Etu ụfọdụ ndị a ama ama siri kọwaa ndụ Sịnetọ Ifeanyi Ubah

Aha onyonyo, Ọtụtụ ndị a ma ama, ndị omeiwu nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu juputara Nnewi iji kwanyere Sinetọ Ifeanyi Ubah ugwu ikpeazụ.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Akụkọ ndị ọzọ yiri ya.

Adọnyela ozu Ifeanyi Ubah n'ime ala

Oliliozu Ifeanyi Ubah

Akụkọ si Nnewi apụta ugbua na-ekwu na adọnyela Sinetọ Ifeanyi Ubah nwụrụ n'ime ala na be ya n'Anambra steeti.

Nke a pụtara na mmemme oliliozu ya abịala na njedebe ugbua.

Ihe ga na-emezi bụ mmemme nnabata ndị ọgọ na ndị enyi na-abịara ezinaụlọ ya ụlọ akwa n'abalị olemaole ndị na-abịa.

Ozu Ifeanyi Ubah
Nkọwa foto, Ụgbọala bụ ozu Ifeanyi Ubah

Oliliozu Sinetọ Ifeanyi Ubah na-aga n'ihu ugbua n'obodo ya dị n'Otolo Nnewi dị n'Anambra steeti.

Ọtụtụndị a ma ama, ndị omeiwu nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu juputara Nnewi iji kwanyere Sinetọ Ifeanyi Ubah ugwu ikpeazụ.

Cheta na Sịnetọ Ifeanyi Ubah bụ Sinetọ na-anọchiteanya Anambra Saụt n'ụlọ omeiwu Sinet Naịjirịa, nwụrụ n'ọnwa Julaị, 2024 ka ọ gbara afọ 52.

Etu e si kaara Sịnetọ Ifeanyi Ubah ụka ikpeazụ na Legọs

Ezinaụlọ Sịnetọ Ifeanyị Ubah na ndị ụkọ ụkọchuwku oge a kaara ya ụka ikpeazụ n'ụlọụka Asumption dị na Falọmọ, Ikoyi, Legọs
Nkọwa foto, Ezinaụlọ Sịnetọ Ifeanyị Ubah na ndị ụkọ ụkọchuwku oge a kaara ya ụka ikpeazụ n'ụlọụka Asumption dị na Falọmọ, Ikoyi, Legọs

Ezinaụlọ, ndị enyi na ikwu na ibe Sịnetọ Ifeanyị Ubah kaara ya ụka ikpeazụ ụbọchị Fraịde Nọvemba 15, 2024 n'ụlọụka Catholic Church of the Asumption dị na Falọmọ, Ikoyi, Legọs.

Ndị bịara ụka ikpeazụ a kara ya na Legọs gụnyere Gọvanọ Dapo Abiodun na-achị Ogun Steeti, onye bụbu onyeisi Nigeria Football Federation (NFF) bụ Amaju Melvin Pinnick, onye bụbu ọnụ na-ekwuru pati PDP bụ Olisa Metu, onyeisi ụlọọrụ Airpeace bụ Allen Onyema, ọtụtụ ndị omeiwu nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa.

Ifeanyi Ubah bụ Sinetọ na-anọchiteanya Anambra Saụt n'ụlọ omeiwu Sinet Naịjirịa bụ nwụrụ ụbọchị Satọde 27 Julaị, 2024 ka ọ gbara afọ 52.

A ga-eli Sinetọ Ifeanyi Ubah n'obi ya dị n'Umuanuka Otolo Nnewi, Anambra steeti ụbọchị Fraịde 22 Nọvemba, 2024.

Ezinaụlọ Sịnetọ Ifeanyị Ubah oge a kaara ya ụka ikpeazụ n'ụlọụka Asumption dị na Falọmọ, Ikoyi, Legọs
Nkọwa foto, Ezinaụlọ Sịnetọ Ifeanyị Ubah oge a kaara ya ụka ikpeazụ n'ụlọụka Asumption dị na Falọmọ, Ikoyi, Legọs

Ihe Peter Obi, Orji Uzor Kalu na ndịọzọ kwuru maka ọnwụ Ifeanyi Ubah

Ifeanyi Ubah, Peter Obi, Orji Uzor Kalu

Ebe foto si, OUKTweets/X/Patrick Ifeanyi Ubah/Facebook/BBC

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọ omeiwu Sịneti Naịjirịa akọwaala onye otu ha nwụrụ bụ Sịnetọ Ifeanyi Ubah dịka ezi onye ndu chọrọ ọdimma .

