Nigeria 2019 Election: Onye ji ọkọlọtọ APC n'Enugu Steeti?
Ọ ka na-agba ndị mmadụ gharịị onye ga-eji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'Enugu Steeti site n'ikpe ọhụrụ Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja chabiri.
Ọkaikpe Inyang Ekwo nyere iwu ka eziga aha George Ogara n'ụlọọrụ INEC dịka onye ga-eji aha APC azọ ọkwa n'Enugu Steeti.
O kwuru na Ogara nwetere vootu kachasị na ntuliaka ime ụlọ ndị APC mere na steeti ahụ n'afọ gara aga.
Na nzaghachị, Ayogu Eze gwara BBC Igbo na mkpe ahụ ọkaikpe Ekwo nyere abụghị nke ziri ezi.
O kwuru na ọ gbaala akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị (Apeal Court), bụ nke ga-amalite n'izuụka na-abịa.
Mana onye na-anọchite anya George Ogara n'okwu ndọrọ ndọrọ bụ Ejiofor Agada kwuru na-onweghi akwụkwọ ọbụla ụlọikpe ọbụla nyere ha.
Kama na ọ bụ akwụkwọ ọkaikpe Ayogu Eze degara ụlọọrụ INEC na-arịọ ha ka a ghara iwepụta aha Ogara dịka onye na-anọchite APC n'Enugu.
Ọ gara n'ihu kwuo na Ayogu Eze na osote ya abụghị ndị otu APC dịka ụlọikpe siri kwuo.
BBC Igbo gbara mbọ inweta onyeisi Inec n'Enugwu mana ọzaghi ekwentị ya.













