Blessing Ogbonna: Ndị uweojii ataala mmanwụ Oriọkpa Nsuka maka mpịawa ahụ

Ebe foto si, NPF
Aka ndị uweojii akparala mmanwụ ọrịọkpa maka ebubo ịpịawa otu nwaanyị akpọghị aha ya ahụ n'Ugwuoye Junction dị na Nsuka, Enugu steeti.
Ndị uweojii gara n'ihu taa onye ti mmanwụ ahụ bụ onye ha nyere aha ya dịka Ebube Ugwuoke gbara afọ 22 ma kpụpụ ya ụlọikpe.

Ebe foto si, NPF
Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ka Oriọkpa na-apịa nwaanyị ihe n'okporoụzọ na-agbanyeghị na e tinyere mmachi mmanwụ ahụ ịgba.
Ndị eze ọdịnala na ndị ndu obodo mpaghara Nsuka tinyere mmachi na Oriokpa agaghị agba ganye ma e mecha nnyocha etu mmiri si banye opi ụgbọgụrụ dịka ndị oriokpa karịrị atọ pịanyere otu nọọsụ na-aga ọrụ a kpọrọ Blessing Ogbonna ajụ n'anya na nkwụcha ọnwa Eprelụ, afọ 2024.
N'ozi si ọnụ na-ekwuru ndịuweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe kwuru sị , "Ndị uweojii , nagalba ndị na-ebu agha megide ndị otu nzuzo nwuchiri otu mmanwụ a ma ama dịka oriọkpa dịka ha hụrụ ya ka ọ na-apịa nwaanyị ihe n'Ugwuoye Junction, Nsukka. E mechara mata aha onye kpu mmanwụ ahụ bụ Ugwuoke Ebube gbara afọ 22 nke ụlọ dị na Okporoụzọ 'Enugu Road, Nsuka."
"Taa bụ Mee 22, afọ 2024, a kpụrụ ya ụlọikpe Majie dị na Nsuka bụ ebe e neyere ya o here ka o si n'ụlọ abịa ikpe."
Ọ gara n'ihu gbaa ama na nchọpụta ndị uweojii merela gosiri na nwaamadi ahụ so na otu ndị mmanwụ Oriọkpa kụrụ nọọsụ nọ n'elu ọgbatumtum ihe dịka ọ na-aga ọrụn'ọnwa Eprelu, afọ 2024.
O kwuru na Kọmịshọna ndị uweojii nke steeti ahụ bụKanayo adọọla aka na ntị sị na ndị uweojii agaghị enye ohere ka ụfọdụ ndị mmadụ zoo n'okpuru ime omenala na- emekpa ndị obodo ahụ.
Blessing Ogbonna: Ihe Bishop Onah kwuru maka mmanwụ Oriọkpa

Ebe foto si, CATHOLIC DIOCESE OF NSUKKA/FACEBOOK
Bishop ụka Katolik na Nsụka bụ Most Rev. Godfrey Igwebuike Onah agwala ndị nne na nna ka ha bilie n’ọrụ ha ma nye ụmụ ha ezigbo ọzụzụ.
O kwupụtara nke a mgbe ọ na-ekwu okwuchukwu n’ụbọchị ụka Sọnde 5 Mee 2024 bụ nke o jiri katọọ akparamaagwa Oriọkpa Nsụka maka ịpịa ndị mmadụ ụtarị aghara aghara.
Ọ sịrị na ọtụtụ ụmụokorobịa Nsụka ajụla ịmụ ọrụaka dị icheiche n’ihi oke mmasị ha nwere maka mmanwụ Oriọkpa.
Ọ katọrọ ụzọ mmanwụ ahụ si ebutere ndị mmadụ ihe mmerụahụ tụmadụ onye ọrụ nọọsụ bụ Blessing Ogbonna, bụ onye ha merụrụ nnukwu ahụ na nso nso a.
Blessing Ogbonna: Ọ bụrụ na e jideghị ndị mmanwụ tiri nọọsụ ihe, ndị Igwe na-achị ebe ahụ ga-enwe nsogbu - Gọọmentị Enugu

Ebe foto si, Blessing Ogbonna/ Aka Eze Aka
Gọọmentị Enugwu steeti ekwuola na ha amachiela ịgba mmanwụ na mpaghara Nsuka iji nye ohere inyocha ihe mere dịka ndị mmanwụ pịatọrọ otu nwa nọọsụ n'aga ọrụ na nsonso a.
Ndị mmanwụ Oriọkpa paturu nwa ada Blessing Ogbonna n'abalị 28 nke ọnwa April dịka oọ kwọ ogbatumtum ya aga ọrụ, merụọ ya nnukwu ahụ bugara ya ụlọọgwụ.
Kọmishona mgbasaozi steeti ahụ bụ Aka Eze Aka gwara BBC Igbo n'ekwentị na "obi adịghị gọọmentị maka ihe mere", ma kwuo ha na-ama imi ala ịnwuchusi ndị mere ya bụ ihe.
"Gọọmentị ekwuola na Oriọkpa agaghị agba ọzọ rue ma e mecha ihe nile aga eme gbasara okwu a."
"O kwuru na "Ọ bụghị nanị otu onye mere ihe ahụ, anyị na-achọ ka e jidekọta ndị mere ihe ahụ."
"Ọ bụrụ na ejideghị ha, ị mara na ndị igwe nọ ebe ahụ nọ na nsogbu."
Aka gara n'ihu kwuo na gọọmentị ekpebiela iwega okwu ahụ ụlọomeiwu ka ndị omeiwu steeti ahụ mee iwu ga-ahazi etu mmanwụ ga-esi agba na steeti ahụ.
Anọọla m n'ụlọọgwụ abalị asaa kemgbe ihe m gabigara n'aka mmanwụ Oriọkpa

