Abia Poly Disaccredited: Gọọmentị Abịa steeti egosila ndị isi Abia Poly iwe ha

Abia State Polytechnic controversy: 'Ọ bụ 'Bursar' mere na anyị akwụbeghị ndị nkuzi ụgwọ'

Abia State Polytechnic

Ebe foto si, Abia State Polytechnic

Gọọmentị Abia steeti ekwuola na ihe ji ha iwepụta nde naira 450( 450m) maka ịkwụ ndị nkuzi 'Abia State Polytechnic' dị n' Aba bụ maka ọgbatauhie nke ọnataego ụlọakwụkwọ.

Govọọmenti steeti ahụ kwuru nke a site n'olu Komishona na-ahụ maka mgbasaozi bụ Ọkaiwu Eze Chikamnayo sịrị nwere ike ịchụ nwa amadi bụ Omenihu Nwabughogu maka ebubo a.

Chikamnayo kwuru n' ọkwa ndị ntaakụkọ na nsonso a mara na nsonso a, sị, " " ọnataego ụlọakwụkwọ ahụ nwere ike irite ntarahahụhụ maka ịdọghachi elekere azụ n'okwu gọọmenti iwepụta N450m na ego ndị ọzọ a mapụtara maka politeknik.

"Cheta na imepe otu akpa ego nke a kpọrọ 'TSA' bụ ọnọdụ e nyere tupu gọọmentị steeti ewepụta nde 450 maka ịkwụ ndị nkuzi."

O nyere ntuziaka na ọnataego ahụ nwere naani otu abalị iji mepe akpaego ahụ maọbụ a chụọ ya n'ọrụ.

Cheta na ngalaba gọọmenti etiti na-ahụ maka agụmakwụkwọ nka a kporọ National Board for Technical Education (NBTE) na Bekee nọrọ na n'ọnwa Julai afọ 2022 napụ ụlọakwụkwọ ahụ dị elu ikike inye asambodo n'ihi akwụghị ndị nkuzi ụgwọ ogologo oge.

N'otu aka ahụ, ọnwa ole na ole gara aka, a napụkwara mahadum 'Abia State University' ikike inye asambodo n'ihi ụgwọ e ji ndị nkuzi ha.

Gọọmentị Abịa steeti egosila ndị isi Abia Poly iwe ha
Gọvanọ Abia steeti

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu/Facebook

Gọọmentị Abia steeti akwụsịla ndị isi ọchịchị ụlọakwọụkwọ Abia Poly ọrụ nwa mgbe nta maka okwu nnapụ ikike ịrụ ọrụ dịka mahadum zuru oke nke ụlọọrụ National Board for Technical Education (NBTE) mere na nso nso ebe ahụ.

Ozi gọọmentị zipụtara rịọrọ ụmụakwụkwọ mahadum a ka ha nọrọ jụụ ma ghara ịtụ ụjọ.

Ozi a dere: “Ihe a ụlọọrụ NBTE mere bụ ihe ihere nke nwereike ikposa udo na ịdịnaọtụ dị n’Abia steeti”

“Ihe a ga-emetụta ụmụakwụkwọ anyị n’ụzọ ọjọọ”.

Gọọmentị gara n’ihu họpụta mmadu isii ọhụrụ ga-anọ n’isi ọrụ ịhụ na enyeghachiri ụlọakwụkwọ a ikike anapụrụ ha tupu abalị 30 agachaa.

Ndị a bụ: Ikechi Mgboji (Onyeisi otu a), John Nwadioha, Jude Udeachara, Kelechi Anyanwu, Love Ezema na Stanley Nwankpa (Onyeisi otu jịkọrọ ụmụakwụkwọ mahadum ahụ)

Ụmụakwụkwọ Abia Poly

Ngalaba gọọmentị na-elekọta mahadum Politeknik na Naịjịrịa bụ ‘National Board for Technical Education’ gwara BBC Igbo n'ụbọchị Wenezde ọ bụ eziokwu na anapụla ụlọakwụkwọ politeknik nke Abia steeti ikike ịbụ mahadum zuru oke.

Otu onye welitere isi n'ụlọọrụ ahụ kwuru nke a n'ụtụtụ Tuzde dịka ọ kọwara na ọ bụ n'ihi na ụlọakwụkwọ akwụghị ndị ọrụ ha ụgwọ ọnwa ruo afọ abụọ na ọkara.

