Lee ụzọ na ụgbọala ndị gọọmentị belatara ego ha n'Ekeresimesi a

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Bola TInubu mara ọkwa ụbọchị Wenezde na gọọmentị ya ga-ebelata ego a ga-eji gbaa ụgbọala mee njem si otu steeti banye steeti ndị ọzọ dị icheiche n'oge Ekeresimesi a ruo pasentị 50.
TInubu kwuru na mgbubi ego a bụ iji nyere ndị mmadụ aka belata nhushi anya so n'ọnụ ego mmadụ ụgbọala na ime ka ndị mmadụ nweeike ime njem laa ụlọ ha n'Ekeresimesi a.
Dịka onyeisiala siri kwuo, mgbubi ego a ga-amalite n'abalị 21 ọnwa Disemba ruo abalị 4 ọnwa Jenuwarị 2024.
Lee ụzọ 28 ndị e belatara a ga-eji gbaa ha
Malite n'abalị 21 ọnwa Disemba afọ 2023, gọọmentị ga-ebelata ego eji agba ụzọ ndị a;
Legọs-Abuja, Legọs-Kaduna-Zaria, Legos-Jọs, Legoọ-Enugwu, Legọs-Ọnịcha, Legọs-Owere, Legọs-Aba, Legọs-Abakaliki, Legọs-Nsụka, Legọs-Uyo, Legọs-Pọtakọt,
Ọnịcha-Kano na Ọnịcha-Legọs.
Ndị ọzọ gụnyere Ọnịcha-Jọs, Ọnịcha-Abuja,
Ọnịcha-Sokoto, Ọnịcha-Gombe, Ọnịcha-Zakibiam, Pọtakọt-Owere-Aba-Kano,
Aba-Owere-Abuja, Aba-Legoọ, Abuja-Sokoto,
Abuja-Legọs, Abuja-Ọnịcha-Owere-Pọtakọt, Abuja-Enugwu/Abakaliki, Abuja-Gombe and Abuja-Kano.
Ụgbọala ndị sonyere na nke a
Gọọmentị etiti na ndị ọrụ ụgbọala ise bụ ndị nwere nkwekọrịta maka atụmatụ a. Ụgbọala ndị a gụnyere;
1.GIG ( God is Good)
2. Chisco Transport
3. Young Shall Grow
4. God Bless Ezenwata
5. Area Motor









