Nnamdi Kanu ga-anọrịrị n'ụlọmkpọrọ Sokoto Steeti - Ọkaikpe James Omotosho

"N'ụbọchị Dizemba 8 ka m gwara unu ka unu gwa ndị niile ikpe a gbasara (dịka Gọọmenti Naịjirịa na ụlọọrụ mkpọrọ bụ Nigeria Correctional Service) ka ha mara maka ekpere a." Ọkaikpe Omotosho.
"O nweghị ihe gosiri na e mere etu m ji kwuo," Ọkaikpe Omotosho. "N'ihi nke a akwụkwọ ikpe Nnamdi Kanu a enweghi enweghi ikike ziri ezi"
Ya mere o jiri kagbuo ya.

Ihe mere m jiri wepụ aka n'ikpe Nnamdi Kanu - Demdoo Asan

Lee ihe ndị Demdoo Asan sị mere o jiri wepụ aka ya n'ikpe Nnamdi Kanu
- Ndị ikwu Nnamdi Kanu abịaghị dee binye aka n'akwụkwọ iji kwalite ikpe ya.
- Nnamdi Kanu chọrọ iji aka ya ede ikpe ya o kpọkuru Order 50 rule 1 iwepụ aka ya n'ikpe Nnamdi Kanu. Ọ kọwarala ọkaikpe na iwu ha n'ụlọọrụ Legal Aid bụ ịnụ ikpe ma ji aka ha lebara ya anya etu ha chere na o kwesịrị ịga.
Ọkaikpe Omotosho nabatara nsepụaka Demdoo Asan na Legal Aid n'okwu Nnamdi Kanu.
Mana onye ndụ Ipob bụ Nnamdi Kanu n'onwe ya abịaghị ụlọikpe maka ikpe a taa.

Nnamdi Kanu na-agaghachi n'ụlọikpe maka ikpe a mara ya, ọ na-aga ime gịnị?
Onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ga-aga n'ụlọikpe n'ụbọchị Tuzde 27 Jenụwarị, 2026 dịka a ga-amalite ileba anya n'akwụkwọ o tinyere ka a kpọgaa ya ya n'ụlọmkpọrọ ọzọ.
Na Dizemba 8 2025 ka ọ gara n'ụlọikpe ma rịọ ka ụlọikpe si na Sokoto kpọgaa ya n'ụlọmkpọrọ dị n'Abuja maọbụ Nasarawa steeti.
Kanụ rịọrọ arịrịọ a site n'ọnụ onye nnọchiteanya ya bụ Demdoo Asian, nke otu Legal Aid Council.
N'oge gara aga ka Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor gwara BBC na ha ga-aga ụlọikpe mkpegharị ikpe iji gbaghaa ikpe a mara onyendu Ipob ma tụọ ya nga mkpụrụ ọka.
Cheta na ọ bụ n'ubọchị 20 Nọvemba, 2025 ka Ọkaikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abụja mara Nnamdi Kanu Ikpe ma tụọ ya nga n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto.
End of Gụọ maka ikpe Nnamdi Kanu na ihe ndị so ya
BBC Igbo nọ n'ụlọikpe iwetere unu ka akụkọ a si aga




























