Apịara m ihe abalị abụọ maka ebubo amosu - Amarachi Okechi

Otu ajadu nwaanyị bụ Amarachi Okechi eriela arịrị dịka etiri ya ihe abalị abụọ maka ebubo na ọ bụ amosu.

Ndị nọ ebe ihe a mere kwuru na e ji ụdọ kechie Okechi aka na ụkwụ kpụpụ ya n'ahịa n'obodo Umueghu dị n'Amaegbuato n'okpuru ọchichi Bende, ebe a nọ pịa ya ụtarị apịa apịa.

A sị na ọ bụ nwunye nwanne di ya boro ya boro nwaanyị a ebubo ịta nwa ya nwaanyị amosu.

Okechi na-ekwu na etiri ya ihe ụbọchị abụọ ma hapụ ya ka ọ rahụ n'ezi.

O kwuru sị, " Ha boro m ebubo, gaa n'ụlọ m choọcha ma enweghị ihe ha hụrụ".

Okechi kwuru sị, " Ndị okenye nọ ebe ahụ ma ụmụnwaanyị mgbe a na-eti m ihe, enweghị ihe ha mere zopụta m".

kirie akụkọ nwaanyị a n'uju ya.

Nwaanyị ajadu apịara ihe