Chinwoke Mbadinuju bụbu gọvanọ Anambra Steeti anwụọla

Chinwoke Mbadinuju

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Chinwoke Mbadinuju

Ezinụlọ Mbadinuju ekwuola na Chinwoke Mbadinuju onye bụbu gọvanọ Anambra Steeti anwụọla dịka ọ gbara afọ 78.

Ọ bụ Cheta Chinwoke Mbadinuju kwupụtara nke a ma sị na ọ nwụrụ na Tuzde, ụbọchị 11 nke ọnwa Eprel afọ 2023 n'ụlọọgwụ gọọmentị nke dị n'Abuja dịka ọ rịara obere ahụ.

Cheta kwuru na ha ga-ekwuputa ọkwa maka olili ya n'ọdịnaihu.

Ihe ị kwesịrị ịma maka Chinwoke Mbadinuju

  • Ọ chịrị Anambra steeti malite n’ụbọchị Mee 29 nke afọ 1999 ruo ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2003 n’aha otu People's Democratic Party (PDP).
  • Ọ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaibe na ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa n’ọchichi na mahadum. Ọ gụrụ n’ihu gụọ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mba Briten.
  • Ọ rụrụ ọrụ dịka onye isi nhazi ụlọ mgbasaozi Times International
  • Tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ rụburu ọrụ dịka onye nkuzi na mahadum State University of New York.
  • Ọ rụrụ dịka onye enyemaka aka chịbụrụ Enugu steeti bụ Jim Chris Nwobodo malite na 1979 ruo 1980
  • Ọchịchị n’Anambra hibere otu nchekwa ‘Anambra Vigilante Services’ nke mechara bụrụ otu nchekwa ‘Bakassi Boys’ rụrụ ọrụ nchekwa na steeti ahụ n’oge ahụ.