Christmas Travel Tips: Lee ihe ị ga-eme iji chekwaa onwe gị maka ọdachi ụgbọala
Ọtụtụ mgbe ka ihe mberede okporoụzọ na-eme n'ihi akpachapụghị anya nke onye na-akwọ ụgbọala.
O nwere ike bụrụ na onye ọkwọụgbọala ji otu aka aza ekwentị ma were aka nke ọzọ na-anya ụgbọala.
Oge ụfọdụ kwa, ụra nwere ike iburu onye na-akwọ ụgbọala mee ya ka o tinye isi n'ọhịa.
Hyginus Omeje onye ọrụ nchekwa okporoụzọ bụ 'Road Safety' na Bekee kọwaara BBC etu ọkwọụgbọala ga-esi kpachapụ anya iji gbalahụ ọdachi okporoụzọ.
Gere ihe Omeje kwuru n'ihe nkiri a.
Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: