Etu e si tụọ Somtochukwu Okwuoha nga maka iyi ndụ egwu na Briten

Somtochukwu Okwuoha

Ebe foto si, Premier News

A tụọla nwaafọ Naijiria na-agụ akwụkwọ (Masters)na mahadum 'Dundee University' na mba Briten mkpọrọ afọ atọ na ọnwa anọ(40 months) maka iyi ndụ egwu.

Somtochukwu Okwuoha nyara isi na ya ga-arịọta enyemaka otu ISIS (Islamic State) iji gbaa ogbunigwe n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Ụlọikpe nyekwara iwu ka e bughachi Okwuoha azụ ebe o si ma oge ya na mkpọrọ zuo.

Nwaamadi ahụ na-agụ 'International Energy Studies' gwara ndị ọrụ mahadum ahụ na ya ga-eji ngwaagha kemikal wakpoo ebe ahụ.

A maburu nwata nwoke ahụ gbara afọ 26 ikpe maka ebubo asaa gunyere; iyi onye oru mahadum egwu si na ya ga-egbu ya, n'agbata ọnwa Disemba afọ 2021 na Juun 2022; ebubo imaja na ya ga-egbu ndi mmadu n’igwe; ebubo na ya ga-egbupu ndi uweojii isi, ma gbaa ogbunigwe na mahadum ‘Dundee University’.

Onyeisi ikpe Sheriff William Wood gwara ya sị : "Ọnịnọ gị na mba Briten agaghị adịrị ọha mma. Ya mere m ji atụ aro ka a kpọlaa gị ma oge rue."

A gwara ụlọikpe na Okwuoha bịara Briten n'afọ 2021,ya na nwata akwụkwọ ibe ya dịwara na mma, ọ rịọọ ya enyi mana nke nwaanyị ekweghị.

Sheriff Wood sịrị: "Ị malitere ịkpọtọ ya ma gbalịa ime ka a chụọ ya n' akwụkwọ ọ na-agụ."

"Mahadum kpebiri ịkwụsịtụ gị ịgụ akwụkwọ gị, ị tụgharịa buwe ndị ọrụ mahadum agha."

"Ị ji igbusisi ndị mmadụ n'igwe na iyi ndụ egwu majaa ndị mmadụ, sị na ị ga-eji ogbunigwe na nje (biological weapons) memilaa ndị mmadụ."

'Ọbara ga-ewufu'

Ndị d gbara akaebe kọwara etu Okwuoha si sị na ya nwere ọzụzụ ndịagha ma nwee ike ịrụ ogbunigwe nakwa nje na-efesa ọrịa n'obodo.

Keith Mackle, 58, onye bụbụ onyeisi na-ahụ maka ihe ndị na-emetụta ụmụakwụkwọ gwara ụlọikpe 'Perth Sheriff Court' na ya matara maka nsogbu ahụ n'afọ 2021.

O kwuru na ụfọdu ndị ọrụ ha nwetara akwụkwọ ozi si na intanet(emails)nke Okwuoha ji yie ha egwu.

Otu n'ime ozi ahụ sịrị: "Che aka ghọrọ ogbunigwe na mahadum'University of Dundee'.

"Akpọtụrụla m ndị Isis ka ha tinye ogbunigwe n'ogige mahadum".

" Agwa m ụnụ ma ndị ọrụ ,ma ụmụakwụkwọ ga-anwụ n'igwe. 9/11 ga-abụ obere ihe n'ihe gaje ime".

"Ọbara ga-awụfu, anụahụ mmadụ ga- efesasị ebe nile."