Same Sex blessing: Ndị Bishọp Afrịka nwere nghọta pụrụiche banyere ozi m - Pope Francis

Pope Francis, onyeisi ụlọụka Katọlik

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ekwuola na ndị Bishọp mba Afrịka nwere nghọta pụrụiche n’okwu ya banyere ịgọzi nwoke maọbụ nwaanyị chọrọ ịlụ ibe ya.

Mana ọ gara n’ihu nwee nkwenye siri ike na oge na-adịghị na mkpebia ụlọụka nwere banyere nke a ga-edo onye ọbụla anya.

N’ajụjụọnụ ụlọọrụ akwụkwọ ntaakụkọ Italy gbara ya, Pope kwuru na ụlọụka Afrịka na ndị nkwado ha hụtara mmadụ inwe mmasị n'ụdịdị ya dịka “ihe ọjọọ” n’ụzọ omenala.

O kwuru na ozi ọhụrụ ahụ ha wepụtara n’ọnwa gara aga a kpọrọ ‘Fiducia Supplicans’ bụ “iji nabata na-abụghị ikewa”.

Pope Francis kwuru na ọ na-aghị emetụta ya ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị si n’ụlọụka Katọlik kewapụta n’ihi nwogharị a, ma sị na ihe butere okwu niile a bụ “obere otu nwere echiche dị iche”.

Iwu ụlọụka Katọlik anabataghị alụmdị n'etiti nwoke maọbụ nwaanyị ibe ha - Kadinal John Onaiyekan

Aha onyonyo, Iwu ụlọụka Katọlik anabataghị alụmdị n'etiti nwoke maọbụ nwaanyị ibe ha - Kadinal John Onaiyekan

Kadinal John Onaiyekan bụbụ Archbishọp Emeritus n'Abuja, Naịjirịa gwara BBC na mkparịtaụka na o nweghị ka iwu ụlọụka Katọlik si wee nabata alụmdị n'etiti nwoke maọbụ nwaanyị na dị n'ibe ya.

Kadinal John Onaiyekan buru ụzọ kọwa na ihe ndị ntaakụkọ mba ụwa kwuru abụghị ihe Poopu kwuru. Na ha ghọtaghiere ihe Poopu kwuru.

Ọ sị na nwoke maọbụ nwaanyị na-edina otu okike ha bịara onwe ha, a ga-egozi ha.

Ọ sị ka ndị mmadụ ghọta na o nweghị ka ụka Katọlik ga-esi gbanahụ n'okwukwe ha, na-egozie alụmdị n'etiti nwoke maọbụ nwaanyị na dị n'ibe yamana ha ga-egozi onye ọbụla chọrọ ngozi.

Kadinal John Onaiyekan bụbụ Archbishọp Emeritus n'Abuja
Nkọwa foto, Kadinal John Onaiyekan bụbụ Archbishọp Emeritus n'Abuja

Kedụ ihe otu ndị Bishọp ụlọụka Katọlik kwuru maka okwu a

Ọgbakọ ndị Bishopụ

Ebe foto si, Catholic Broadcast Commission/Facebook

Nkọwa foto, Ọgbakọ ndị Bishọp ụka Katọlik na Naịjirịa ekwuola okwu banyere nkwupụta Pope mere na nso nso a maka ịgọzị ndị lụrụ ụdị ekere ha.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọgbakọ ndị Bishọp ụka Katọlik na Naịjirịa ekwuola okwu banyere nkwupụta Pope mere na nso nso a maka ịgọzị ndị lụrụ ụdị ekere ha.

Na mbụ, ha sịrị na nkwupụta ahụ Pope mere bụ nke o jiri chọọ ido ọhanaeze anya banyere ụdị ngọzi dị iche iche apụrụ inye mmadụ maọbụ ihe ọ bụla n’ụlọụka Katọlik nke gụnyekwara mmadụ ndị nọ na njiko na-edoghị anya dịka ndị lụgharịrị di maọbụ nwunye n’oge ha gbachara alụkwaghịm na-ebụghị ụzọ kagbuo agbamaakwụkwọ mbụ ha, ndị lụrụ otu ụdị ekere ha, ndị lụrụ karịa otu nwaanyị maọbụ ndị na-eme ọyị.

Ha kwuru na nkwupụta ahụ bụkwa nke kọwara ndịiche dị n’etiti ngọzi dị iche iche nke ha kpọrọ “ritual, liturgical and informal blessings” ebe ọ bụ nke “informal blessing” ka a na-atụle ma ọ ga-ekwe omume ịgbasakwu ya ruo n’ebe ụmụ chineke niile nọ na-agbanyeghị usoro obibi ndụ ha ọ bụrụ ma ha arịọ ka a gọzie ha.

N’ịga n’ihu, ha kwuru na nkwupụta ahụ mere ka o doo anya bụ nkụzi ụlọụka Katọlik banyere agbamaakwụkwọ dịka “njikọ nwoke na nwaanyị” ma rụtụ aka na ụlọụka ahụ enweghị ikikere ịgọzi agbamaakwụkwọ ọ bụla na-edoghị anya.

Ha kwukwara na ya bụ nkwupụta bụ nke na-egosipụta eziokwu banyere ebere chineke, n’ihi na tupu mmadụ ọ bụla eji obi ya niile rịọ maka ngọzi, nke ahụ pụtara na o nwere ntụkwasaobi n’ebe chineke nọ tinyeere mmasị ibi ndụ dịka iwu chineke siri chọọ.

