Etu mba Senegal si wee nabata Bassirou Diomaya Faye ka o meriri ntuliaka

Bassirou Diomaye Faye

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Bassirou Diomaye Faye dịka a kpọpụtara ya dịka onye meriri ntuliaka mba Senegal

A họpụtala Diomaya Faye dịka Onyeisiala mba Senegal.

N'ụbọchị 24 Maachị ka e mere ntulịaka nke Onyeisiala mba ahụ.

Ka e mechara ntụlịaka, e meriri otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke na-achị na mba ahụ.

Nke a kpatara Onyeisiala mba Senegal na-apụ apụ bụ Macky Sall na ndị ọzọ jịrị bụrụ ụkpa ekele bụgara Bassirou Diomaye Faye bụ onye na emerị na ntụliaka ahụ, dịka ntụlịaka ndị nke a kpọpụtagọrọ ugbua sịrị gọsịpụta.

A na-ahụ Bassirou Diomaye Faye dịka onye ga-emerị na ntụlịaka ahụ.

Ihe onyeisiala mba Senegal, Macky Sall nwere ikwu

Macky Sall bụ Onyeisiala Senegal na pụ apụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Macky Sall bụ Onyeisiala Senegal na pụ apụ

Macky Sall buru ụzọ kelee ndị mba Senegal bụ ndị biara tụọ vọọtụ na ntụlịaka ahụ ma nabata ka e sịrị mee ntụlịaka ahụ n'ụbọchị Maachị 24, 2024 na-enweghị ọgbaaghara.

N'okwu Sall “M na-ekene Bassirou Diomaye Faye maka ịtụrụ ugo na ntụlịaka ahụ. Mmerị o merịrị bụ ihe dị mma dịịrịla ndị Senegal niile. Nke a bụ mmerị ọchịchị onye kwụọ uche ya na mba Senegal”.

“A na m ekenekwa ụmụ Senegal nịle e tu ha sịri kpaa ezị agwa oge ntụlịaka”.

Amadou Ba ekelela Faye ma kweta na emerịrị ya na ntụlịaka

Onye bụbụ Praịm mịnịsta, Amadou Ba zịgara ụkpa ekene nwere kelee onye merịrị na ntụlịaka mba Senegal bụ Bassirou Diomaye Faye.

O kenere Faye tụpụụ ndị ọrụ nchịkọta ntụlịaka na mba ahụ akpọpụta onye ahọpụtara dịka onye isiala.

Na okwu ya “dị ka ntụlịaka sịrị gaa na ịhe m na ahụ, a na m ekene Bassirou Diomaye Faye bụ onye merịrị agba nke mbụ na ntụlịaka dị ka okwe sịrị gbaa”.

“a na m anyọ chukwu ka onye ya ama m ịhe na ịke ọ ga ejị chịa mgbe ọ ga erịgọrọ na ọkwa dị ka onyeisiala”

Ihe i kwesiri ịma maka Onyeisiala mba Senegal a họputara ọhụrụ

  • A muru onyeisiala mba Senegal bu Bassirou Diomaye Faye na afọ 1980 na mpaghara Ndiaganio, ọdịda anyanwụ Senegal.
  • Na afọ 2007 ka ọ sonyere ndị ọrụ ọnakọ ụtụịsị tdụpụụ ọbanye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
  • ọ rụrụ ọrụ ịna ụtụịsị ịhe karịrị afọ ịrị abụọ.
  • Ọ bụ ezigbo enyi onye ndu ndị ekweghị ekwe n'oge Onyeisiala Macky Sall nọ n'ọchichị.