Rotimi Akeredolu: Etu ụka olili ya na njem ikpeazụ ya si aga

Njem ikpeazụ na ụka olili

Ndị ezinaụlọ, ndị enyi nakwa ndị a ma ama juputara n'ụlọụka St. Andrews Cathedral dị n'Owo dịka a na-aka ụka olili Rotimi Akeredolu bụbu Gọvanọ Ondo steeti.

Onye ntaakụkọ nọ n'ụlọụka ahụ kwuru na ndị mmadụ kwụrụ ụtọ nsọpụrụ mgbe akpatị bu ozu Akeredolu batara n'ime ụlọụka.

Osote onyeisiala bụ Kashim Shettima bịara ya bụ mmemme dịka onye nọchiri anya 'Aketi' bụ Lucky Aiyedatiwa duru ndị Gọvanọ ibe ya na ya bụ ụka olili.

Lee foto ezinaụlọ ya na ndị isi a hụrụ kwaba okpu bịara ifere ya aka na njem ikpeazụ ya.

Njem ikpeazụ na ụka olili
Njem ikpeazụ na ụka olili
Njem ikpeazụ na ụka olili
Njem ikpeazụ na ụka olili
Njem ikpeazụ na ụka olili

Rotimi Akeredolu: Etu Akure si kwụrụ jụụ dịka akwanyere ya ugwu ikpeazụ

Akwamozu Akeredolu

Ebe foto si, BBC/Akeredolu Rotimi

Nkọwa foto, Rotimi Akeredolu nwụrụ n'ọnwa Disemba afọ 2023.

Ndị mmadụ ji anya mmiri nuputasia n'okporoụzọ Akure dịka ozu aka na-achịbu steeti ahụ bụ Rotimi Akeredolu batara.

E ji ugwu niile a na-akwanyere ọchị agha were nabata ya dịka ndị mmadụ pụtara ikele onye bụbu Gọvanọ ha ekele ikpeazụ ya.

N'ụbọchị Wenzde, ndị Ọkaiwu ibe ya meere ya mmemme ụlọikpe dịka e si emere ndị ọkaiwu kachasị na Naịjirịa akpọrọ SAN.

Ọtụtụ ndị bụ isi ahụrụ kwaba okpu pụtara soro kwanyere Akeredolu a ma dịka Aketi ugwu ikpeazụ.

A ga-etinyezi ya n'ime ala n'ụbọchị Fraịde n'obodo ya bụ Owo, dị n'Ondo steeti.

Lee ka o si ga ebe a.

Akwamozu Akeredolu
Akwamozu Akeredolu
Akwamozu Akeredolu
Akwamozu Akeredolu

Akwa arịrị na oke iru uju adaala ka ozu Akeredolu larutere Naịjirịa

Nwunye gọvanọ

Ebe foto si, OLABODE RICHARD OLATUNDE

Ozu aka chịburu Ondo Steeti bụ Oluwarotimi Akeredolu alarutela Naịjirịa.

Ụgbọelu bulatara ozu ya gbara ụkwụ n'ala oge o ji ọkara gafee elekere atọ nke ehihie n'abalị ise ọnwa Jenuwarị afọ 2024.

E siri mba Jamini ebe ọ nọrọ nwụọ bulata ozu ya.

Nwunye ya bụ Betty Anyanwu-Akeredolu, ụmụ ya na ụmụnne ya gara zute ozu ya n'ọdọ ụgbọelu.

Ozu Akeredolu

Ebe foto si, OLABODE RICHARD OLATUNDE

Ndị ọzọ gakwara zute ozu ya gụnyere aka na-achị Legọs Steeti bụ Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke onyeisi ndị ọrụ ya bụ Tayo Ayinde nọchitere, aka na-achị Ogun Steeti bụ Dapo Abiodun nke onye odeakwụkwọ gọọmentị steeti ya bụ Tokunbo Talabi nọchitekwara na ndị ọzọ.

Oke akwa arịrị na iru uju jupụtara n'ọdọụgbọelu ahụ oge e buturu ozu ya n'ụgbọelu.

Cheta na ya bụ aka chịrị Ondo Steeti bụ Akeredolu nwụrụ n'abalị 26 ọnwa Disemba afọ 2023 na mba Jamini. A ga-ebula ozu ya n'ụlọ ozu ruo mgbe a ga-akwa ya.

