Nnamdi Kanu ga-anọrịrị n'ụlọmkpọrọ Sokoto Steeti - Ọkaikpe James Omotosho

Nnamdi Kanu yi efe ọcha mana nwanne ya nwoke bụ Emmanuel Kanu yi efe isiagụ, ha abụọ kwụ ọtọ n'ụlọikpe Ukwuu dị n'Abuja
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

"N'ụbọchị Dizemba 8 ka m gwara unu ka unu gwa ndị niile ikpe a gbasara (dịka Gọọmenti Naịjirịa na ụlọọrụ mkpọrọ bụ Nigeria Correctional Service) ka ha mara maka ekpere a." Ọkaikpe Omotosho.

"O nweghị ihe gosiri na e mere etu m ji kwuo," Ọkaikpe Omotosho. "N'ihi nke a akwụkwọ ikpe Nnamdi Kanu a enweghi enweghi ikike ziri ezi"

Ya mere o jiri kagbuo ya.

Nnamdi Kanu na-agaghachị n'ụlọikpe maka ikpe a mara ya, ọ na-aga ime gịnị?
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na-agaghachị n'ụlọikpe maka ikpe a mara ya, ọ na-aga ime gịnị?

Ihe mere m jiri wepụ aka n'ikpe Nnamdi Kanu - Demdoo Asan

Demdoo Asan esepụla aka n'ikpe Nnamdi Kanu. Ọ bụ ya bu akpa anụnụ
Nkọwa foto, Demdoo Asan esepụla aka n'ikpe Nnamdi Kanu. Ọ bụ ya bu akpa anụnụ

Lee ihe ndị Demdoo Asan sị mere o jiri wepụ aka ya n'ikpe Nnamdi Kanu

  • Ndị ikwu Nnamdi Kanu abịaghị dee binye aka n'akwụkwọ iji kwalite ikpe ya.
  • Nnamdi Kanu chọrọ iji aka ya ede ikpe ya o kpọkuru Order 50 rule 1 iwepụ aka ya n'ikpe Nnamdi Kanu. Ọ kọwarala ọkaikpe na iwu ha n'ụlọọrụ Legal Aid bụ ịnụ ikpe ma ji aka ha lebara ya anya etu ha chere na o kwesịrị ịga.

Ọkaikpe Omotosho nabatara nsepụaka Demdoo Asan na Legal Aid n'okwu Nnamdi Kanu.

Mana onye ndụ Ipob bụ Nnamdi Kanu n'onwe ya abịaghị ụlọikpe maka ikpe a taa.

Ụlọikpe ka Ọkaikpe Omotosho kagburu arịrịọ ya igbanwe ụlọmkpọrọ ebe Kanu nọ
Nkọwa foto, Ụlọikpe ka Ọkaikpe Omotosho kagburu arịrịọ ya igbanwe ụlọmkpọrọ ebe Kanu nọ

Nnamdi Kanu na-agaghachi n'ụlọikpe maka ikpe a mara ya, ọ na-aga ime gịnị?

Onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ga-aga n'ụlọikpe n'ụbọchị Tuzde 27 Jenụwarị, 2026 dịka a ga-amalite ileba anya n'akwụkwọ o tinyere ka a kpọgaa ya ya n'ụlọmkpọrọ ọzọ.

Kanụ rịọrọ arịrịọ a site n'ọnụ onye nnọchiteanya ya bụ Demdoo Asian, nke otu Legal Aid Council.

N'oge gara aga ka Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor gwara BBC na ha ga-aga ụlọikpe mkpegharị ikpe iji gbaghaa ikpe a mara onyendu Ipob ma tụọ ya nga mkpụrụ ọka.

Cheta na ọ bụ n'ubọchị 20 Nọvemba, 2025 ka Ọkaikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abụja mara Nnamdi Kanu Ikpe ma tụọ ya nga n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto.

BBC Igbo nọ n'ụlọikpe iwetere unu ka akụkọ a si aga