Ọgba Mbọ: Etu m si chọpụta iji akịawụsa eme loi loi - Jennifer Ugwuoke

Aha onyonyo, Ọgba Mbọ: Etu m si chọpụta iji akịawụsa eme loi loi - Jennifer Ugwuoke
Ọgba Mbọ: Etu m si chọpụta iji akịawụsa eme loi loi - Jennifer Ugwuoke
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi na Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist

"A hụghị ka e mere, e mee ka ahụrụ", nke a bụ ilu Igbo ma bụrụkwa ihe kọwara nke ọma etu nwa ada a aha ya bụ Jennifer Nnedinso Ugwuoke si malite ụlọọrụ ya nke na-eji akịawụsa emepụta nri olilo.

Akịawụsa, nke Bekee na-akpọ 'tigernut', bụ mkpụrụosisi na-etokarị na mpaghara Ugwu Naịjirịa. Ọ na-atọ bịrịbịrị mana ihe ụtọ ya ahụ abụghị 'shuga'.

E nwereike ịta ya na mkpụrụ ya, maọbụ were ya mepụta ihe ọṅụṅụ a na-akpọ 'tigernut drink' na Bekee, mana ọ gbara gharịị etu nwaada Ugwuoke siri chepụta iji ya bụ akịawụsa emepụta ihe oriri.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Jennifer Ugwuoke kọwara na ọ bụ ebe ya na-achọ ihe oriri ga-adị nne ya mma n'ahụ, n'ihi ọrịa dayabitis nne ya na-arịa, ka o si tulee ịkwọri mkpụrụ akịawụsa ka ntụ ma were ya see nri olilo.

Jennifer Ugwuoke na-emepụta loi loi akịawụsa

"Ụbọchị nne m riri nri ahụ, ka chi foro, o kwuru na ya bụ nri olilo amaka, n'ihi na o meghị ka shuga dị n'ọbara ya gbalie," nwaada Ugwuoke kwuru.

Etu a ka o si malite imepụta loi loi akịawụsa ebe o buru ibu, ugbua, ọ na-ebupu ya bụ nri gaa ọtụtụ mba ofesi dị icheiche.

Jennifer Ugwuoke kwuru sị: "Otu ihe na-echere anyị aka mgba na mmepụta ihe oriri a bụ na ọtụtụ ndị be anyị anaghị enwe mmasị igo nri a rụpụtara na Naịjirịa, kama ha na-achọ nke si mba ofesi."

"Ọzọkwa bụ na ego anyị ji ebupu ngwanri anyị gaa mba ọzọ na-adị elu, maka na Naịjirịa enweghị nnukwu ihe ha na-ebupu gaa mba ọzọ.

"Ọtụtụ ụgbọelu na-ebubata ihe na Naịjirịa na-agba aka ala, kama ha ruo na Ghana maọbụ na Kenya, ha esi ebe ahụ buru ihe tupu ha alaghachi ofesi, nke a na-eme ibupu ihe site na Naịjirịa ji adị oke ọnụ."

Kiri mkparịtaụka anyị na Jennifer Ugwuoke n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.