Ọnwụ Akeredolu bụ ihe mwute nye ndị Igbo- Ohaneze

Rotimi Akeredolu

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu/Facebook

Otu Ohaneze Ndigbo esonyela be akwa arịrị maka ọnwụ aka chịrị Ondo Steeti bụ Rotimi Akeredolu.

N' ozi ha zịpụtara nke ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Alex Ogbonnia binyere aka, ha kọwara na Akeredolu bụ oke ọgọ na ọkpara ndị Igbo, maka alụmdi na nwunye ya na nwaada Betty Anyanwu Akeredolu bụ onye Owere,Imo steeti,nke mere ha jiri ahụta ya dịka nwafo Igbo.

Ohaneze kwuru na Akeredolu bụ ezigbo onyendu Ondo steeti na ezigbo nwafo Naịjirịa, na "ọnwụ Akeredolu bụ ihe nwute nyere ndịgbo nakwa Naịjirịa niile".

Ihe Tinubu, Soludo, ndị ọzọ kwuru maka Akeredolu

Bola Tinubu na Rotimi Akeredolu

Ebe foto si, Bola Onanuga/Twitter

Onyeisiala Bola Tinubu, gọvanọ Anambra steeti bụ Charles Soludo na ndị ọzọ nwere agba ezipụtala ozi iti aka n'obi na ekele maka ọnwụ aka chịrị Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu.

Tinubu kwuru na Akeredolu bụ "nwa m nwoke , onye anaghị atụ egwu' bụ onye o kọwara lụrụ ọgụ maka nchekwa steeti ya oge ndị ike ọchịchị wakporo ụlọụka Katolik na steeti ahụ gbuo ọtụtụ ndị gara ụka.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Aka na-achị Anambra steeti bụ Gọvanọ Charles Soludo esonyela na ndi bere akwa onwụ Gọvanọ Rotimi Akeredolu.

Soludo n’ozị o zigara maka onwụ Rotimi kwuru na ọ bụ ihe arịrị na mmadụ dịka Rotimi nwụru.

Ohanaeze ndịgbo esonyela bereakwa ọnwụ Akeredolu

Ohanaeze ndigbo esonyela beakwa ọnwụ Gọvanọ Olarotimi Akeredolu.

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu /Facebook

Nkọwa foto, Ohanaeze ndigbo esonyela beakwa ọnwụ Gọvanọ Olarotimi Akeredolu.

Ohanaeze ndigbo esonyela beakwa ọnwụ Gọvanọ Olarotimi Akeredolu.

Na ozị ha zịpụru, ha kọwara na Akeredolu bụ oke ọgọ na opara ndị igbo, maka alụm di na nwunye ya na nwaada Betty Anyanwu Akeredolu bụ onye Owerri-Imo steeti,nke mere ha jiri ahụta ya dịka nwafo Igbo.

Ohanaeze kwuru na Akeredolu bụ ezigbo onyendu Ondo steeti na ezigbo nwafo Naịjirịa, na ọnwụ Akeredolu bụ ihe nwute nyere ndịgbo nakwa Naịjirịa niile.

Charles Soludo

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook

Soludo kwuru na oke ihe funari Naịjirịa maka na Rotimi bụ "ezigbo onye ọchịchị nyere ndi Ondo steeti" ma bụrụ ezi enyi ya.

Ondo Governor: Ndị ọrụ Akeredolu anọ agbaala arụkwaghịm
Raimi Aminu na Rotimi Akeredolu

Ebe foto si, Raimi Aminu/Rotimi Akeredolu

Dịka a kpụ ọnwụ aka chịrị Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu n'ọnụ, ndị ọrụ ya mmadụ anọ gụnyere otu kọmishọna agbaala arụkwaghịm.

Akeredolu nwụrụ n'ụzọ ụtụtụ Wenezde ka ọ gbachara afọ 67 site n'ọrịa Kansa.

Kọmishọna na-ahụ maka ala na ewumewu e ji akwalite akụnaụba obodo bụ Raimi Aminu kwuru n'akwụkwọozi arụkwaghịm o tinyere taa bụ ubọchị 28 nke onwa disemba afo 2023, na nke a bụ "ịgwa mmụọ onwe" ya eziokwu dịka Akeredolu nwụchara.

