O nweghi ihe Nnamdi Kanu mere Sunday Igboho na-emeghi - Sịnetọ Abaribe

Aha onyonyo, O nweghi Nnamdi Kanu mere Sunday Igboho na-emeghi - Sịnetọ Abaribe
O nweghi ihe Nnamdi Kanu mere Sunday Igboho na-emeghi - Sịnetọ Abaribe

Onye Sịnetọ na-anọchiteanya Abia Saụt n'ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Enyinnaya Abaribe etinyela ọnụ na mkpọrọ mkpụrụọka ụlọikpe Naịjirịa tụrụ Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB).

Sịnetọ Enyinnaya kwuru nke a mgbe ọ na-agwa BBC Igbo okwu ma sị na o nweghi ihe ọbụla Nnamdi Kanu mere ogbo ya nke mpaghara ndịda anyanwụ bụ Sunday Igboho na-emeghi.

Nnamdi Kanu yi uwe akwaete na okpu agọrọ

Ebe foto si, Getty Images

N'okwu ya "ọ dịghị mma na mmadụ abụọ ga-eme otu ihe, a kpọrọ otu onye kpọchie ma tọhapụ onye nke ọzọ."

Ọ gara n'ihu kwuo na-agbanyeghi mkpọrọ a tụrụ Kanu, na ha bụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na-agba mbọ ịhụ na a tọhapụrụ ya.

O kwuru na nkata ha na-akpa banyere ya bụ ihe ime ụlọ na-abụghị ama a na-agba n'ezi.

Kirie ihe o kwuru n'uju;