Ụfọdụ ndị a ka na-achọ achọ n'Ọwụwa Anyanwụ kamgbe 2021 ndị ọrụ nchekwa kpụụrụ ha - Amnesty International

Echefu, Ikechukwu, Henry na Ibeleme

Ebe foto si, Amnesty International

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọọrụ na-ahụ maka ikike dịịrị onye na Naịjirịa bụ Amnesty International kwuru na e gbuola ihe ruru mmadụ otu puku, narị asatọ na iri anọ na anọ (1,844) na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa malite n'ọnwa Jenụwarị 2021 ruo n'ọnwa Juun 2023.

N'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Wenezde 13 Ọgọst, 2025, ha kwuru na ndị a nwụrụ site na mwakpo dị iche iche gụnyere ngagharịiwe, ntọrị, ndị ojiegbe, ndị ọrụ nchekwa, ndị na-achọ mnwereonwe na ndị ọzọ.

Ha gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị mmadụ ka na-efu efu ebe ọtụtụ ndị ọzọ esila n'obodo ha gbaa ọsọndụ n'ihi ọnọdụ nchekwa ọjọọ dị na mpaghara ahụ. Ha kwuru na aka ike ndị ọrụ nchekwa ji na-akpachi ndị na-achọ mnwereonwe ebutela nkwafu ọbara, nke tinyere ọtụtụ obodo n'ihe oke ụjọ.

N'aka nke ọzọ akwụkwọ ozi ahụ kwuru na mwakpo ndị ojiegbe na-eme ma na-egbu ndị gbapụtara ihe, ndị ọrụ nchekwa n'okporoụzọ na mmebi ụlọọrụ gọọmentị nwee gosikwara na ọnọdụ nchekwa adịla ezigbo njọ.

Ha kpọrọ gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa oku ka ha chekwaa ndụ ndị mmadụ ma nwuchie ndị aka ha dị n'imetọ ikike dịịrị onye.

Ụlọọrụ Amnesty kwuru na ndị ọrụ nchekwa jidere ọtụtụ mmadụ n'ebubo na ha bụ ndị otu na-achọ mnwereonwe Ipob ma rute ugbua a ka na-achọ ndị ahụ achọ.

Sunday Ifedi na na nwunye ya Calista Ifedi

Foto Sunday Ifedi na nwunye ya Calista Ifedi.

Ebe foto si, Amnesty International

Nkọwa foto, Sunday Ifedi bụ onye na-arụ oche ebe nwunye ya Calista Ifedi bụ onye nkuzi. Ha mụrụ ụmụ atọ.

Amnesty kwuru na ndị nchekwa DSS di na nwunye a bụ Sunday Ifedi na Calista Ifedi bụ ndị obodo Ezeagu dị n'Enugwu Steeti n'ụlọ ha dị n'Enugwu na 23 Nọvemba 2021.

Kamgbe afọ anọ gara aga o nweghi onye maara ebe ha nọ rute ugbua. Nwa ha nwaanyị dị afọ 21 kwuru na DSS nwụchiri ha ka ha bịa zaa ajụjụ banyere ebubo iso n'otu Ipob.

O kwuru nao zi ikpeazụ ha nwetere banyere nne na nna ya bụ na e burula ha gawa Abuja, na mgbe ha ruru n'ụlọọrụ ha na DSS ekweghi ha bata.

Tochukwu Ibeleme

Tochukwu Ibeleme

Ebe foto si, Amnesty International

Nkọwa foto, Tochukwu Ibeleme mụrụ ụmụ atọ. Ndị ọrụ nchekwa kpụụrụ ya n'ụlọahịa ya dị n'Aba Abia Steeti.

Amnesty kwuru na ndị ọrụ nchekwa nwuchiri Tochukwu Ibeleme gbara afọ iri abụọ na ise (25yrs) n'ụlọ ahịa ya dị n'Aba, Abia Steeti.

Ha nwuchiri ya n'ụbọchị 15 Juun, 2021 maka ebubo na ọ bụ onye otu Ipob.

Ha ahụbeghi ya anya kamgbe ahụ.

Amnesty kwuru na anya hụrụ ka o si mee kwuru na ndị nchekwa bu ụgbọala bịara buru nwamadị a mana ahụbeghi anya kamgbe ahụ.