Adedoyin Odebowale, onye bụ onye enyemaka Gọvanọ n’ọrụ pụrụ iche nakwa Olawale Abolade bụ onye enyemaka Gọvanọ n’ihe gbasara foto gbakwara arụkwaghịm.

Cheta na onye ndụmọdụ Gọvanọ n’ihe gbasara ọgbakọ na ọrụ ndị pụrụ iche bụ Dare Aragbaye na ọnụ na-ekwuru Gọvanọ bụ Richard Olatunde gbara arụkwaghị ụbọchị Wenezde ngwangwa ozi pụtara ihe na Akeredolu anwụọla.

Ndị ọrụ gọvanọ ondo steeti nwụrụ anwụ bụ Gọvanọ Rotimi Akeredolu agbaala ọrụ alụkwaghị m, n’ihi ọnwụ ya.

Ihe i kwesiri ịma maka Rotimi Akeredolu, gọvanọ Ondo steeti lara mmụọ
Rotimi Akeredolu

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu/Twitter

Aka na-achị Ondo steeti bụ Rotimi Odunayo Akeredolu anwụọla dịka ọ rịachara ọrịa obere oge.

Ọ bụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenzde ka akụkọ pụtara na ọ nwụrụ ebe ọ nọ anata ọgwụgwọ.

Rotimi Akeredolu

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu/Facebook

Ọ gabuola ezumike ọgwụgwọ n'afọ Juun nke ọ natara n'ọnwa Sepụtemba mana o nweghi onye hụrụ ya anya dịka ọ nọrọ n'isiobodo Oyo steeti bụ Ibadan.

Ọ bụ onye enyemaka onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga bụ onye kwuputara maka ọnwụ Akeredolu n'akara X bụbu Twitter ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Lee ihe ụfọdụ ị kwesịrị ịma maka ya:

Ezianụlọ Rotimi na Betty Akeredolu

Ebe foto si, Betty Akeredolu

  • A mụrụ Maazị Akeredolu n'ọnwa July 1956 n'Ọwọ n'Ezinaụlọ Ụkọchukwu J. Ola Akeredolu nke ezinaụlọ Akeredolu na Oriakụ Grace B. Akeredolu nke ezinaụlọ Aderoyiju Igbotu, Ese Odo, n'Ondo steeti.
  • Akeredolu bidoro agụmakwụkwọ ya his primary education at government school in Owo.
  • O mechara gaa ụlọakwụkwọ sekọndịrị Aquinas dị n'Akure, nakwa Loyola College, n'Ibadan nakwa ụlọakwụkwọ Comprehensive dị n'Ayetoro, iji gụọ nke sekọndrị ya.
  • Ọ gara Mahadum Ife bụzị Mahadum Obafemi Awolowo ịgụ 'Law' ma gụchaa n'afọ 1977.
  • O ruru ọkwa kachasị n'ọrụ ọkaiwu bụ Senior Advocate of Nigerian bụ SAN.
  • Ọ bụbu ọkaiwu kachasị nke Ondo steeti .
  • Ọ lụrụ Betty Anywanwu onye Imo steeti n'afọ 1981 ma mụta ụmụ anọ: nwoke abụo na nwaanyị abụọ.

Gọvanọ ndị nwụrụ n'ọchịchị

Cheta na kemgbe ọchịchị onyekwuouche ya lọghachịtere Naịjirịa n'afọ 1999 sọọsọ Gọvanọ abụọ anwụọla n'elu oche ọchịchị ha:

  • Aka chịburu Kaduna steeti bụ Patrick Yakowa nwụrụ n'afọ 2012 n'ihe mberede ụgbọelu na Kaduna.
  • Gọvanọ Rotimi Akeredolu abụrụ onye nke abụọ rịara ọrịa Lukemia na postrate kansa ma nwụọ n'ụbọchị 27 Dizemba 2023.

