Mahamat Deby, onyeisi ndịagha Chad emeriela na ntụliaka onyeisiala

Ebe foto si, Reuters
Onyeisi ọchịchị ndịagha mba Chad bụ Mahamat Déby eturula ugo na ntụliaka onyeisiala e mere na mba ahụ.
Dika ozi si n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka siri kwụ, Generalụ Déby ji vootu dị pasentị 61.3% merie onye ya na ya zọrọ bụ Praim mịnsta Success Masra, onye nwetara vootu dị pasentị 18.53%.
Mazị Masra na mbụ kwupụtara na ya meriri n'agba nke mbụ ntụliaka aka ahụ.
O mere ka a mata na Déby ezuola mmeri ya.
Gen Déby, onye gbara afọ 40 nwere ọkwa dịka onyeisi ndịagha mba ahụ ka e gbuchara nna n'agha ya na ndị agha nnupụisi n'Eprel afọ 2021.
Mmeri ya pụtara na ezinụlọ Déby ndị nọọrọla n'ọchịchị ihe ruru afọ 34 ga-aga n'ihu.
Mgbe e kwuputachara mpụtara ntụliaka ahụ, ndị nkwado ndị otu pati ya jupụtara okporoụzọ N'Djamena iji mee mmemme mmeri Gen Déby.
N'okwu mmeri ya e tinyere na ọba ozi soshal midịa, o kwere nkwa na ọ ga-abụ ezi onye ndu ndị Chad niile ozi - ndị họpụtara ya dika onyeisiala.
Chad Elections: Ihe i kwesiri ịma maka ntuliaka mba a

Mba Chad na-eme ntuliaka ọkwa Gọvanọ ga-emechi afọ atọ kemgbe ha nọ n'ọchịchị nwa oge.
Onyeisioche National Election Management Agency bụ ngalaba na-ahazi ya bụ ntuliaka bụ Ahmed Bartchiret bụ onye kwuputara ụbọchị a dịka ụbọchị ntuliaka ahụ.
O kwuru na mpụtara mbụ ga-apụta n'ụbọchị 21 nke ọnwa Mee ebe nke ọzọ ga-apụta ụbọchị 5 nke ọnwa Juun.
Ntuliaka na-aga n'ihu ugbua dịka a na-anụ kepu kepu nsogbu n'ụfọdụ ebe dịka ọgbọ ntuliaka ka mere mgbachi dịka otu elekere gachara ntuliaka malitere.
Onyeisala obere oge ahụ bụ Mahamat Deby kwuru na o mezuola nkwa o kwere ikwado ụbọchị a ga-eme ntuliaka dịka o kwuru na ha "alaghachila n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya".
A na-atụ anya na ihe ruru mmadụ nde asatọ (8m) ga-apụta tuo vootu na ya bụ ntuliaka.
Mahamat Idriss Deby

Ebe foto si, Getty Images
Mahamat gbara afọ 40 bụ onye n'azọ ọkwa n'okpuru United Chad Coalition bụ nchịkọta ihe ruru otu ndọrọndọrọ narị abụọ.
A ma dịka 'Gen Kaka' dịka o banyere ọkwa ọchịagha n'afọ 2010. Rue mgbe nna ya nwụrụ, ọ na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị nchekwa onyeisiala bụ DGSSIE n'ịchafụ.
O bu ụzọ kwe nkwa na ọchịchị nwa oge ya ga-abụ naanị otu afọ na ọkara mana o mechara jiri afọ abụọ dọtịa ya nke butere ngagharịiwe tara isi mmadụ 200 ma dunye kwa ihe karịrị otu puku n'ụlọ mkpọrọ.
Ọ na-ekwe ndị mba ya nkwa ikwalite udo nakwa mmezi obodo. O kwekwara nkwa na ọ gaghị eme ọchịchị mba Chad nke ezinaụlọ Deby.
Succès Masra

Ebe foto si, Getty Images
O tobeghi aka, ya bụ n'ọnwa Jenụwarị afọ a ka Ọchịagha Mahamat kpọpụtara aha Masra dị afọ 40 dịka Praịm Minista mba ahụ.
Ọ na-azọ ọkwa n'okpuru otu Transformers bụ nke o hibere n'afọ 2018. Mkpebi ụlọikpe kachasị nke mba ahụ gbochiri ya ịzọ ọkwa n'afọ 2021 dịka ọ na-akatọ ọchịchị ezinaụlọ Deby.
Ndị mmadụ akatọọla ya na ọ na-azọchitere Mahamat ọkwa onyeisiala bụ nke ọ gọrọ.
Ọ na-ekwe nkwa na ọ ga-eme mba ahụ obodo ya na mba Fransị ga na-arụkọ ọrụ ọnụ.
"Na njikọ a ga-enwe isi bụ na ahapụrụ ụfọdụ ihe ka ọ bụrụ ihe gara aga" ka ọ gwara otu ụlọ ntaakụkọ mba Fransị.
Tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ọkammụta ihe gbasara akụnaụba obodo na African Development Bank (AfDB).
Albert Pahimi Padacke

Ebe foto si, Getty Images
Padacke bụ aka ochie na ndọrọndọrọ ọchịchị na-azọ ọkwa n'okpuru otu National Rally of Chadian Democrats - Revival (RNDT-Le Reveil).
Ya na Idriss Deby azọbuola ọkwa onyeisiala n'afọ 2006, 2011 nakwa 2021.
Ọ rụbuola ọrụ dịka Praịm Minista n'ọchịchị Deby nke nwụrụ site n'afọ 2016 rue 2018 ma rụkwa ya bụ ọrụ n'okpuru nwa Deby site n'ọnwa Eprelu rue ọnwa Ọktoba afọ 2021.
Padacke dị afọ 57 akatọọla egwuregwu dị n'etiti Mahamat na Masra ma na-ekwu na o megidere njikọ mba Chad.
O kwenyeghi na iwu ala ọhụ ma kwe nkwa ịweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya ma o merie ntuliaka a.
Lydie Beassemda

Ebe foto si, Getty Images
Beassemda dị afọ 50 bụ naanị nwaanyị na-azọ ọkwa onyeisiala a.
Ya bụ onyeisi otu Party of Democracy and Integral Independence (PDI) kemgbe afọ 2018 mgbe nna ya Beassemda Djebaret Julien bụ onye kpokọrọ otu ahụ nwụrụ.
N'afọ 2021 ọ bụ nwaanyị mbụ zọrọ ọkwa onyeisiala na mba Chad ma ritekwa ọkwa onye nke atọ.
Beassemda abụbuola Minista na mba ahụ site n'afọ 2018 rue 2019 nakwa ọzọ n'afọ 2021 rue 2022.
O na-ekwe nkwa ịwụlite ọrụ ugbo, ịkwalite agụmakwụkwọ nakwa ịgbanwe ọchịchị ka e nwee ọchịchị n'etiti.









