Lee etu oliliozu Ogbonnaya Onu si aga n'Ebonyi Steeti

Ọtụtụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu na Naịjirịa anwụchiela n’Ebonyi steeti maka oliliozu onye bụbụ Minista Sayensị na Teknuzu bụ Ogbonnaya Onu lara mmụọ.
Ndị bịara oliliozu ya gụnyere Gọvanọ Peter Mbah na-achị Enugwu steeti, Gọvanọ Alex Otti na-achị Abia steeti, mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Dave Umahi, onyeisioche pati APC bụ Abdullahi Umar Ganduje na ọtụtụ ndị ọzọ.
Ogbonnaya Onu, onye bụbụ Gọvanọ uwe agbada mbụ nke Abia steeti nwụrụ ụbọchị Tọzde 11 Eprel 2024 n'ụlọọgwụ Abuja dịka ọ rịachara ọrịa obere oge.
Ogbonnaya Onu bụ nwoke nwere ugwu- Ohaneze

Ebe foto si, Ogbonnaya Onu/Facebook
Otu Ohaneze Ndigbo esonyela na ndị na--atụ arịrị maka ọnwụ onye bụbụ Minista Sayensị na Teknuzu bụ Ogbonnaya Onu.
Onu, onye bụbụ Gọvanọ uwe agbada mbụ nke Abia steeti nwụrụ ụbọchị Tọzde n'ụlọọgwụ Abuja dịka ọ rịachara ọrịa obere oge.
Onyeisi otu Ohaneze bụ Ichie Emmanuel Iwuanyanwu kwuru na ọnwụ Onu bụ "ihe mgbawa obi", dịka ọ na-eso ọnwụ ndị Igbo nwere agba gụnyere; George Obiozor, Joe Irukwu, U. K. Kalu, Ben Nwabueze, Sylvanus Ebigwei, Chike Edozien, Herbert Wigwe, na Chukwuemeka Ezeife, na nso nso a.
Iwuanyanwu, onye kwuru nke a n'ozi nke ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnaya binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide kọwara Onu dịka onye nwere ugwu ma kwụwa aka ya ọtọ.
"O so n' otu n'ime ụmụ Naijiria kachasị akwụba aka ha ọtọ, jụ arịrịọ nile a rịọrọ ya ka ọ banye n'otu PDP nọ n'ọchịchị, kwesịrị ịnọ na pati anọghị na gọọmentị afọ 16 PDP nọrọ n'ọchịchị."

Ebe foto si, Peter Obi, Ogbonnaya Onu, Alex Otti/Facebook/Instagram
Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu na Peter Obi zọburu ọkwa onyeisiala nakwa ndị ọzọ ebeela akwa arịrị maka onwu Ogbonnaya Onu.
Ogbonnaya Onu bubu mịnịsta nke sayensị na teknizu bịdọ na afọ 2015 ruo na afọ 2022 na ọchịchị Mohammadu Buhari. Tupuu ọ bụrụ Mịnịsta, Onu bụ Gọvanọ nke mbu na Abia Steet bịdọ na afọ 11992 ruo na afọ 1993.
Ịhe Tinunu kwuru maka Onu
Onyeisiala Naịjirịa, Bola Tinubu bere akwa arịrị maka onwu Ogbonnaya Onu.
Na akwụkwọ ọzị nke onye ndumodu onyeịsịala pụruịche na mgbasa ozi bụ Ajuri Ngelale nweputara, ọ kọwara Ogbonnaya Onu dịka nwoke mara ịhe ekwe na aku na nka n’ uzu.
Ọ kasịrị ezịnaụlọ Onu obi ma tie ha aka n’ obi.
Ọ kọwara Ogbonnaya Onu dịka nwoke na akwado Naịjirịa ịdị na otu, nakwa onye udo.
Ihe Peter Obi Kwuru maka Onu

Ebe foto si, Peter Obi/Facebook
Peter Obi bubu onye zọrọ onyeisiala Naịjirịa na ntụlịaka emere na ịkpeazu kọwara onwu Ogbonnaya Onu dịka ịhe ngbawa obi.
O kwuru na onwu Onu bu ịhe unukwu ihe funarịri Naịjirịa, ọkachasị ndi Ịgbo.
Obi kowara Onu dịka nwoke na adịghị akpa oke ma too mbọ nile ọgbara na ngara agụmuakwụkwọ nakwa nka n’ ụzụ.
Ihe Kalu kwuru maka Ogbonnaya Onu

