Anyị amaghị na ndị anyị nyefere ọchịchị ga-ahapụ ịrụcha ọrụ anyị malitere - Sullivan Chime

Aha onyonyo, Ihe ndị m na-emeghị kachasị ewute m oge m bụ Gọvanọ Enugwu Steeti - Sullivan Chime
Anyị amaghị na ndị anyị nyefere ọchịchị ga-ahapụ ịrụcha ọrụ anyị malitere - Sullivan Chime
    • Onye dere ya, Michael Ngene, Ebere Ekeopara, Gift Ufuoma na Donald Wogu
    • Ebeg o si, BBC Lagos

Sullivan Chime bụ Gọvanọ Enugwu Steeti malite n'ọnwa Mee afọ 2007 ruo n'ọnwa Mee 2015.

Oge ọ nọ n'ọchịchị, o kwuru na ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ dị iche iche iji nweta mmepe nakwa ọdịmma ndị Enugwu.

Mana mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Sullivan Chime kwuru na e nwere ọtụtụ ihe na-ewute ya ọ na-emeghị oge ọ bụ Gọvanọ.

Sullivan Chime chịrị Enugwu Steeti malite n'afọ 2007 ruo afọ 2015

Ebe foto si, Sullivan Chime

Nkọwa foto, Sullivan Chime chịrị Enugwu Steeti malite n'afọ 2007 ruo afọ 2015
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

O kwuru na ọ bụ ihe mwute nye ya maka na o chere na ndị o nyefere ọchịchị ga-emecha ya.

Ụfọdụ ha gụnyere ụlọ oriri na ọṅụṅụ Presidential Hotel, ụlọọgwụ Diagnostic Center na ogige International Conference Centre.

Tupu ọ bụrụ Gọvanọ, Sullivan Chime dịka onye ọkaiwu, rụrụ ọrụ dịka kọmịshọna na-ahụ maka ikpe n'Enugwu steeti.

Ebe foto si, Sullivan Chime/Facebook

Nkọwa foto, Tupu ọ bụrụ Gọvanọ, Sullivan Chime dịka onye ọkaiwu, rụrụ ọrụ dịka kọmịshọna na-ahụ maka ikpe n'Enugwu steeti.

Onye bụ Sullivan Chime?

Sullivan Chime na ụmụ ya anọ n'afọ 2005

Ebe foto si, Sullivan Chime

Nkọwa foto, Sullivan Chime na ụmụ ya anọ n'afọ 2005
  • Sullivan Chime na ụmụ ya anọ n'afọ 2005.
  • Ọ bụ Chimaroke Nnamani nyerefere ya ọchịchị n'afọ 2007.
  • Ọ bụ onye okpuruọchịchị Udi dị n'Enugwu Steeti.
  • Tupu ọ bụrụ Gọvanọ, Sullivan Chime dịka onye ọkaiwu, rụrụ ọrụ dịka onye ndụmọdụ puruiche nakwa kọmịshọna na-ahụ maka ikpe n'Enugwu steeti.
  • Ọchịchị Sullivan Chime bụ nke ọtụ kwuru na o nwetara ezi mmepe n'Enugwu.
Sullivan Chime na ụmụ ya anọ n'afọ 2005

Ebe foto si, Sullivan Chime

Nkọwa foto, Sullivan Chime na ụmụ ya anọ n'afọ 2005
  • E nwere ọtụtụ okwu banyere esemokwu dapụtara n'etiti ya na ndị nwunye ya bụ Ifeyinwa Esther na Clara Chibuzor; oge ọ nọ n'ọchịchị, Ọ mụrụ ụmụ ise ma nwe ụmụụmụ 12.
  • Ụfọdụ ọrụ ọchịchị ya rụrụ gụnyere inweta ụgbọala Coal City Shuttle, ụgbọala Coal City Taxi, ịrụgharị ogige Polo Park, ịrụgharị ụzọ Akwata, ịrụ ọtụtụ okporoụzọ, ịrụ ogige Sekteret ọhụrụ, ụlọọgwụ Diagnostic Center nakwa ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ.
  • Sullivan Chime nyere ọchịchị n'aka Ifeanyi Lawrence Ugwuanyi n'ọnwa Mee 2015.