Taxify Driver: Ihe m na-agabiga dịka onye ọkwọụgbọala

Taxify

Ebe foto si, Chesnot

Otu onye ọkwọụgbọala e ji ịntanet akpọ oku ọrụ a kpọrọ 'Taxify' kọwaara BBC Igbo ụfọdụ ihe ha na-agabiga n'ọrụ ha.

Nwaamadi ahụ onye BBC achọghị ịkpọ aha ya iji chekwa ya, kwuru na "ọrụ ha siri ike ọkachasị n'abalị."

O kwuru na ha na-ezute ndị ekperima, ndị ntọrị, ndị ọgwụego, na ndị yahoo-yahoo n'ọrụ ha.

Nwaamadi ahụ gwara BBC na "O nwere otu ụbọchị m butere ụmụntorobia na Lekki. Ha gwara m na ha na-aga Apapa. Amaghị m na ebumnobi ha bụ izu ohi."

Aha onyonyo, Nwaada a jị ịnya ụgbọala akpata ego

"A pụta n'ụzọ otu onye kpọrọ ha n'ekwentị ha sị na ọ bụ Ikoyi ka ha chọrọ ịga."

Ka ha pụtara n'ụzọ, ndị ntorobịa ahụ tiri ya ihe chọọ ịnara ya ụgbọala ya, mana ọ zọtara onwe ya, gbaa ọsọ ndụ.

Ọkwọụgbọala ahụ onye kwuru na ya bụ ihe mere ebe elekere mbụ nke ụtụtụ, kwuru na ọ bụ ya bụ mbụ na ikpeazụ ọ rụrụ ọrụ abalị.

"Kemgbe ahụ, elekere asaa maọbụ asatọ kụọ, m mechie ọrụ."

Nkwupụta a na-apụta dịka akụkọ pụtara na ndị banyere ụgbọala ya gburu otu ọkwọụgbọala Taxify a kpọrọ Gabriel Wisdom n'Ajah dị na Legọs na nso nso a.

Ihe ndị ọzọ ọ gụpụtara ndị mmadụ na-eme ha gụnyere:

  • Ụfọdụ ndị mmadụ ga-agwa gị ebe ha nọ mana i rute, ebe ha gwara gị abụghị n'ezie ebe ha nọ.
  • Ụfọdụ ga-agwa gị ebe ha chọrọ ịga, i buru ha gaa ebe ahụ, ha asị gị na ọ bụghị ebe ha na-aga.
  • Ụfọdụ ndị wayo ga-agwa gị ebe ha na-aga, ị rute ebe ahụ kama ịkwụ gị ụgwọ, ha agwa gị na ekwentị ha anyụọla ọkụ, i sie ọnwụ, isi gị nwereike iso ya

Akụkọ ga-amasị gị: