Chukwuemeka Ezeife: 'Restructuring' ga-aka baara ndị Ọwụwa Anyanwu uru
Chukwuemeka Ezeife, bụ aka chịburu Anambara steeti n'agbata ọnwa Jenụwarị afọ 1992 rue Novemba afọ 1993.
Dike ahụ gụrụ 'Economics' na mahadum ala Bekee a kpọrọ 'Harvard University' gwara Uche Akolisa nke BBC Igbo na mkparịtaụka n'Abuja, mpụ akarịala na ntuliaka a na-emezi na Naijria nakwa n'ọchịchị obodo.
Ọ rụtụrụ aka n'ihe mere na ntuliaka ọkwa gọvanọ Kogi na Bayelsa steeti enweghị atụ dịka ọ katọrọ ọchịchị oge otu PDP na nke APC.
O kwukwara na ihe kara ndị Igbo mma ugbua bụ nhazigharị na mpaghara na mpaghara nke Bekee kpọrọ 'restructuring'.
Kirie ya n'uju: