Etu e si lie Sịnetọ Ayogu Eze n'ụlọ ya dị n'Enugu steeti

Elimozu Sịnetọ Ayogu Eze

Ebe foto si, Sen Chijinkem Ugwuanyi

Nkọwa foto, Elimozu Sịnetọ Ayogu Eze

E liela Sinetọ Ayogu Eze onye bụbu Sịneto nọchitereanya Enugu North n'ụlọ omeiwu Sịneti Naịjirịa.

Elimozu ya mere taa bụ Fraide abalị 14 ọnwa Juun 2024 n'ụlọ ya dị na umuida n'okpuruọchịchị Igbo Eze North dị na Enugu steeti.

Ndị a ma ama nọ na elimozu ahụ gụnyere; osote aka na-achị Enugu steeti, Ifeanyi Ossai, aka chiburu Enugu steeti, Ifeanyi Ugwuanyi, aka chiburu Anambra steeti, Peter Obi, mịnista na-ahụ maka sayensị na teknụzụ, Uche Nnaji, ndị eze ọdịnala, ndị ụkọchukwu, ndị enyi na ọtụtụ ndị ọzọ.

Sinetọ Ayogu Eze nwụrụ n'ụbọchị Tozde 25 Eprel, 2024.

Foto Ifeanyi Ugwuanyi na Osote gọvanọ Enugu steeti, Ifeanyi Ossai

Ebe foto si, Sen Chijinkem Ugwuanyi

Nkọwa foto, Foto Ifeanyi Ugwuanyi na Osote gọvanọ Enugu steeti, Ifeanyi Ossai
Foto Peter Obi na ndị ozo n'akwamozu Sịnetọ Ayogu Eze

Ebe foto si, Sen Chijinkem Ugwuanyi

Nkọwa foto, Foto Peter Obi na ndị ozo n'akwamozu Sịnetọ Ayogu Eze
Foto ndị ụkọchukwu n'akwamozu Sịnetọ Ayogu Eze

Ebe foto si, Sen Chijinkem Ugwuanyi

Nkọwa foto, Foto ndị ụkọchukwu n'akwamozu Sịnetọ Ayogu Eze

Onye bụ Ayogu Eze nke onyeisiala Tinubu, Peter Obi na Atiku na-ebe akwa maka ọnwụ ya?

Ayogu Eze

Ebe foto si, NTA

Onyeisiala Bola Tinubu zigara ezinaụlọ Sinetọ Ayogu Eze ozi nkasi obi maka ọnwụ ya. Onyeisiala kọwara na nwaamadi ahụ bụ ezigbo nwa afọ gbara mbọ maka ọdimma obodo Naịjirịa.

N’ozi onye ndụmọdụ pụrụ iche nye onyeisiala Ajuri Ngelale binyere aka, onyeisiala Tinubu kpere ekpere ka chineke mee ka mkpụrụ obi Ayogu Eze zuru ike maa kasie ndị na-eru uju obi.

Ndị ọzọ zitere ozi nkasiobi nye ezinaụlọ Sinetọ Ayogu Eze gụnyere, onye bụbụ osote onyeisiala Atiku Abubakar, aka chibụru Abia steeti Orji Uzor Kalu, aka chiburu Anambra steeti Peter Obi, sinetọ nọchitere anya Enugwu Nọt n'oge gara aga bụ Chukwuka Utazi na onyeisioche pati PDP n’okpuru ochichi Enugu Nọt, Nze Mike Onyeze na ọtụtụ ndị ọzọ.

Otu onye ọrụ gọọmentị Enugwu steeti achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC o na Eze nwụrụ n’ụtụtụ ụbọchị Tọzde dịka ọ rịachara ọrịa obere oge.

Atiku Abubakar, Peter Obi, Orji Uzor Kalu, Chukwuka Utazi

Ebe foto si, Atiku Abubakar, Peter Obi, Orji Uzor Kalu, Utazi/Getty/Instagram/facebook

Nkọwa foto, Atiku Abubakar, Peter Obi, Sinetọ Orji Uzor Kalu, Sinetọ Chukwuka Utazi

Ihe i kwesiri ịma maka Sinetọ Ayogu Eze nwụru anwụ

  • A mụrụ Sinetọ Ayogu Eze n’abali 23 Nọvemba afọ 1958 n’Ụmụịda, obodo dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Eze North Enugwu steeti, ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
  • Eze gara ụlọakwụkwọ nchịkwa na teknụzụ (IMT) Enugwu, ebe ọ nwetara Higher National Diploma na Mass Communication. Ọ gakwara International Institute for Journalism nke dị n’mba Jamini, Mahadum Lagos, ụlọakwụkwọ etiti Harvard Kennedy, Mahadum Oxford na Mahadum Cambridge.
  • Ọ rụrụ ọrụ ka kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala na kọmishọna na-ahu make omenala na ogbe nlegharị anya n’Enugwu steeti bido n’afọ 2001 ruo afọ 2006.
Ayogu Eze rụrụ ọrụ kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Enugu steeti

Ebe foto si, Ayogu Eze/Facebook

Nkọwa foto, Sinetọ Ayogu Eze
  • A họpụtara ya dịka Sịneto ndị Enugwu Nọt n’onwa Jun 5, 2007 ruo afọ 2016Mgbe ọ nọ n’Sineti, a họpụtara ya dịka onyeisioche kọmitii sineti na na-ahu maka mgbasa ozi.
  • N'ime afọ asatọ ọ nọrọ na sineti, o so na kọmitii depụtara akwụkwọ na mmezigharị na mgbanwe ụfọdụ akwụkwọ iwu Naịjirịa afọ 1999. N’afọ 2011, a họpụtara ya dịka onyeisioche kọmitii sineti na-ahụ maka ọrụ.
  • Sinetọ Eze rụkwara ọrụ dịka onye otu kọmitii sineti n’ihe gbasara ndị uwe ojii, Nghazi obodo, njem mmiri ya na ministri na-ahu maka nkesa ọkwa ọrụ n’Naịjirịa.
Akwụkwọ achụmtavootu ọkwa Gọvanọ Sinetọ Ayogu

Ebe foto si, Ayogu Eze/Facebook

Nkọwa foto, Akwụkwọ achụmnta vootu ọkwa Gọvanọ Sinetọ Ayogu Eze n'afọ 2019
  • Eze zoro ọkwa gọvanọ Enugwu steeti na ntuliaka nke afọ 2015 n'okpuru pati PDP.
  • Ọ dara na ntuliaka ime ụlo PDP nke ọ bụ Ifeanyi Ugwuanyị turu ugo. Ntuliaka ime ụlọ ahụ nwere ọtụtụ ọgbaaghara nakwa igba akwụkwọ n’ụlo ikpe.
  • N’afọ 2018, Eze banyere pati APC wee zọọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati APC n’afọ 2019 mana ọ hapụrụ ntuliaka ahụ mgbe ụlọ INEC wepụrụ aha ya na-ndeputa akwụkwọ ikpeazụ ndị ga-azọ ọkwa ọchịchị gọvanọ ahụ.

Ruo mgbe ọ nwụrụ, Sinetọ Ayogu Eze bụ onye nnọchite anya Enugu steeti na RMFAC (Revenue Allocation Mobilisation and Fiscal Commission) ma soro na ndịisi oche otu Nigerian Ports Authority (NPA).

  • Ọ gbara afọ 66 tupu o nwụọ.