Ngagharịudo ụmụnwaanyị Uzzi maka ebubo na mahadum Michael Okpara, Umudike napụrụ ha ala
Ụmụnwaanyị obodo Uzzi nke n’Olokoro, okpuruọchịchị Umuahia South eburula mkpesa ha pụta ọgbọ. Nke a mere n’ụbọchị Tuzde n’ihu ogige ụlọikpe ukwu nke Umuahia, Abia steeti bụ ebe ha nọ kwuo na o meela afọ isii ha na mahadum Michael Okpara, Umudike na-adọ okwu ala bụ nke ha na-ebo ebubo na ụlọakwụkwọ ahụ napụrụ ha n’ike.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo n’Abia jiri anya ya hụ ma zute ụmụnwaanyị a n’ihu ụlọikpe ahụ na Tuzde.

Ụmụnwaanyị ndị kwuru na ala bụ ala nna nna ha nyere ha maka iji na-arụ ọrụ ugbo nke ha ji azụ ezinaụlọ ha.
Ha rịọrọ gọọmentị Abịa ka ha gwaa ụlọakwụkwọ ahụ ka a hapụrụ ha ala ha.
Ha kwukwara na dịka okwu a nọ ụlọikpe na ndị nne nwaanyị be ha nọ na-atụ ego ha enweghi enwe maka iji kwụọ ndị ọkaiwu ha ụgwọ iwe ike igara ha ya bụ ikpe.
Ha kwuru na okwu a bụ ihe mwute nye ha.

Ebe foto si, Michael Okpara University of Agric/Facebook
Mgbe BBC Igbo kpọturu ọnụ na-ekwuru mahadum ahụ bụ Adanma Odefa, o sara okwu a sị:
“Iwu Naịjirịa kwuru na ala niile nọ na Naịjirịa bụ nke gọọmentị etiti, mahadum anyị bụ nke gọọmentị etiti, ala a ndị obodo a na-ebo ebubo maka ya bụ ala gọọmentị kenyere anyị kemgbe.”
O kụchapụkwara ebubo na mahadum ahụ zitere ndị agboro na-amaja ndị obodo ahụ na ya bụ ala.
“Anyị ejighi ndị agboro napụ ha ala, akụkọ a bụ okwu ngọteghie nke nọ n’ụlọikpe ugbua.”
Odefa kwuru na ọ chere n’okwu a bụ nghọtehie mkparịtaụka nakwa ụlọikpe ga-enweike kpesie dịka o kwuru:
"Anyị na ndị obodo a na-ebi n’udo kemgbe.”
Kirie ihe ha kwuru n'uju n'ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a.









