Igbo Masquerades: Mmanwụ dị ịche ịche na mgbe ndị Igbo ji eti ha

Dịka aha ya siri dị, bụ okwu Igbo abụọ etịkọrọ ọnụ nke bụ MỤỌ na ỌNWỤ.
Mazị Chigozie Nnabuihe gwara BBC Igbo na ụfọdụ ndị amaara maka iti mụọọnwụ n'ala Igbo bụ obodo ndị dịka Arondizuogu, Orlu, Ozobullu, Ọnịcha na ndị ọzọ.
Ọkankụzi bụ Iwu Ikwubuzo gwara BBC Igbo na mụọọnwụ nwere otu ma bụrụ kwa ihe a na-aba aba.
Ọ kọwara na ndị nọ otu mọụọnwụ anaghị agwa ndị na esoghị na otu ha ihe ọbụla gbasara mụọọnwụ.
Kedụ mgbe e ji eti mụọọnwụ?
Omenala Igbo bụ otu n'ime njirimara ndị Igbo ha ji eme ọnụ. E nwere ọtụtụ emume na mmemme dị iche iche nke jupụtara n'ala Igbo.
Ọ bụ oge ndị a ka ndị Igbo ji eti mmanwụ.
Lee ụfọdụ mmemme ndị a ndị Igbo ji eti mụọọnwụ.

Emume Afọ ọhụrụ

Emume afọ ọhụrụ dịka nke ndị Obu Umunri dị na be Igwe Enugwu-Ukwu na-eme.
Mmemme Ịgụ-Arọ bụ mgbe Igwe Enugwu-Ukwu ji akpọkọba ndị ọ na-achị ọnụ, kpee ekpere wee malite ịgụ afọ ọhụrụ.
Ikwubuzo kwuru sị, " mụọọnwụ bụ ihe ndị Igbo ji eme obi ụtọ, na mbụ na mbụ ọ nụ ihe eji eme obi ụtọ n'obodo, ọ bụghị ihe eji emebi ihe".
Lee ụfọdụ mụọnwụ a mgbe a na-eti oge a


Mgbe oke mmadụ nwụrụ maọbụ mgbe onye nọ otu mụọnwụ nwụrụ

Iwu Ikwubuzo kwukwara na ụfọdụ mgbe onye nọ na mụọnwụ maọbụ onye chiri echichi nwụọ, ndụ otu ya bụ ndị mụọnwụ ga-etipụta mụọnwụ.
Ụfọdụ otui ndị dịka otu Ekpe nwere mụọ nke ha na-eti oge e nwere emume, kama mgbe onye otu ha nwụrụ,a ha na-etpụtakwa mụọnwụ.
Oge emume Ofala

Ebe foto si, TWITTER/OFALA ONITSHA
Nchọpụta gosiri na Ọfala bụ mkpuruọkwụ abụọ jikọrọ ọnụ; "ọfọ" na "ala".
Ọfala bụ nnukwu emume n'ala Igbo, tụmadị n'Anambra.
Ọ bụ emume nke eze obodo ji egosi ndị ọ na-achị onwe ya kwa afọ.
Ndị obodo na-ejikwa emume a ekwuputa nkwenye ha na irube isi ha nye eze ha.
Eze ndị obodo dị ịche n'Anambre steeti na-agba ọfala, mana ọbụ nke ndị Ọnịcha kacha ada ụda
Emume Ikeji ndị Arọchukwu na Arọndịzuọgụ.

Ebe foto si, IKEJI AROCHUKWU TOWN UNION
Ikeji Aro bụ emume ndị Arochukwu ji eme iri jị ọhụrụ ha.
Ha na-eji ohere a agọ ọfọ, tee egwu, rie nri ma ñụọ mmanya maka afọ gara aga, ebe ha na-arịrọ chukwu maka afọ ọrụ ugbo ọhụrụ.











