Etu ndị omekome si ejizi mmanwụ 'Akatakpa' awakpo ma na-ezu ndị mmadụ ohi n'Enugwu steeti

Mmanwụ Akatakpa abụọ ka e do ha apụ n'ọgbọ egwu.

Ebe foto si, Screenshot

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Gọọmenti amachiela mmanwụ Akatakpa n'obodo Nsukka dị n'Enugwu Steeti maka etu ụfọdụ ụmụokoroọbia si e ji ya eme mpụ dị iche iche.

Nke na-abịa dịka mmanwụ Akatakpa ndị obodo Iheakpụ-Awka dị n'okpuruọchịchị Igboeze South wakporo ndị njem si Kogi Steeti abata na Nsukka n'ụbọchị Mọnde 18 Ọgọst, 2025 ma meruo ụfọdụ n'ime ha nnukwu ahụ, nke bugaara ha n'ụlọọgwụ.

N'ihi nke a gọọmenti okpuruọchịchị Igboeze South wepụtara ozi kwuo na ha amachiela onye ọbụla iti mmanwụ Akatakpa malite na Tuzde 19 Ọgọst ruo na ngwụcha afọ 2025.

"Mmanwọ Akatakpa ọbụla pụtara ezi site 19 Ọgọst ruo ngwụcha afọ 2025 gaa aga n'ụlọikpe ikpe zara ọnụ ya dịka iwu siri kwuo."

Onyeisioche Igboeze south bụ ọkaikpe Ugo Ferdinand Ukwueze kwuru na ọ bụ ihe dị mma ka omenala na-adịgide mana o kwesighi ka e were omenala na-eme arụ, ezu ohi, na-emeru mmadụ ahụ dịka ndị Akatakpa si eme.

Ọ kọwara "Anyị na ndị ọrụ nchekwa na ndị obodo Iheakpụ-Awka nwere nzụkọ, mee nnyocha wee kwekọrịta na ọ ka mma ka a machie mmanwụ a"

O kwuru na ọchịchị ya ga-enyocha ma jide ndị ọjọọ nille ahụ iji chekwaa ndụ na akụnaụba ndị mmadụ.

Ka ọ dị ugbua ndị nchekwa ga-ejide mmanwụ ọbụla kpọchiri ntị pụta ezi ka e gosi ya "ihe ọkụ ji ntị oke eme."

Ndị ndu obodo Iheakpu-Awka dị n'Enugwu Steeti

Ebe foto si, Ikeakpu-Awka Union/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onyeisioche Ugo Ferdinand Ukwueze mere njem gaa Iheakpu-Awka na Iheakpu-Ulo ngwa ngwa ọ nụrụ maka ihe mere.

Ndị eze nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu gwara ya ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi na ụmụokoroọbịa na-eti mmanwụ ahụ anaghị ege ntị na ntuziaka ndị ndu obodo kama ha na-eme ihe masịrị ha.

Ukwueze ji ohere ahụ kwuo na okpuruọchịchị ya ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ nwoke ahụ bụ Yusuf si Kogi steeti bụ onye mmanwụ Akatakpa meruru nnukwu ahụ.

O kwekwara nkwa imezi ụgbọala nwoke ahụ ha mebiri.

Ọtụtụ mmanwụ a ndi a bụ nke na-ewetebu obi aṅụ ma a na-eti ha bụzị ihe na-ebute obi ọjọọ na iyi egwu na gburu gburu Nssukka Asadu, Enugwu Steeti.

Ụfọdụ mmanwụ ụmụokoroọbịa jizi akpa arụ ugbua gụnyere mmanwụ Oriọkpa, mmanụ Omebe na mmanụ Akatakpa.

N'ọnwa Mee afọ 2024, mmanwụ Oriokpa pịara otu nwagbọghọ bụ onye nọọsụ ihe ma merụọ ya ahụ nke mere e jiri buga ya n'ụlọọgwụ.

N'otu aka ahụ, mmadụ abụọ nwụrụ na Nsukka n'ọnwa Sepụtemba afọ 2024 ebe ha na-agba ọsọ mgbe mmanwụ Oriokpa na-achụ ha.

Otu n'ime ha bụ nne nwaanyị gbabara n'ụkwụ ụgbọala Tanka bụ nke kwọriri ya ka ọ na-agba ọsọ.

Nke a mere ka gọọmenti machie mmanwụ Oriokpa ruo otu afọ mana ugbua ọ bụzi mmanwụ Akatakpa na-akpazi ike.