Ụkọ Ego a ọ na emetụta gi? Lee ihe anyi ma maka etu o si bido
Ụkọ Ego a ọ na emetụta gi? Lee ihe anyi ma maka etu o si bido

Ụkọ ego malitere ọzọ na Naịjirịa n'ọnwa Nọvemba 2023 rụọ ugbua bụ Dịsemba 2023.
Ọtụtụ mmadu na-ebe akwa na ha ahụghị ego ha ga-eji zụta ihe ndị ha chọrọ n'oge ekeresimesi a.
Ọ hiara ndị mmadụ gara ATM ahụ ị weta ego n'ihi ogologo ahịrị ndị mmadụ nọ n'ebe ahụ. Ndi mmadụ kwukwara na ụfọdụ ATM enweghị ego n'ime ha ma ndị ọrụ POS etinyela ego n'elu ego ha na-anabu.
Na mkparịta ụka anyị na ụlọakụ kachasị bụ CBN nwere, ha kwuru na enweghị ụkọ ego dị ugbua, kama na ndị mmadu na-ezọ ego, ya mere o jiri dị ka ụkọ ego ọ dị ugbua.
N'ihe oyonyo a, CBN gwara ndị Naịjirịa na-enweghị ihe dịka ụkọ ego,na-agbanyeghị na ndị mmadu ka na-ata ahụhụ inweta ego ha ji eme ihe baara ha ụrụ.