N’ihi ya, otu Catholic Bishops Conference of Nigeria nyere ndị nke chineke mmasi obi ike na nkụzi ụka Katọlik banyere agbamaakwụkwọ ka dịkwa etu ọ dị, nke pụtara na ha enweghị ikikere ịgọzi agbamaakwụkwọ ndị bụ otu ụdị ekere n’ihi na ime nke ahụ ga-abụ ịda iwu megide chineke, nkụzi nke ụlọụka, iwu obodo nakwa omenala.

Nke a ga-ebute ndị kwe na ndị ekweghị na nzụkọ Katolik – Fr Achi

Pop Francis

Ebe foto si, Getty Images

Dịka Popu Francis kwuru ka ndi Fada na-enye umunwoke na-alụ nwoke ibe ha ngozi na nzụkọ Katọlik, otu ụkọchukwu na mba Amerika, na New York, bu Fada James Martin bu onye ịzịzị enyeela ụmụnwoke abụọ na-ebi dịka di na nwunye ngọzị.

N'ụtụtụ Tuzdee ka Damian Steidl Jack, dị afo 44, na 'di' ya nwoke bu Jason Steidl Jack, dị afọ 38, guzoro n'ihu Fada Martin n'ime ọnụ ụlọ dị na Manhattan's West Side ebe Fada Martin nọ gọzịe ha, mee ya ụkọchụkwu mbụ na-eme nke a dịka Popu wepụtara ntuzaka ọhụrụ banyere nke a.

Mgbe ọ na-etinye ọnụ na nke a na ihe Popu Francis kwuru maka ịgọzi nwoke nwoke na amasi, otu ụkọchukwu Katolik bụbu odeakwụkwọ nke Katọlik Dayọsis Enugwu bụ Fada Benjamin Achi kọwara na ihe Popu kwuru apụtafghị na ụka Katolik kwadoro atụmatụ nwoke ịlụ ibe ya, kama na e nwere ike ịgọzi ndị na-ebi ụdị ndụ ahụ dịka e si agózi onye ọbụla rịọrọ ebere n'aka Chukwu.

Mana Achi rụturu aka na nkwupụta Popu nwere ike ibute nnukwu nsogbu; ndikwe na ndi-ekweghi na nzụkọ Katọlik.

Ozi Fada James Martin wepútara n'óba ozi Facebook ya n'abalí 20 nke ọnwa Desemba afọ 2023

Ebe foto si, Fr James Martin/Facebook

Nkọwa foto, Fr James Martin, ụkọchukwu Jesuit nọ na mba Ameríka bụ ụkọchukwu mbụ na-agọzi nwoke na ibe ya

Ọ sịrị, “Okwu ahu Pope Francis kwuru abụghị na a na-ahụzị mmadu na abụọ ahụ (nwoke na-alụ nwoke) dika di na nwunye, maọbụ na uka na-enyezị nkwado ka nwoke na-alụu nwoke maobu nwaanyi na-alụ nwaanyi. Mba! Ihe ya bu akwukwo kwuru bu na onye ọbụla bụ mmadụ Chukwu kere na-agbanyeghị etu onye ahụ si ebi ndu, na ọ gaghị egbochi ebere Chukwu na ọ bụrụ na onye ahụ arịọ ngọzị nke Chineke."

"Ọ bụghị na ụka ga-ekewa ụzọ abụọ dika o sịrị mee na mbu mana etu ihe siri dị o nwere ike ọ gaghị eru n' ụdịrị ahu, mana ọ ga-ebute ndi kwe na ndi ekweghi."

"Ile anya ugbua ebe ọna agazị maka na ndi ukochukwu akwusiro ofu ebe, ifodu kwere ebe, ụfọdụ ekweghi. Ihe a bu ihe mgbagoju anya. Ọ ga-ahịa ndi mmadu ahụ ighọta."

N'okwu ụkọchukwu James Martin goziri nwoke abụọ na-alụ onwe ha, Fada Achị sịrị, "Ihe ukochukwu Amerika mere bụ igosi na ya nwere ike nye ndi di ọtu a ngozi na enweghị ụjọ na ya mere arụ. Mana o nyeghị ha ngozi dịka di na nwunye."

"Nke bu eziokwu bu ufọdụ ga-eche na ngozi ahu bu nkwado. Mana i lee anya n' akwụkwọ ahu e weputara, o kwuru hooha na ihe gbasara alụmdi na nwunye na o bu na etiti nwoke na nwaanyi. Mana ufodu nwere ike ghọta ya dika na e enyela ha nkwado, a kwa a na-enye ha ngozi, na-asi ha gawa n´ịrụ na o nweghị ihe o mere."

"Ụkọchukwu nwere ike igozi onye ọbụla Chukwu kere na ọ bụrụ na onye ahụ arịọ. Etu e siri gọzịe onye ọbụla ka a ga-esị gọzie onye ahụ."

"Ọ bụghị ngọzị agbamakwụkwọ, a na-agọzi ụlọ, ụgbọala, na ịhe ndị ozọ, kedu ihe ga-eme ka a hapụ ịgọzị ndị mmadu; mana nke a abughị na enyela ike ka nwoke na-alụ nwoke maọbụ nwaanyi na-alụ nwanyi."