Amnesty International na-akwado ndị Ipob n'arụ ha na-akpa - Gọọmentị Naịjirịa

Amnesty International na IPOB

Gọọmentị Naịjirịa akatọọla otu na-ahụ maka ikike dịri onye na mba ụwa bụ Amnesty International maka etu ọ sị na ha na-akwado ndị Indigenous People of Biafra (Ipob).

N'ozi si n'aka Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari, gọọmentị kwuru na Amnesty International enweghi ikike ịrụ ọrụ na Naịjirịa n'ihi na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eji ha achọ ihe nke akpa ha.

IPOB

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti

Garba Shehu kwukwara na "Amnesty International anaghị eme ihe ha na-asị ndị ọzọ mee", kwukwaa na "Amnesty na-akwado ndị oyi ndụ egwu".

"Amnesty International so na ndị na-agba mbọ ime ka okwu Nnamdi Kanu na ndị IPOB na-ada ụda na mba ụwa."

"Ọtụtụ ndị ọzọ na mba ụwa ka a na-akwụ puku kwuru kwuru dọla kwa afọ ka ha na-asacha aha ndị IPOB."

"IPOB bụ ndị na-eyi ndụ egwu. Ha na-egbu ụmụ Naịjirịa kwa ụbọchị."

"Ha egbuola ọtụtụ ndị uweojii na ndị agha, ma gbaa ọtụtụ ụlọ gọọmentị ọkụ."

"Ọ bụrụ na otu a dị na mba mepere emepe, ị gaghị anụ ebe Amnesty na-akwuchitere ha."

Garba Shehu gara n'ihu kwuo na gọọmentị Naịjirịa agaghị atụpụrụ ndị Amnesty International ọnụ, kama ha ga na-aga n'ihu n'ịgba mbọ ikpochapụ ndị na-eyi ndụ egwu.