Ngagharịudo ụmụnwaanyị Uzzi maka ebubo na mahadum Michael Okpara, Umudike napụrụ ha ala

Aha onyonyo, Ngagharịndo ụmụnwaanyị Uzzi maka ebubo na mahadum Michael Okpara, Umudike napụrụ ha ala

Ụmụnwaanyị obodo Uzzi nke n’Olokoro, okpuruọchịchị Umuahia South eburula mkpesa ha pụta ọgbọ. Nke a mere n’ụbọchị Tuzde n’ihu ogige ụlọikpe ukwu nke Umuahia, Abia steeti bụ ebe ha nọ kwuo na o meela afọ isii ha na mahadum Michael Okpara, Umudike na-adọ okwu ala bụ nke ha na-ebo ebubo na ụlọakwụkwọ ahụ napụrụ ha n’ike.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo n’Abia jiri anya ya hụ ma zute ụmụnwaanyị a n’ihu ụlọikpe ahụ na Tuzde.

Ụfọdụ ụmụnwaanyị Uzzi ji akwa na bata ogige ụlọikpe ukwu Ụmụahịa maka okwu ala ha.
Nkọwa foto, Ụfọdụ ụmụnwaanyị Uzzi ji akwa na bata ogige ụlọikpe ukwu Ụmụahịa maka okwu ala ha.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ụmụnwaanyị ndị kwuru na ala bụ ala nna nna ha nyere ha maka iji na-arụ ọrụ ugbo nke ha ji azụ ezinaụlọ ha.

Ha rịọrọ gọọmentị Abịa ka ha gwaa ụlọakwụkwọ ahụ ka a hapụrụ ha ala ha.

Ha kwukwara na dịka okwu a nọ ụlọikpe na ndị nne nwaanyị be ha nọ na-atụ ego ha enweghi enwe maka iji kwụọ ndị ọkaiwu ha ụgwọ iwe ike igara ha ya bụ ikpe.

Ha kwuru na okwu a bụ ihe mwute nye ha.

Umudike

Ebe foto si, Michael Okpara University of Agric/Facebook

Mgbe BBC Igbo kpọturu ọnụ na-ekwuru mahadum ahụ bụ Adanma Odefa, o sara okwu a sị:

“Iwu Naịjirịa kwuru na ala niile nọ na Naịjirịa bụ nke gọọmentị etiti, mahadum anyị bụ nke gọọmentị etiti, ala a ndị obodo a na-ebo ebubo maka ya bụ ala gọọmentị kenyere anyị kemgbe.”

O kụchapụkwara ebubo na mahadum ahụ zitere ndị agboro na-amaja ndị obodo ahụ na ya bụ ala.

“Anyị ejighi ndị agboro napụ ha ala, akụkọ a bụ okwu ngọteghie nke nọ n’ụlọikpe ugbua.”

Odefa kwuru na ọ chere n’okwu a bụ nghọtehie mkparịtaụka nakwa ụlọikpe ga-enweike kpesie dịka o kwuru:

"Anyị na ndị obodo a na-ebi n’udo kemgbe.”

Kirie ihe ha kwuru n'uju n'ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a.