'Anyị nwere ike ikpochapụ alụmdi ụmụaka n'ọgbọ a'

 Michelle Obama, Amal Clooney na Melinda French Gates

Ebe foto si, Obama Foundation

    • Onye dere ya, By Megha Mohan, Yousef Eldin and Emma Ailes
    • Ndị mere akụkọ a, BBC 100 Women

Ụmụnwaanyi a ma-ama n'ụwa; Michelle Obama, Amal Clooney na Melinda French Gates gwara BBC na ha chọrọ ka a kwụsị ịmanye ụmụaka na-alụ di na nwụnye n' ọgbọ a.

Onye ọkaiwu na onye mgbasaozi bụ Michelle Obama, onye ọkaiwu na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye bụ Amal Clooney na onye ọrụ ebere bụ Melinda Gates mara ọkwa afọ gara aga sị na ha ga-ejikọ aka ọnụ luso nsogbu ịlụ di na-erughí eru ọgụ.

Mana dịka ihe sịrị kwụrụ ugbua, otu mbaụwa bụ 'United Nations' kwuru ọ ga-ewe rue afọ narị atọ tupu ekpochapụ ịmanye ụmụaka lụọ di.

Mana Oriakụ Obama gwara BBC News sị: "Ọ bụ ihe e nwere ike kwụsị echi."

Ụmụnwaanyị atọ a gwara BBC 100 Women okwu na mkparịtaụka mgbe ha gara nleta na mba Malawi na Saụt Afrịka.

Lucy di afọ irị abụọ na ịsịi ebechaala akwa mgbe ọ na-akọwa ọnodu ya.

Lucy nọ n' ọba akwụkwo dị n'ụlọakwụkwọ 'Ludzi Girls Secondary School' n' etiti Malawị.

Ndị ọrụ nzuzo US guzoro n'èzi, n'okpuru ukwu osisi dị n' ogige ụlọ akwụkwọ.

Ọ ka nọ na-ekwu maka mkpa ọ dị ụmụagbọghọ ịnọ n'ụlọakwụkwọ ma wepu uche na alụmdinanwunye ọ kacha ịnụ ndị okenye, tupu o nwee mmetụta,were bewe akwa.

Michelle Obama

Ebe foto si, Obama Foundation

Mgbe Lucy na- ekwu ọkwụ, ụmunwaanyị atọ ndị ọrụ ebere kachasị nwee agba n' ụwa bụ Melinda French Gates, Amal Clooney na Michelle Obama, na-ege ntị akụkọ ya.

Dịka otu na mgba mbọ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị bụ 'Girls Not Brides' si kwuo, Malawi bụ mba kachasị naz a Ọwụị̀a Anyanwụ na Ndịda Afrịka nwee ụmụaka ụmụnwaanyị e kenyere di n'oke oge dịka ụmụaka ụmụnwaanyị lụrụ di tupu ha erue afọ 18 dị pasent 42.

Na mpaghara Mchinji, ebe ụlọakwụkwọ ụmụnwanyị bụ Ludzi dị, e kwuru na pasent 33% ụmụaka nwaanyị na-atụrụ ime tupu ha eruo afọ18, nke mere ha ji agbahapụ agụmakwụkwọ.

Amal Clooney

Ebe foto si, Obama Foundation

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Lucy gaara abụ otu n'ime ụmụaka ụmụnwaanyị ndịa ahụ.

Nna ya chọburu ka ọ hapụ akwụkwọ mgbe ọ dị afọ 14, mana ọ jụrụ, ma mesịa ghọọ nwaagbọghọ mbụ gara mahadum n' obodo ha.

Ugbua, o nwetara nzere mmụta n'Education, ọ bụ onyeisi otu a kpọrọ 'AGE Africa', bụ ụlọrụ ebere na-enye ụmụaka ụmụnwaanyị ohere agụmakwụkwọ n'efu na Malawi, mba ebe e nweghị ohere agụmakwụkwọ sekọndrị n'efu.

Lucy bụbụ nwata akwụkwọ, mana ugbua ọ na-enyere ụmụaka ụmụnwaanyị aka n' onwe ya.

Nne ya na-enwe nnukwu obi ụtọ maka ogogo nwa ya toruola mana Lucy kwuru, na-agbanyeghị, na nna ya anabatachabeghị nke a.

Ịkọ maka ije ụwa ya mere anya mmiri jiri ju ya isi.

Michelle Obama bụbụ isi nwaanyị mba Amerịka nọ n'aka ekpe Lucy kwuru sị, "Ị ga -iziri m nna gi ozi?

"Oge ọzọ ị ga-ahụ ya, gwa ya na obị dị Michelle na Barack Obama ụtọ ogogo i ruola , okachasị ụdịrị nwaanyị ị bụ ugbua."

Lucy leliri anya elu n'ọnụ ọchị. N'aka nri Lucy bu ọnye ọkaịwụ mba ụwa.

Ọkaiwu Clooney; “Gwa ya na i nwekwara onye ọkaiwu ugbua”.

Melinda Gates

Ebe foto si, Obama Foundation

Dịka ha machara ọkwa na ha ga-ejikọ aka ọnụ megide alụmdị n'oke oge n'afọ gara aga,Michelle Obama, Amal Clooney na Melinda French Gates gara Malawi na Saụt Afrịka ebe ha banyere ụlọọrụ abụghị nke gọọmentị na-ebu agha megide ịlụshu di ọgụ aja n'ukwu.

Oriakụ Obama ji otu ya a kpọrọ 'Girls Opportunity Alliance' enyere ụmụaka ụmụnwaanyị na-ahapụ agụmakwụkwọ n'ihi ịtụ ime mkpuke n'ụwa.

Oriakụ Clooney na-enyere ụmụaka ụmụnwaanyị nọ n'im,ime obodo aka ịmata maka ikike dịịrị ha., ebe French Gates na-etinye anya na'ịkwalite ahụike ọkachsị nke ụmụaka ụmụnwaanyị na-enwe nsogbu noge ịmụ nwa n'ihi na ha ka dị ntakịrị.