Ondo State Election: Ka o si aga na ntuliaka gọvanọ Ondo Steeti

Otu pati iri na asaa ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ nke Ondo steeti dịka ndị mmadụ ga-apụta tuọ vootu n'ụbọchị iri nke ọnwa Ọktoba 2010.
Ndị na-atụ n'okpuru ọchịchị 18 na steeti ahụ ga-ahọpụta otu onye n'ime mmadụ 17 ji ọkọrọrọ pati ndị a ka ọ chịa steeti ahụ ruo afọ anọ na-abịa.
N'agbanyenghị na ọ bụ pati 17 na-azọ ọkwa, anya kachasị wụsa n'ihu aka na-achị steeti bụ Rotimi Akeredolu nke patị All Progressives Congress (APC), Eyitayo Jegede nke Peoples Democratic Party (PDP) nakwa Agboola Ajayi bụ onye bu ọkọrọtọ Zenith Labour Party (ZLP).
Ndị a niile nwere ezigbote nkwado na okpuru ọchịchị ime obodo dị na steeti ahụ.

Ebe foto si, FACEBOOK
Amalitela ịgụkọ vootu ugbua

Ịtụ vootu akwụsịla na mpaghara ụfọdụ na Ondo steeti ugbua.
Ndị ọrụ Inec amalitela ịgụkọ vootu dịka ndị mmadụ nọkwa n'ele anya.

Mana n'ebe ndị ọzọ, ndị mmadụ ka na-atụkwa vootu.
Ntuliaka na-aga n'udo na Ondo

Akukọ pụtaburu na Twitter na-ekwu na awakporo gọvanọ na-achị Ondo stetti ma merụọ nwunye ahụ, mana Betty Anyanwu-Akeredolu putara n'ihe onyonyo kwuo na onweghi ihe mere ya.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Etu ndị mmadụ si tuọ vootu






Itu vootu adịrịla njikere





Ndị mmadụ amalitela inyocha aha ha dịka ndị ọrụ Inec malitere iru ebe a na-atụ vootu













