Hope Uzodimma: Iwu Naịjirịa ọ kwadoro Gọvanọ ịhọpụta onwe ya dịka kọmịshọna?

Ebe foto si, HOPE UZODIMMA/INSTAGRAM
Dịka Gọvanọ Hope Uzodimma bunyere onwe ya ọkwa kọmịshọna na-ahụ maka ala n’Imo steeti, ajụjụ ọtụtụ kpụ n'ọnụ bụ iwu ọ kwadoro gọvanọ ịbụ gọvanọ ma jidekwa ọkwa Kọmịshona steeti ya? Kedụ ihe iwu kwuru banyere ọnọdụ dị otu a?.
Otu onye ọkaiwu a ma ama n’Owerri bụ Obulimba Canice Madukaji, gwara BBC Igbo na e nweghị mpaghara iwu Naijiria kwuru kpọmkwem na gọvanọ enweghị ikikere ịhọpụta onwe ya dịka kọmishọna.
Obulimba sịrị na ebe o siri dị ka gọvanọ dara iwu bụ na iwu Naịjirịa kwuru na tupu e hiwe mmadụ ọbụla dịka kọmịshọna, ụlọomewu steeti ahụ ga-ebu ụzọ mee onye ahụ nnyocha mana ụlọomeiwu Imo steeti emeghị Uzodimma nnyocha tupu ọ banye n'ọkwa kọmịshọna.
Ọ gara n’ihu kwuo na iwu na-ahụ maka ụzọ e si eji ala eme ihe bụ ‘Land use act’ kwupụtara na ala niile dị gọọmenti n’aka, nke pụtara na ala dị na steeti ọbụla dị n’aka gọvanọ steeti ahụ.
Onye ọkaiwu ọzọ bụ Nnenna Anozie kọwara na Uzodimma adaghị iwu ọbụla ịhọpụta onwe ya dịka kọmịshọna.
Ọ sịrị na iwu Naịjirịa nyere ndị gọvanọ na onyeisiala ikikere ịhọpụta onye ọbụla masịrị ha dịka kọmịshọna maọbụ minista bụkwanụ nke mere onyeisiala pụrụ apụ bụ Muhammadu Buhari jiri họpụta onwe ya dịka minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị.
Dịka Nnenna siri kwuo, ọ bụ naanị ọkwa ndị a na-esite na ntụliaka a họpụta ka iwu Naịjirịa na-elebara anya.

Ebe foto si, HOPE UZODIMMA/INSTAGRAM
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma họpụtara onwe ya dịka kọmịshọna na-ahụ maka ala na steeti ahụ.
Uzodimma mara ọkwa a n’ụbọchị Tuzde 30 Eprel 2024 n’oge ọ na-edu ndị kọmịshọna a họpụtara ọhụrụ n’iyi ọrụ n’Owere.
O kwuru na mkpebi o nwere ịhọpụta onwe ya dịka kọmịshọna na-ahụ maka ala bụ n’ihi ọtụtụ mkpesa o nwetara maka ndị ọ họpụtara n’ọkwa ahụ n’oge gara aga.
Dịka o siri kwuo, ọtụtụ mmadụ boro kọmịshọna ji ọkwa ahụ n’oge gara aga ebubo ịganye aka n’ohi ala nakwa nrụrụaka ndị ọzọ dị icheiche.