Ozi onye na-ekwuchitere ụlọ omeiwu ahụ bu Sịnetọ Yemi Adaramodu wepụtara, kọwara Sịnetọ Ifeanyi Ubah dịka ezi nwa amaala nwetara ezi nnọchiteanya nye ndị Anambra Saụt ma bụrụkwa onye gbara mbọ inyere ndị ihe ụwa na-atụ n’ọnụ aka.

O kwuru na ọnwụ Ifeanyi Ubah bụ oke ihe mmetuta nye ụlọ omeiwu Naịjirịa niile.

Na’aka nke ọzọ, onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntụliaka 2023 bụ Peter Obi kọwara ọnwụ Ifeanyi Ubah dịka nke gbawara ya obi.

N’ozi Peter Obi wepụtara n’akara soshal midia X kwuru na ya na Ifeanyi Ubah nwere mkparitauka n’izu gara aga banyere ijikọ aka dozie obodo Naịjirịa.

O Kwuru na na ọnwụ Ifeanyi Ubah bụ nnukwu ọdachi dakwasiri ndị Anambra, ala igbo nakwa Naịjirịa. Ọ rịọrịọ ka chukwu kasie ezinaụlọ ya obi n’ọnọdụ iri uju a.

Sịneto na-anọchiteanya Abia North n’ụlọ omeiwu Naịjirịa bụ Orji Uzor Kalu kwuru na ọnwụ Ifeanyi Ubah kụwụrụ ya ahụ.

Ọ rịọrịọ ka mkpụrụobi ya zuoike na ndokwa.

Sịnetọ Ifeanyi Ubah nwe Capital Oil anwụọla

Ifeanyi Ubah

Ebe foto si, Patrick Ifeanyi Ubah/Facebook

Sịnetọ na-anọchiteanya Anambra Saụt n'ụlọ omeiwu Sinet Naịjirịa bụ Ifeanyi Ubah anwụọla ka ọ gbara afọ 52.

Onye ezinaụlọ ya na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na Sinetọ Ifeanyi Ubah nwụrụ na London.

Ifeanyi Ubah bụ onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti n'otu pati All Progressive Congress, APC na ntụliaka a ga-eme n'afọ 2025.

O so na ndị na-akpọ oku ka gọọmeti etiti tọhapụ Mazi Nnmadi Kanu mana ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ ya na-ekwu na aka ya dị na nwuchi a wuchiri Nnamdi Kanu.

N'ọnwa Septemba 2022, ndị oji egbe wakporo ụgbọala Ifeanyi Ubah ma gbuo mmadụ ise ndị ọrụ ya na mpaghara Nkwo Enugwu-ukwu dị n'okpuruọchịchị Njikoka.

Ụlọ omeiwu Sinet ekwubeghị ihe ọbụla banyere ọnwụ Sịnetọ Ifeanyi Ubah.

Ihe ị kwesiri ịma maka Ifeanyi Ubah

  • Ifeanyi Uba bụ onye ji ego achụnta ego ejiri ụlọọrụ Capital Oil mara.
  • A mụrụ ya na Septemba n'afọ 1971 dịka ọkpara n'ime ụmụ asaa nna na nna ya bụ Alphonsus Ubah mụrụ.
  • Ọ lụọla nwaanyị ma mụọ ụmụ ise.
  • Ọ bụ onye Otolo, obodo obere dị n'Anambra Steeti.
  • Ọ gụtụrụ akwụkwọ na Premier Academy Lugbe dị n'Abuja mana ọ gụchaghị makana nne na nna ya enweghị ego iji zụọ ya.
  • Mana ọ gara ọzụzụ dị icheiche n'azụmaahịa na ọchịchị.
  • Ifeanyi bidoro ụlọọrụ 'Capital Oil' n'afọ 2001.
  • Ọ bụkwa ya nwe Ifeanyi Ubah F.C. , nke na-azabụ Gabros International Footbal Club bụ nke so na-egwu bọọlụ Premiere league Naịjirịa.
  • Ifeanyi Ubah zọburu ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti n'afọ 2014 n'aha Labour Pati.
  • N'afọ 2019 Ubah so zọọ ọkwa Sinate maka ịnọchite anya Anambra South Senitorial zone n'aha Young Democratic Party (YPP).
  • Inec kpọpụtara ya dịka onye meriri ya bụ ntulika 2019 maka ịnọchite anya ndị ọgbọnta vootu ha.