Arịrị egbuola ezinụlọ anyị - Nwunye Obiora Agbasimalo a na-achọ achọ kamgbe afọ abụọ

Ebe foto si, Obiora Agbasimalo
Eucharia Agbasimalo, bụ nwunye Obiora Agbasimalo ekwuola etu arịrị, iru uju na anya mmiri si jupụta n'ezinụlọ ha kamgbe afọ abụọ e ji chọwa di ya achọwa.
Obiora Agbasimalo bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị kwesịrị iso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti n'otu Labour Party n'afọ 2021.
E bidoro ịchọ Agbasimalo achọ n'ọnwa Sepụtemba 2021, oge ọ na-agagharị na-achụ nta vootu maka ntliaka afọ ahụ. Ruo taa, onwebeghị onye ma ebe ọ nọ, ma ọ dị ndụ maọbụ ọ nwụrụ anwụ.
Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Punch nke e bipụtara n'ụbọchị Sọnde, Eucharia Agbasimalo kwuru sị: "Ofufu a di m na-efu emetụtala ezinụlọ anyị n'ụzọ pụrụ iche. Obi mgbawa anyị gabigarala, mụ onwe m, ụmụ anyị, ndị ezinụlọ nakwa ndị enyi."
"Ọ chọwala iru afọ abụọ ugbua, onweghị onye ma ebe di m nọ, onweghịkwanụ onye na-agwa anyị ihe ọbụla. Agaghị m akọwanwu ụdị mwute anyị na-agabiga dịka ezinụlọ. Mana olileanya m dị na Chukwu."
Oriaku Agbasimalo kwuru na ọ bụ na mpaghara Azia, dị n'okpuruọchịchị Ihiala ka akụkọ kwuru na a tọọrọ di ya n'ụbọchị 18 nke ọnwa Sepụtemba 2021.
"Agbaala m mbọ dị icheiche. Iji maa atụ, agakwurula m otu 'truth and justice commission nke gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo hibere. Otu ahụ kpọrọ ndị ezinụlọ anyị ka anyị kọọrọ ha ihe merenụ, ha mechara kwe anyị nkwa na ha ga-ahụrịrị isi ya bụ okwu," Oriakụ Agbasimalo kwuru.
"Agakwaala m zute gọvanọ n'onwe ya, o wee gwa m na ya ndị ọrụ nchekwa dị icheiche na-ekwu okwu oge niile iji chọpụta ebe mmiri si gbarụọ. Gọvanọ kwere m nkwa na ndị ọrụ nchekwa na-eme ihe niile ha nwereike iji mata ihe mere di m."
Oriaku Agbasimalo kwuru na ọ bụ di ya na ndị ọrụ nchekwa abụọ ka a tọọrọ n'ụbọchị ahụ, mana otu onye n'ime ha mechara gbalaga, ebe di ya na onye ọrụ nchekwa nke ọzọ bụ ndị ahụbeghị maọbụ nụ olu ha ruo taa.
"Onye nke ahụ gbara ọsọ kwuru na onye ọkwọ ụgbọala ndị ekperima ahụ na-aza ekwentị aghara aghara oge ha tọọrọ ha, mana ya onwe ya aghọtaghị ihe ọ na-ekwu n'ihi na ya abụghị onye Igbo," ka o kwuru.
Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ejidela mmadụ abụọ a na-enyo na aka ha dị na ntọrọ Mazi Obiora Agbasimalo, ha gụnyere onye ọkwọ ụgbọala ya nakwa otu onye ọzọ onye kwuru na ya ma ndị tọọrọ Mazi Agbasimalo ma si etu ha na-anapụ ezinụlọ ya ego.
Okwu mmadụ abụọ ahụ dị n'ụlọikpe ugbua.
'Ọgbara m gharịị oge di m kwuru na ya ga-abanye ndọrọndọrọ ọchịchị'

Ebe foto si, Obiora Agbasimalo
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Eucharia Agbasimalo kwuru na oge di ya gwara ya na ọ chọrọ ịbanye ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ gbagwojuru ya anya, "maka na nke ahụ esoghị n'ihe mụ na ya kpara".
"Amaghị m ebe atụmatụ nke ahụ si bịa. Akwadoghị m ya, ọ bụghị n'ihi na ndọrọndọrọ ọchịchị dị njọ n'onwe ya kama maka na di m bụ ezigbo mmadụ, anyị ma etu ndọrọndọrọ ọchịchị si adị na mpaghara ụwa a," Oriaku Agbasimalo kwuru.
"Di m bụ onye ọrụ ụlọakụ na-eme nke ọma n'ọrụ ya. Echeghi m na ọ dịla njikere ịwụbanye na mmiri ọjọọ a bụ ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụ ya mere m ji enwe nchekasị oge niile maka ọdị mma ya.
"Mana ọ gwara m na onweghị ihe ga-emenụ, na ndọrọndọrọ ọchịchị abụghị ọgụ ọnwụ na ndụ, na ihe kacha njọ nwereike ime bụ na ya agaghị enweta mmeri, mana nke ahụ abụghị nsogbu.
"Ọ bụ ya mere m ji nwee okwukwe, na-ekpe ekpere maka ọdịmma ya oge niile. Onweghị mgbe m ji chee na m ga-anọ n'ụdị ọnọdụ a taa na-achọ di m achọ."
Oriaku Agbasimalo kwuru na ya ka nwere olileanya na di ya ka ga-alọta na ndụ.
"Ana m ejigide Chineke, site n'amara ya nakwa ọrụ ebube ya. Onweghị ihe Chukwu apụghị ime. Ọ gaghị enye m di dị mma ma napụkwa m ya n'ime afọ ise. Ana m atụ anya maka ụbọchị Obiora ga-alọghachikwute mụ na ụmụ ya na ndụ. Ụmụ ya na-ajụ m oge niile ụbọchị nna ha ga-alọta."
Onye bụ Obiora Agbasimalo?

Ebe foto si, Obiora Agbasimalo
- Ọ bụ onye ọkaibe na ngụkọ ego, nke bekee na-akpọ 'chartered accountant'
- Ọ bụbu onye ọrụ ụlọakụ tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị
- Ọ bụ onye Ezinifite, Nnewi Saụt.
- Ọ bụ onye inyere ndị mmadụ aka na-amasị dịka o hibere ngalaba na-enyere ndị ụbịam aka ma na-ezigakwa ụfọdụ akwụkwọ n’efu na Naịjiria.
- Ọ bụ onye ihe gbasara ikwalite ndị ntorobia na-anụ ọkụ n’obi, dịka o kwenyere na o ruola oge ndị ntorobịa kwesịrị itinye uchu n’ọchịchị na mwulite obodo.









