Mahadum Unizik achụọla nwataakwụkwọ lụsoro onye nkụzi ọgụ

Ebe foto si, Chukwudi Okoye
Ụlọakwukwọ Mahadum Nnamdi Azikiwe (UNIZIK) achụọla Goddy-Mbakwe Chiamaka Precious bụ nwataakwụkwọ nọ n'ogogo atọ (300-level) nke ngalaba ihe ọmụmụ History and International Studies lụsoro onye nkụzi aha ya bụ Chukwudi Okoye ọgụ.
Ozi si n'aka onyeisi mgbasaozi mahadum ahụ bụ Njelita Louis kwuru na onyeisi mahadum ahụ bụ Ọkankụzị Joseph Ikechebelu kwadoro mkpebi otu kọmitii e hiwere ka ha mee nnyocha maka ihe kpatara ọgụ ahụ.

Ebe foto si, Nnamdi Azikiwe University
Njelita Louis gara n'ihu kwuo na nnyocha e mere gosiri na agwa nwataakwụkwọ ahụ bụ ihe jọgburu onwe ya ma megịde mpaghara iwu na-elekọta agwa ụmụakwụkwọ a kpọrọ "Students Disciplinary Regulations (SDR)" nke ụlọakwụkwọ ahụ.
O kwuru na ọchụchụ a chụrụ nwataakwụkwọ ahụ ga-amalite ozugbo ma gwa ya pụọ n'ogige ụlọakwụkwọ ahụ ma weghachite ngwongwo ụlọakwụkwọ niile o ji.
Ihe e kwesịrị ime nwatakawụkwọ anyị lụsoro onye nkụzi ọgụ - HOD
Onyeisi ngalaba History and International studies na mahadum Nnamdi Azikiwe University Awka dị n'Anambra steeti bụ Ikenna Odife ekwuola okwu banyere akụkọ nwataakwụkwọ ahụ lụsoro onye nkụzi mahadum ahụ ọgụ ma taa ya arụ n'aka.
N'ihe onyonyo gbara n'anwụ na soshal midia, Ikenna Odife katọrọ ajọ agwa nwataakwụkwọ ahụ kpasoro onye nkụzi ahụ bụ Chukwudi Okoye ma kpọọ oku ka e nyochaa ụbụrụ nwataakwụkwọ ahụ iji chọpụta ka isi adịkwa ya mma.
O kwukwara ka eme nnyocha iji mara ọnọdụ nwataakwụkwọ ahụ toro na ya, ezinaụlọ ya nakwa ihe ndị ọzọ banyere ya.
Ikenna Odife gara n'ihu kpọọ oku ka e mee nnyocha n'ụzọ kwụrụ ọtọ ma chọpụta ihe niile e kwesịrị ịchọpụta banyere agwa nwataakwụkwọ ahụ aha ya bụ Precious Chiamaka Mbakwe.
Ihe onye nkuzi mahadum Unizik gwara BBC maka ọgụ nwata akwụkwọ lụsoro ya

Ebe foto si, Chukwudi Okoye
Ndị isi Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka etinyela ọnụ n'okwu nwaada Chiamaka Precious Mbakwe a sị lụsọrọ onye nkụzi Mahadum ahụ bụ Chukwudi Okoye ọgụ maka na nwaada a sị na onye nkụzi ahụ (Chukwudi Okoye) megharịrị ya anya mgbe ọ na-esete ihe onyonyoo.
Kedụ ihe Mahadum Unizik kwuru?
- Anyị anụla maka ihe mere na Mahadum anyị gbasara okwu nwaada Chiamaka Precious Mbakwe bụ nwataakwụkwọ na-amụ maka Ntọala na mmekọrịta mba na mba nakwa Dọkịnta Chukwudi Okoye bụ onye nkụzi na ngalaba na-amụ maka ime ejije na ihe onyonyoo.
- Ya bụ akụkọ gbara na soshịal midịa bụkwa okwu anyị kpọrọ ihe dị mkpa.
- Onyeisi Mahadum anyị bụ Ọkammụta Joseph I. Ikechebelu ekwuola ka a malite nnyocha banyere ihe mere.
- Ka onye ọbụla nwere mmasị n'okwu a dere juu ka anyị rụọ ọrụ anyị n'uju.
Kedụ ihe ndị uweojii Anambra kwuru?
Ndị uweojii Anambara steeti kwuru na ha amabeghị ihe ọbụla banyere akụkọ na otu nwatakwụkwọ nwaanyị mahadum Nnamdi Azikiwe University, Ọka, Anambara steeti a ma dịka 'Unizik' tiri onyenkuzi mahadum ahụ ihe.
Akụkọ kwuru na nwataakwụkwọ mahadum ahụ bụ Chiamaka Precious Mbakwe tiri onyenkuzi mahadum bụ Chukwudi Okoye ihe, taa ya arụ ma dọka akwa ya n'ihi ihe onyonyo egwu.
Ihe ị kwesịrị ịma maka etu nwata akwụkwọ jiri maa onyenkuzi mahadum ụra n'ihi ihe onyonyo egwu