O kwuru na ọ gaala n'ọtụtụ ụlọọrụ ndị uweojii mana o nweghi ebe a hụrụ ya.

Emmanuel Ikechukwu

Foto Emmanuel Ikechukwu

Ebe foto si, Amnesty International

Nkọwa foto, Emmanuel Ikechukwu bụ onye ose foto lụrụ nwunye ma mụọ ụmụ atọ.

Ndị ọrụ nchekwa tọọrọ Emmanuel Ikechukwu bụ onye ose foto n'ụlọọrụ ya dị na Ngwa Road, Aba nke Abia Steeti maka ebubo ịbụ onye otu Ipob.

Nwamadị a bụ nna ụmụaka atọ ka ndị a nwuchiri n'ụbọchị 8 Julaị, 2021.

Kamgbe ahụ a hụbeghi ya anya dịka anya hụrụ ka o si mee si kọọrọ ụlọọrụ Amnesty International.

Chidiebere Luke Echefu

Chidiebere Luke Echefu

Ebe foto si, Amnesty International

Chidiebere Luke Echefu dị afọ iri anọ na asaa ka ndị ọrụ nchekwa nwuchiri n'ụlọ ya dị n'Owerri, Imo Steeti n'ụbọchị 7 Nọvemba 2021, n'elekere atọ nke isi ụtụtụ.

Nwamadị a bụ onye obodo Umugwano Umuchekekwe dị n'okpuruọchịchị Onuimo n'Imo Steeti mụrụ ụmụ ise.

Nwunye ya dị afọ iri anọ na out na nne ya dị afọ kọọrọ Amnesty International etu e si tọrọ nwamadị a.

Ikechukwu Henry

Henry Ikechukwu

Ebe foto si, Amnesty International

Ikechukwu Henry bụ onye Orlu dị n'Imo Steeti ka ndị ọrụ nchekwa tọọrọ n'ụbọchị 21 Ọgọst 2021 site n'ụlọ ya dị na Garki Enugwu Steeti, n'elekere abụọ nke ụtụtụ (2:00am).

Ndị ọrụ nchekwa boro ebubo na nwamadị a so na ndị otu Ipob.

Nwunye ya dị afọ iri abụọ na asaa (27yrs) kọrọ etu ndị a si tọrọ ya ma kwuo na a hụbeghi ya anya kamgbe ahụ.

Eberechi Ukaegbu

Eberechi Ukaegbu

Ebe foto si, Amnesty International

Ndị ọrụ nchekwa kpụụrụ Eberechi Ukaegbu n'ụlọ ya dị n'Alaukwu-Umuoma n'okpuruọchịchị Obingwa dị n'Abia Steeti n'ụbọchị 21 Maachị, 2021, n'ihe dịka ọkara gafee elekere out nke isiụtụtụ (1:30am).

Ha boro ebubo na ọ bụ onye out Ipob. Ọ dị afọ iri ise mgbe ha jidere ya.

Nwunye ya dị afọ iri atọ na asatọ kọọrọ ụlọọrụ Amnesty International ihe anya ha hụrụ n'ụbọchị ahụ kwuo na ọ hụbeghi ya anya ruo ugbua.

Ihe ndị ọrụ nchekwa kwuru banyere nke a?

Kayode Adeolu Egbetokun bụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa.

Ebe foto si, Nigeria Police Force

N'ozi ndị uweojii Naịjirịa wepụtara n'ụbọchị 16 Ọgọst 2025 n'akara Facebook, Onyeisi ha bụ Kayode Adeolu Egbetokun kwuru na ha ahụla akwụkwọ nchọpụta ahụ ụlọọrụ Amnesty International wepụtara banyere nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ.

O kwuru dịka usoro ọrụ ndị uweojii siri dị nke gbagidere ụkwụ n'ịkwụwa aka ọtọ, na ọ nyela iwu ka ngalaba ọbụla nke a metụtara mee nnyocha banyere ebubo ndị a e boro.

Egbetokun kwuru na ọ bụrụ e mechaa nnyocha a, ndị ha ga-ewepụta akwụkwọ ozi zuruoke ga-eleba anya n'ebubo ndị ahụ ma saa ha n'otu n'otu.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii ga-aga n'ihu na-arụ ọrụ dịka ntọala si dị nke gụnyere ịkwanyere ikike dịịrị onye ukwu dịka iwu si kwuo.

BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ tupu akụkọ a apụta.