Ndị 'Labour Party' sịbu m deere jụụ ka e mecha ntụlịaka gbọkọtara m azụ- nwunye Agbasimalo feere LP ọkọlọtọ Govanọ Anambra a tọọrọ
- Onye dere ya, Uche Akolisa & Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
Obiora Agbasimalo bụ onye fere ọkọlọtọ otu Labour Party na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra stteeti nke bupụtara Charles Soludo.
Mana a tọọrọ Agbasimalo bụ onye na-arụ ọrụ ụlọakụ tupu ọ banye ndọrọndọrọ Ọchịchị n'abalị 18 nke ọnwa Semptemba afọ 2021 (ka ọ fọrọ abalị ole na ole tupu ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere n'abalị isii nke ọnwa Novemba afọ ahụ) na Lilu dị n'Okpuru Ọchịchị Ihiala, Anambara steeti dịka ọ na-aga ọgbakọ achụmta vootu.
Akụkọ kwuru na ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ wakporo ụgbọala ha tọọrọ ya na otu onye uweojii so ha, ebe otu onye uweojii na onye kwọụgbọala ha gbalahụrụ ndị omekome ahụ.
Ugbua, o meela afọ abụọ na ụma ya bụ ọdachi dakwasịrị ezinaụlọ ya, mana ahụbeghị ya.
Na mkparịtaụka nke BBC Igbo na nwunye ya bụ Eucharịa Agbasimalo nwere na nsonso a ọ kọwara na otu Labour Party mesasara ya na ezinaụlọ ya anya site itinye ha egwu n'ahụ iji ọk ọkụ chọwa di dịka ha gara n'ihu were aha ya achụnta vootu ka a tọchara ya.
Mana na oge e mechara ntuliaka nke Charles Soludo, nke Apga meriri, na ha sere aka ha na ụkwụ ha n'okwu ịchọ di ya.
Ọ sịrị,"Mgbe a tọọrọ di m, ọ dị afọ 39, n'afọ 2023 a ka ọ gbara afọ 42. A hụbeghị ya ruo taa."
Ọ kọwakwara ihe ndị ọzọ ọ gabigara na mbọ ịchọ di ya nke gunyere afọ ime pụrụ ya, nna na nne di ya ịdaa ọrịa, egwu ndị a rụrụ aka n'okwu metụtara ntọrị di ya na-eyi ya na ihe ndị ọzọ.
Kirie ihe o kwuru n'uju:

Ihe ndị a kpọnyere n'okwu a sara

Ebe foto si, Julius Abure /Ugochukwu Emeh/Facebook
Onyeisioche otu'Labour Party' n'etiti bụ Julius Abure azaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwentị.
N'aka nke ọzọ, Onyeisioche otu 'Labour Party' n'Anambara steeti bụ Ugo Emeh kwuru na ya mere ihe ụlọọrụ ha n'etiti ziri ya rụọ site na iwega mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii nzuzo bụ DSS.
" Ihe gbasara onye zọrọ ọkwa gọvanọ n'aha 'Labour Party' bụ ihe gbasara onyeisioche n'etiti."
"Oge o mere, ha sịrị m gaa nye mkpesana DSS, m gaa nye mkpesa na DSS."
"Ihe ọbụla a na-ekwu n'okwu a bụ e zie m, mụnwa eme, o nweghị nke e ziri m m emeghị."
Clement Ojukwu bụ 'ọrganising secretary otu Labour Party kwuru sị, "Abụghị m ọnụ na-ekwuru 'Labour Party', ụnụ akpọkwala m n'okwu a ọzọ."
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii etiti bụ Muyiwa Adejobi sịrị," Biko jụọ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti,ọ ga-aka ma maka okwu ahụ
N'ọsịsa ebubo na ndị e ji maka okwu ntọrị Agbasimalo, na-ezitere nwunye ya na ọkaiwu ya ozi mmaja, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na" enweghị ụdị mkpesa n'ihu m mana ama m n'ikpe ndị a a neyo enyo maka okwu ahụ dị n'ụlọikpe."
Godwin Agbasimalo bụ onye si Obiora pụta zọọ ọchịchị azaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi ezigara ya.
Nsogbu ntọrị na-arị elu na Naijiria n'afọ ole na ole gara aka.
Dika ngụkọ nke ụlọọrụ mba Amerịka bụ 'Council on Foreign Relations and National Security Tracker, mere n'afọ 2022, ndị ntọ tọọrọ mmadụ 4,6114, ebe e gburu mmadụ 4,545 n'ụzọ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị na ndakpọ nchekwa.






