwu Anambra steeti.
BBC News Igbo abanyela n'ọbaozi Whatsapp Chanelụ
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i sonye na Whatsapp Chanelụ anyị

Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara oge ahụ kwuru na ndị omekome a na-amaghị ndị ha bụ tọórọ onye omeiwu ahụ n'ụzọ Ugwunapampa n'abalị Tuzde 24 Disemba, 2024, oge ọ na-alọta ụlọ ya.