Mr Ibu: Ihe anyị ma maka akụkọ na e beela ụkwụ nke abụọ

John Okafor aka 'Mr Ibu'

Ebe foto si, Jasmine Okafor/Instagram

Ezinaụlọ onye ejije Nollywood bụ John Okafor a ma ama dịka 'Mr Ibu' ekwuola na akụkọ na-efegharị nke kwuru na e beela nna ha ụkwụ nke abụọ bụ okpotokpo asị.

Cheta na izu ole na ole gara aga, ndị dọkịta bepụrụ Mr Ibu otu ụkwụ dịka a na-agbalị ịzọ ya ndụ.

Mana n'ehihie taa bụ Satode, akụkọ malitere ifegharị na soshal midia nke na-ebo ebubo na Ebepụla Mr Ibu ụkwụ nke abụọ.

Mana n'ozi nke nwa ya nwoke bụ Valentine Okafor binyere aka ma wepụta n'aha ezinaụlọ ha n'abalị Satọde, ha kwuru na ọ bụ naanị otu ụkwụ ka e bere nna ha.

Ozi ahụ sịrị, " Nke mbụ, ọ ga-amasị anyị ikwu na e beghị nna anyị ụkwụ ya abụọ, kama ọ bụ otu ụkwụ."

O mere ka o dọọ ewu na ọkụkọ anya na ọ bụghị ọrịa shuga(diabetes) na-arịa nna ha dịka ọtụtụ ndị mmadụ si eche ka akụkọ na e bere ya ụkwụ mbụ pụtara ihe.

Ọ sịrị, "Ahụ nna anyị na-arịa abụghị ọrịa shuga kama ọbara n'akpụkọ ya n'ụkwụ n'ihi ọrịa agbara ọbara si aga na nsogbu ahụike ndị ọzọ nke tinyere ndụ ya n'ihe egwu , ya bụ ihe mere ka e bee ya ụkwụ."

Valentine gara n'ihu kọwaa na ihe mere ka ha ghara ibugala Mr Ibu ala Bekee maka nleta bụ n'ihi na ndị dọkịta kwuru na ọ gaghị efeli n'ọnọdụ ya. Ọ rịọla ndị ihe mr Ibu na-amasị ka ha kpewere ya ekpere ndụ ma kwụsị ifesa akụkọ ụgha banyere ya.