Taxify Driver: Ihe m na-agabiga dịka onye ọkwọụgbọala

Ebe foto si, Chesnot
Otu onye ọkwọụgbọala e ji ịntanet akpọ oku ọrụ a kpọrọ 'Taxify' kọwaara BBC Igbo ụfọdụ ihe ha na-agabiga n'ọrụ ha.
Nwaamadi ahụ onye BBC achọghị ịkpọ aha ya iji chekwa ya, kwuru na "ọrụ ha siri ike ọkachasị n'abalị."
O kwuru na ha na-ezute ndị ekperima, ndị ntọrị, ndị ọgwụego, na ndị yahoo-yahoo n'ọrụ ha.
Nwaamadi ahụ gwara BBC na "O nwere otu ụbọchị m butere ụmụntorobia na Lekki. Ha gwara m na ha na-aga Apapa. Amaghị m na ebumnobi ha bụ izu ohi."
"A pụta n'ụzọ otu onye kpọrọ ha n'ekwentị ha sị na ọ bụ Ikoyi ka ha chọrọ ịga."
Ka ha pụtara n'ụzọ, ndị ntorobịa ahụ tiri ya ihe chọọ ịnara ya ụgbọala ya, mana ọ zọtara onwe ya, gbaa ọsọ ndụ.
Ọkwọụgbọala ahụ onye kwuru na ya bụ ihe mere ebe elekere mbụ nke ụtụtụ, kwuru na ọ bụ ya bụ mbụ na ikpeazụ ọ rụrụ ọrụ abalị.
"Kemgbe ahụ, elekere asaa maọbụ asatọ kụọ, m mechie ọrụ."
Nkwupụta a na-apụta dịka akụkọ pụtara na ndị banyere ụgbọala ya gburu otu ọkwọụgbọala Taxify a kpọrọ Gabriel Wisdom n'Ajah dị na Legọs na nso nso a.
Ihe ndị ọzọ ọ gụpụtara ndị mmadụ na-eme ha gụnyere:
- Ụfọdụ ndị mmadụ ga-agwa gị ebe ha nọ mana i rute, ebe ha gwara gị abụghị n'ezie ebe ha nọ.
- Ụfọdụ ga-agwa gị ebe ha chọrọ ịga, i buru ha gaa ebe ahụ, ha asị gị na ọ bụghị ebe ha na-aga.
- Ụfọdụ ndị wayo ga-agwa gị ebe ha na-aga, ị rute ebe ahụ kama ịkwụ gị ụgwọ, ha agwa gị na ekwentị ha anyụọla ọkụ, i sie ọnwụ, isi gị nwereike iso ya