Ebe foto si, Blessing Ogbonna

Ebe foto si, Anioke/Screengrab
Otu onye ọrụ ahụike ahụla onwe ya n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata nleta ahụike dịka mmanwụ a kpọrọ Oriọkpa pịanyeere ya ajụ n'anya.
Blessing Ogbonna, onye nọọsụ nọ n'ọgbatumtum aga ọrụ oge ndị mmanwụ wakporo ya pịa ya gwogwo.
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri aka ike ndị mmanwụ ruru ise jirị ụtarị kụtọli Nwaada Ogbonna nke mere ka ọ si n'ọgbatumtum dapụ n'okporoụzọ.
Kemgbe akụkọ agwa ndị mmanwụ kpasara Nwaada Ogbonna pụtara ihe, ọtụtụ ndị mmadụ na soshail media na-akwa n'ihu na ihu gụnyere ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye akọtọọla ya bụ ihe, sị na ọ jọgburu udele sie nkapị n'isi.
Ha tụrụ arịrị na ụfọdụ obodo jizi omenala na-eme mpu megide ikike dịrị onye nakwa iwu obodo.
Ihe ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye kwuru
Otu ndị si Nsukka na-ahụ ka Omenala si aga bụ Otobo Nsukka Development ji iwe kwuo na oge eruola mgbe a ga- akwụsị ya bụ mmanwụ, n’ihi na ndị arụ, ndị ohi nakwa ndị enweghị aka ọrụ jizi mmanwụ Oriọkpa ahụ akpa ike ọjọọ.
Onyeisi otu ahụ bụ Prince Chibeze Onah na Mazi Agu Chineme kpọrọ oku ka e mechie ma machie ya bụ mmanwụ.
Ha megidere ikike dịịrị nwata nwaanyị ahụ-Heroine Women Foundation
Onyeisi otu 'Heroine Women Foundation bụ Onyinye Mama katọrọ mmanwụ ahụ, ma kwaa arịrị na ọ bụkarị ụmụnwaanyị ka ha na-apịa nnukwu itari were kwukwaa na ihe a megidere ikike dịrị nwata nwaanyị nọọsụ ahụ dịka nwa afọ Naijiria.
'Ndị mmanwụ pịara Ogbonna ụtarị dara iwu obodo' - PG, Ihe-Nsuka

Ebe foto si, Amoke Chijioke
Onyeisi ọha obodo(President General) Ihe Nsuka bụ Ichie Anioke Ndụka kọwara na ndị ndu obodo Ihe na Owere Nsuka ebe ihe ahụ mere gbarụụ ihe maka agwa ndị mmanwụ ahụ kpara.
Na mkparịtaụka ya ana BBC Igbo nwere n'ekwentị ụbọchị Wenezde , ọ sịrị na ha ejikotala aka ọnụ ime nnyocha iji chọpụta ndị mmanwụ tara nwaagbọghbịa Nọọsụ ụtara ma merụọ ya ahụ, ma taa ha ahụhụ maka ịda iwu obodo.
O kwuru na iwu mmanwụ megidere ịpịa onye nọ n'elu ọgbatumtum maọbụ onye na-aga ọrụ ụtarị.
"Iwu anyị bụ nani otu ugboro n'ọnwa ka mmanwụ ga-agba."
"Ọzọ bụ na mmanwụ agaghị na-apụta n'okporoụzọ,(main road) kama ọ bụ n'ụzọ dị n'ime ime obodo.".
"Oriọkpa bụ ihe egwuregwu, ihe nlere anya."
"Anyị na-esi ọnwụ na anyị ga-amarịrị ndị mere ihe ahụ."
Mmanwụ ga-akwụsị ịpụta rue ma e mechaa nnyocha- onye ndu ndị ntọrọbia

Ebe foto si, Anioke
N'otu aka ahụ, onyeisi otu ụmụokorobia ndị Ihe-Nsuka bụ Ichie Chinwuba Ngwoke kwuru na "ihe mere Ụbọchịụka ahụ abụghị ka obodo si kwuo ka mmanwụ si mebe."
O kwuru na ha agala galeta nwatanwagbọghọ ahụ emerụụ arụ' iji gosi ya na ọ bụghị anyị si mmanwụ mebe ihe ha mere."
" Nwaanyị anaghị aga ebe mmanwụ anyị nọ, mana ebe o yi akwa nọọsụ, a kara ịhapụ ka ọ gawa ebe ọ na-aga."
" Enwere nnupu isi na mmadụ nwee nnupụisi na mmụọ."
"Mmụọ bụ mmụọ mana ọ bụrụ na mmadụ anọghị na mmụọ, ."
"Mmanwụ ga-akwụsịgodi ịpụta rue oge elebachara naya ebe mmanwụ ahụ si pụta."