Ebe foto si, Chukwudi Okoye
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia ụbọchị Tuzde gosiri ka gidigidi daara n'etiti Okoye na-akụzi na ngalaba 'Theatre Arts' na Chiamaka na-agụ akwụkwọ na ngalaba 'History & International Studies' mahadum ahụ ..
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na Chiamaka na-agba egwu ma tinye ekwentị o ji esere ya n' ebe a kpọrọ 'Faculty of Arts Foyer' n'ụtụtụ Monde' oge onyenkuzi gafetara ma kpụtụ ya aka, sị ya, " Chere ka m gaa".
Mana nwataakwakwụkwọ ahụ were iwe, sị ya, "Negọdụ, ọ kụrụ m aka."
Ọsịsa ya mere ka onye kuzi ahụ lọghachi ma gwa ya nye ya ekwentị kama nwata ahụ zọwara ekwentị ma taa onye nkuzi arụ, dọka ya dịka ọ jụwara isi inyefe onyenkuzi ekwentị ahụ.

Ebe foto si, Chukwudi Okoye
Maazị Okoye gwara BBC Igbo na mkparịtaụka n'ekwentị na ya gachara kụzichara ụmụakwụkwọ ya ihe, na-apụta were zute nwatakwụkwọ ahụ ebe ọ nọchiri ụzọ na-agba egwu ma na-ese ya.
Okoye onye kwuru na "ahụtụbeghị m ya mbụ, sịrị" A kpatụrụ ya aka n'ubu , sị ya "chere ka m gafere."
" Ọ malitere okwu ọjọọ."
"Alachiri m azụ ịji mata ma ọ bụ nwata akwụkwọ m nakwa ịgwa ya ka o wepụ ebe o setara m n'ihe onyonyo."
Ya ajụ ma gaa n'ihụ na-akparị m. M chọzie ị nara ya ekwentị ahụ, ọ taa m arụ. Ihe ọ na-eme tụrụ n'anya ebe ọ dị ukwu nke mere ka jidesie ya aka ike ka ọ ghara ịgba ọsọ."
"O weere ekwentị ya nye otu enyi ya nọ nso ma malite iti m ihe, na-ama m ụrọ , dọkasịa akwa m."
Dkta Okoye onye gwara BBC Igbo na okwu ahụ gara n'aka ngalaba nchekwa mahadum ahụ kwuru na ya gara ụlọọgwụ n maka nleta ahụ ike ya ka ya bụ ihe mechara.
Kedụ ihe Precious Mbakwe kwuru?

Ebe foto si, Precious Chiamamka Mbakwe/TikTok
Oge BBC Igbo kpọrọ Precious bụ onye e kwuru nwa onyenkuzi ngalaba Ntọala na mmekọrịta mba na mba 'History and International Relations' na mahadum ahụ, ọ zaghị ekwentị ntị ya ụgbọrọ atọ BBC kpọrọ ya.
Na-esepụghị aka ekwentị ahụ kwuru na a gbanyụọla ya.
Mana anyị ka na-eche ịnụ ihe o nwere ikwu n'ọnụ ya.
Mana ozi o wepụtara na soshịal mida na-ebo ebubo na Onye nkuzi ahụ "nwụrụ m aka n'ara" ọ bụ ka ma na-azọ isi onwe ka m tara ya arụ ma dọka akwa ya."
Ndị Mahadum Unizik mechara tinye ọnụ n'okwu ka ebipụtara akụkọ ahụ.
Onye bụ Dọkịnta Chukwudi Okoye

Ebe foto si, Chukwudi Okoye/Facebook
Lee nwa nkenke ihe ndị i kwesịrị ịma maka Dọkịnta Chukwudi Okoye:
- Ezigbo aha ya bụ Michael Chukwudi Okoye
- Ọ gara ụlọakwụkwọ St. Marys Nursery And Primary School, Okokomaiko dị na Legọs ma gaakwa ụlọakwụkwọ sekọndịrị Lagos State Government College dị n'Ọj.
- Ọ gakwara Mahadum Nnamdi Azikiwe University, dị n'Ọka n'Anambra Steeti, Naịjirịa ebe o nwetara asambodo nzere Bachelọ, Masta na Dọkịnta tupu ọ malite ikuzi ime ejije na ime ihe onyoonyo (Theatre And Film Studies).
- Ọ lụọla nwaanyị.









