Lee ihe Igwe Mmaku kwuru maka nwaanyị ajadụ a gbara ọtọ kpụgharịa n'obodo
Mkpu ka na-ada ebe niile maka onyonyoo gosiri ebe ụmụokorobịa obodo Agunese, Mmakụ dị n'Okpuru ọchịchị Awgu, Enugwu steeti, gbara otu nwaanyị ajadụ ọtọ, kedo ya ọmụ n'ukwu ma kpụgharịa ya obodo niile n'ihi ebubo na o mebiri omenala ha.
Ya bụ ihe mere n'ụbọchị 27 nke ọnwa Ọktoba afọ 2022, dịka ha boro ebubo ha na nwaanyị ahụ gara tụtụọ eju n'ọhịa gbara ụlọ arụsị ha gburu gburu.
Nke a mere ka Igwe na-achị obodo Mmakụ bụ igwe Mmaduabuchị Nevoobasi, a ma dịka Omelenyi nke Mmakụ na Ogilishi Ndigbo, were obi mwute katọọ ajọ akparamagwa ahụ.

Ebe foto si, BBC/Screenshot
Igwe Nevobasi, gwara BBC Igbo na "ụdịrị arụ dị etu a emebeghị mbụ" kemgbe ihe karịrị afọ iri abụọ na ise ọ bụ igwe obodo Mmaku.
Ọ sị ọ gbagwojuru ya anya ka ndị kpara ike a si nwee obị gbaa nwaanyị ọtọ ma mee ya akaja, makana ihe dị etu a abụghị omenala Mmakụ nke o ji abụ omenala Igbo.
O kwuru sị “Ihe ụmụokorobia ahụ mere, jọgburu udele ma sigbuo nkapị...ihe ha kwesiri ime bụ na o nwee iwu obodo ha chere na nwaanyị ahụ dara, ha kwesịrị ibu ụzọ bịa gwa mụnwa bụ igwe obodo, ma ọ bụ onye isi ọgọ mmụọ Mmakụ.
"Anyị ka ọ dịịrị iji aka anyị mezịe ihe ọbụla mebiri emebi."
Igwe nevobasi kwukwara na ya ga-enye ndị uweojii nkwado zuru oke iji hụ na ndị ahụ ọ sị kpụrụ aha obodo Mmaku n'aja ụrọ, tara ahụhụ dịrị ha n'ụlọmkpọrọ.
"Hapụnụ arụsị ka o jiri aka ya bọọ ọbọ"

Onyeisi Okpuruọchịchị Awgu bụ Pedro Nwankwo, kwuru na ịgba nwaanyị ọtọ megidere iwu obodo Naijiria ma megidekwa omenala ndị igbo.
Pedro gbarụrụ ihu kwuo na ndị ntorobịa ahụ ekwesighị ịgbara arụsị ọgụ, kama na arụsị kwesịrị iji aka ya gbaa ọgụ.
"Ụmụokorobịa ahụ kwesịrị iduru nwaanyị ahụ dugara igwe ma ọ bụ ndị uweojii oge ha chere na ọ dara iwu.
"Mụ onyem dịka onyeisi nke Okpuruọchịchị Awgu ga-akwado ka a taa ha ahụhụ rue n'isi njedebe dịka iwu obodo si kwuo."
Pedro, kwuru na ịta ndị a ahụhụ ga-enyere aka kwụsị ụdị akparamagwa ahụ ime ọzọ.
'Iwu 'VAP' dị ire n’Enugwu'

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Kọmishọna na-ahụ maka Okike (Gender) n'Enugwu steeti bụ Peace Nnaji, tinyere ọnụ n'okwu ahụ ma kwuo na ngalaba nke "Tamar sac" dị n'okpuru ụlọọrụ 'Gender Affairs' n'Enugwu, ga-eji iwu a kpọrọ VAP (Violence Against Persons) nke Enugwu steeti wee kpee ikpe maka ịgba nwaanyị ajadụ ahụ ọtọ, tie ya ihe, kpụgharị ya n'obodo, kee ya ọmụ n'ukwu, bukwasa ya ejula n'isi ma see ya ihe onyonyoo tinye na soshal midia.
Nnaji gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ nwaanyị na-enwe nsogbu ahụ mgbu nakwa obi nkoropu kamgbe etichara ya ihe ma mee ya akaja.
"Ihe ha tiri nwaanyị ahụ mebiri ikike dịịrị ya dịka mmadụ. Ụlọikpe ga-ata ha ahụhụ dịịrị njọ ha.
"Ọ bụ ihe mwute na ụmụokorobịa atụghị egwu were gbaa nwaanyị bụ nwunye ha, nwanne ha nakwa nne ha ọtọ ma see ya foto, kesaa na soshal midia."
Ọtụtụ otu na-ahụ maka ikike dịrị onye, kwuru na ha na-esosi ya bụ ikpe n'ike n'ike iji hụ na gọọmenti mere ihe ha kwesiri ime.
Onyeisi otu a ma dịka International Federation of Women Lawyers (Fida) n’Enugwu steeti bụ Ọkaikpe Cecilia Ngozi Onyia, tinyere ọnụ na ya bụ okwu.
Ọ gwara BBC, "Anyị na-eso ndị uweojii n'ọkụ n'ọkụ iji hụ na ha jidere ndị ọzọ niile aka ha dị na ya bụ ihe...Ọrụ anyị gụnyere ihụ na anapụghị nwaanyị ọbụla ikike dịịrị ya dịka onye Naijiria."
Nke a mere Ọkaikpe Onyia ji kwuo na ha aghaghị ihụ na ndị aka ha dị n'ịgba nwaanyị ahụ ọtọ ga-agarịrị mkpọrọ.
Onye ji ọkwa onyeisi otu Global Society for Anti Corruption na Naịjiria bụ Ambasadọ Amaka Nweke JP, ji anyammiri kwuo na "Oge m hụrụ ihe onyonyo ahụ na soshal midia, obi gbawara m na ụmụokoroba kara obi gbaa nne ha ọtọ maka ihe na-enweghị isi."
Angela Anuo bụ otu n'ime otu a kpọrọ Ụmụada Mmaku Worldwide, kwuputere mwute ya ma sị "Oge m hụrụ ihe onyonyo ahụ, nnukwu ihere mebere m, ọ dị ka m dakpuo n'ala n'ihi na ụmụokorobia be anyị mebọrọ anyị."
Anuo kwuru na ọ dị mma etu igwe obodo Mmaku na onyeisioche Okpuruọchịchị Awgu si kpọpụta ndị kpara arụ ahụ, ma kwuo na ọ bụ ọrụ ndị uweojii ịkpọpụta ndi niile aka ha dị na ya bụ arụ ka na-agba ọsọ ugbua.