Ọnwụ Akeredolu bụ ịhe mwute – Otu Ndị Gọvanọ Naịjịrịa

Otu jịkọrọ ndị Gọvanọ Naịjịrịa a kpọrọ 'Nigeria Governors' Forum' kọwara ọnwụ Gọvanọ na achị Ondọ steetị, Olurotimi Akeredolu dịka ịhe mwute.

Onyeisioche otu ndị Gọvanọ bụ AbdulRahman AbdulRazaq nke Kwara Steeti kọwara Akeredolu dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị pụrụiche.

Okwu ya: “Ekele m sitere n’obi na-agara otu 'Progressive Governors’ Forum', Gọọmentị na ndị Ondo Steetị, otu ndị ọkaiwu Naịjịrịa (NBA), ya na ezinaụlọ nke ezigbo nwanne m na onye ọrụ ibe m bụ Olurotimi Akeredolu (SAN) nwuru anwụ.

"Ọ bu onye ọka iwu na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwere akọ na uche, a ga-echeta ya maka obi ike ya, ịhụ mba n'anya, na ntinye aka na-enweghị atụ na mmepe iwu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Naịjịrịa”.

“Dịka ọpụpụ ya na-ewute anyị niile, anyị na-enweta nkasi obi na ezi ihe omere dị ka nwa amadi na onye ọchịchị. Anyị na-arịọ Chineke ka o zuru ike ma lekọta ezinụlọ ya".

Ihe Peter Obi, Afenifere kwuru

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi

Peter Obi, onye bụbu aka na-achị steeti Anambra ma bụrụ onye zọrọ ọkwa Onyeisiala n'aha otu Labour Party, kwuru na ọnwụ Akeredolu gosiri na ọ nweghị ihe dị na ndụ a mmadu dị.

Obi kwuru ka "Chineke pụrụ ime ihe nile nke kpọrọ Akeredolu n’ụlọ nye ya ezumike ebighị ebi n’alaeze ya, nyekwa ezinaụlọ ya na ndị ezi mmadụ nke Ondo Steeti, nwee obi ike iburu ọnwụ ya."

Onye ndu otu jịkọrọ ndị Yoruba a kpọrọ Afenifere bụ Reuben Famuyide Fasoranti, kwupụtaraa ihe iju anya maka ọnwụ nke Gọvanọ Ondo steeti, Arakunrin Oluwarotimi Odunayo Akeredolu.

Afenifere kwuru na Akeredolu nọ na ndị bu okwu inwe ndịuweojii steeti n'isi Dịka o siri kọwaa, nke a mere ka Akeredolu nye aka hibe otu nchekwa n' Ọdịda Anyanwụ nke a na-akpọ, Amotekun.

Onye ga-abụ osote Gọvanọ Aiyedatiwa?

Lucky Aiyedatiwa

Ebe foto si, Lucky Aiyedatiwa

E duola Lucky Aiyedatiwa bụbụ Osote Gọvanọ iyi ọrụ dika Gọvanọ ọhụrụ Ondo Steetị n'ụlọ gọọmentị ha dị n' Alagbaka, Akure, na mgbede Wednezde.

Kemgbe Gọvanọ Olurotimi Akeredolu nwụrụ n'ụzọ ụtụtụ Wenezde, ụfọdụ na-ajụ ajụjụ sị, kedụzị onye ga abu osote Gọvanọ Lucky Aiyedatiwa dịka e duru ya iyi oru?

Onye okaiwu nakwa onye ndọrọndọrọ ochichi n' Enugwu Steetị, Peter Ajah mere nkọwa etu a ga-esị eweputa osote Gọvanọ n' Ondo steetị nakwa ihe iwu Naijịrịa kwuru maka onye nwụrụ n'ọchịchị.

Peter Ajah kwuru na iwu Naịjịria, isi nke isi nke 1999 mere ezigbo nkopwa etu aga esi weputa onye ga abu osetere Gọvanọ na oburu na gọvanọ mwu ọ dị ka Olurotimi Akeredolu.

N' okwu ya, “Ọ bụrụ na Gọvanọ nwụọ, osote ya ga-ewere oche dika Gọvanọ ma nweta onye ọzọ ga-aọ bụrụ na Aiyedatiwa bụrụ gọvanọ, ọ ga arọpụta onye ọzọ ga a bu osote ya, ebe ndị ọmeịwụ ga-anabata ya”.