Ebe foto si, Orji Uzo Kalu
Gọvanọ chịburu Abịa steetị bụ Orji Uzor Kalu sọ na ndị amaara amara na Naịjirịa kwuru okwu maka onwu Ogbonnaya Onu.
Kalu kọwara Onu dịka onye na achọ udo nakwa agamunihu Naịjirịa.
Kalu kwuru na Onu bụ onye na enyere ndị mmadu aka ma kwuo na onwu ya ga emetuta onye obula.
Ndị bere akwa arịrị maka onwu Ogbonnaya Onu dị ka aja dị na ala mana otu ịhe ha nile na arutuaka bu na Ogbonnaya bu onye na achọ udo ma burukwa onye na achọ ọganịrụ Naịjirịa
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka Ogbonnaya Onu

Ebe foto si, Ogbonnaya Onu/Instagram
Onye bụbu Mịnịsta Sayensi na Nkanụụzụ bụ Maazị Ogbonnaya Onu anwụọla dịka ọ gbachara afọ 72.
Ọ bụ n'otu ụlọọgwụ dị n'Abuja ka ọ nọọrọ nwụọ.
Otu onye ọkwa ya gbagotere na pati APC n'ogogo etiti na-achọghị ka akpọọ aha ya kwuru na "ọ bụ eziokwu na Maazi Ogbonnaya Onu anwụọla mana ọ bụ ezinaụlọ ya ka ọ dịịrị ikwupụta banyere ya."
Ogbonnaya Onu bụụrụ aka chịrị Abia Steeti ma bụrụkwa Mịnịsta Sayensị na Nkanụụzụ n'okpuru ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari.

Ebe foto si, OGBONNAYA ONU/INSTAGRAM
- A mụrụ Ogbonnaya Onu n’abalị mbụ nke ọnwa Dizemba, afọ 1951 n’ezinaụlọ Eze David Aba Onu n’Amata Uburu okpuruọchịchị Ohaozara nke Ebonyi Steeti.
- Ọ gara akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ Izzi High School Abakaliki bụ ebe ọ nọọrọ nweta nzere ‘distinction’ n’ule WAEC.
- O lekwara ule ‘High School Examination’ n’ụlọakwụkwọ College of Immaculate Conception Enugu bụ ebe ọ nọọrọ turu ugo dịka nwataakwụkwọ kachasị mee nke ọma.
- Onu nwetara akara nzere ‘first class’ n’ihe ọmụmụ Chemical Engineering n’afọ 1976 na ‘University of Lagos’.
- N’afọ 1980, ọ gara ‘University of California’ ebe ọ nọọrọ nweta nzere PhD na ngalaba ihe ọmụmụ Chemical Engineering na-ebughị ụzọ nweta nzere ‘Masters’.
- Ọ bụụrụ onyeisi ngalaba ihe ọmụmụ Chemical Engineering na Mahadum ‘University of Port Harcourt’ nke Rivas Steeti.
- A họpụtara Ogbonnaya Onu dịka gọvanọ Abia Steeti mbụ n’afọ 1991 dịka ọ bụkwaara onyeisioche mbụ nke otu jikọtara ndị gọvanọ Naịjirịa.
- Ọ bụ ya hụrụ maka nhiwe Abia Technology Village, College of Technical Education Arochukwu, Michael Okpara Federal University of Agriculture Umudike nakwa Abia Steeti Polytechnic.
- Ogbonnaya Onu gakwara ozi dịka onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Nigerian Peoples Party (ANPP) nke adịghizi ugbua bụ ebe ọ nọọrọ nweta mmeri iji aha pati ahụ zọọ ọkwa onyeisiala n’afọ 1999.
- Ọ nọgidere na pati ANPP ruo mgbe ejikọrọ ya na CPC na ACN iji hiwe APC.
- Onyeisiala Naịjirịa pụrụ apụ bụ Mụhammadu Buhari họpụtara ya dịka Minịsta Sayensi na Nkanụụzụ n’afọ 2019.

Ebe foto si, OGBONNAYA ONU/INSTAGRAM











