Etu m si zute di m bụ Gọvanọ Akeredolu nke Ondo Steeti - Betty Anyanwu

Aha onyonyo, Betty Anyanwu Akeredolu: Etu m si zute di m bụ Gọvanọ Ondo Steeti
Etu m si zute di m bụ Gọvanọ Akeredolu nke Ondo Steeti - Betty Anyanwu

Nwunye Gọvanọ Rotimi Akeredolu nke Ondo steeti bu Betty Anyanwu Akeredolu etiwaala akioyibo nsugbe banyere njem ya na alụmdinanwunye.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Betty kọwara etu o siri zute di ya, mmerikọta ndị Igbo na ndị Yoruba nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ezinaụlọ Akeredolu

Ebe foto si, Betty Akeredolu

Nkọwa foto, Ezinaụlọ Akeredolu

Ọ sị na o zutere di ya n'Enugwu na kọwaa na ha hụrụ onwe ha n'anya ngwa ngwa ha zutere, mgbe ha ji otu afọ efe ala nna ha a kpọrọ 'Youth Service'.

"Mgbe a bịara ịlụ m, ndị ezinaụlọ m na-atụ ụjọ maka a na-eche na ndị Yoruba na-alụkarịa otu nwaanyị, mana di m gosiri ha na ọ bụ 'stereotype' nkịtị" ka o kwuru.

Mgbe ha mere agbamakwụkwọ ha

Ebe foto si, Ezinaụlọ Akeredolu

Nkọwa foto, Mgbe Rotimi na Betty mere agbamakwụkwọ ha

Ihe ọzọ o kwuru okwu maka ya bụ etu o si rịa ọrịa akpụ ara bụ 'Breast Cancer'.

Ọ sị na mgbe ọ chọrọ ikwuputa ya ka ndị mmadụ mara, na Dọkịnta na-agwọ ya kụjara ma sị ya emele nke ahụ.

Ọ kọwara na ọ gara n'ihu malite ụlọorụ ya iji gbasa ozi nakwa ọzụzụ maka ọrịa ahụ n'agbanyeghi na ụmụ nwaanyị ibe ya enyeghi ya nkwado.

Gee ihe o kwuru n'uju ebe a.

Betty Akeredolu na di ya bụ Gọvanọ Ondo steeti

Ebe foto si, Betty Akeredolu Family