Abịa steeti polytechnic

Ebe foto si, Abia Poly/Facebook

Gịnị na-eme n'ụlọakwụkwọ ahụ ugbua?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye ntaakụkọ BBC Igbo garuru n’ụlọakwụkwọ ahụ n'ụbọchị Wenezde ịjụ ha maka ihe a mere. O kwuru na ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa wujuru n'ime ya bụ ụlọakwụkwọ dịka a na-eche na ụmụakwụkwọ na-akwado ime ngagharịiwe maka ihe a mere n'ụlọakwụkwọ ha.

Ọnụ na-ekwuru ụlọakwụkwọ bụ nwaada Nwakanma Stella ekweghị inye asịsa maka napụ ikike a dịka o kwuru na "Nke bụ eziokwu bụ NBTE ezitebeghiri anyị akwụkwọ ozi na ha anapụla anyị ikike ịbụ mahadum n'uju, agụmakwụkwọ ka na-aga n'ihu ebe a"

Ọ gara n'ihu kwuo: “Ọ bụ onyeisi ụlọakwụkwọ maọbụ osote ya ga-ekwu okwu gbara ọkpụrụ akụkọ nnapụ ikike a a”

Osote onyeisi ụlọakwụkwọ ekweghịkwanụ kwuo okwu.

Ugbua, a na-echezi onyeisi ya bụ ụlọakwụkwọ bụ Kalu Osonwa ka o kwuo nke bụ nke n’okwu a.

Cheta na n'ọdịnso a, ụlọọrụ nlekọta ndị mahadum nke 'Nigerian Universities Commission (NUC)' napụrụ ngalaba ọzụzụ ndị dọkịnta na mahadum Abịa steeti ikike inye ndị nke ha asambodo zuru oke maka ọnọdụ ọjọọ ụlọakwụkwọ ha nọ.

Ụmụakwụkwọ Abia Poly

Gịnị ka ụmụakwụkwọ mahadum a na-ekwu?

Ụmụ akwụkwọ onye ntaakụkọ anyị hụrụ na-achọghi ka a kpọọ aha ha kwuru:

‘Obi adịghị anyị mma maka ihe a mere, kedụ ka anyị ga-esi na-akwụ ụgwọ akwụkwọ ma ndị isi ụlọakwụkwọ anyị aghara ị na-akwụ ndị nkuzi ụgwọ’

Otu nwaada ọzọ kwuru: “N’ezie ọnọdụ nkuzi n’ụlọakwụkwọ anyị na-akpụ afọ n’ala kemgbe ugbua ka anyị matara na ọ bụ ụgwọ eji ndị nkuzi kpalitere nke a’

Otu onye ọzọ gụcharala ma na-akwado ife ala nna na NYSC ji obi mgbawa kwa arịrị kwuo:

‘Lee anya na ndị ogbo m si ụlọakwụkwọ ndị ọzọ ga-agafezi m n’ihi ihe a mere n’ụlọakwụkwọ anyị’.

Onye ntaakụkọ anyị kwuru na ụmụakwụkwọ ndị a gbara ama na ha na-akwado ime ngagharịiwe maka nnapụ ikike a n’ihi obi adịghị ha mma ma ncha.

Gini ka NBTE kwuru maka napụ ikike a?

NBTE n'ozi ha kọwara na ha mere mkpebi a n’ihi nchọpụta na agbenyghị ozi ịdọ aka na ntị ha ha na mahadum ahụ gara n'ihu ghara ịkwụ ndị ọrụ na ndị nkuzi ha ụgwọ ọnwa ha ruo afọ abụọ n’ọkara.

NBTE kọwara na ha gwara ụlọakwụkwọ ahụ na ụkpụrụ ọrụ ha gụnyere ịhụ na akwụrụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa ha n’oge.

Ha depụtara “Ịkwụ ụgwọ so na otu n’ime ihe ga-ahụ na agụmakwụkwọ zuru oke na-aga n’ihu na ngalaba nakwa ụlọakwụkwọ ndị polytechnics, Technical/Vocational Education na Training institution anyị na-elekọta.”

Ha gara n’ihu gwaa ụlọọrụ na-ahụ maka ndị na-achọ ike ala nna nke National Youth Service Corps kaha ghara inabata ụmụakwụkwọ si na mahadum Abia Polytechnic n’ihi agụmakwụkwọ ha ezughizi oke n’anya ha.

NBTE kwukwara na ha ezigarala ụlọọrụ na-ahụ maka inye ndị mahadum ego nlekọta bụ Tertiary Education Trust Fund and Industrial Training Fund ka ha kwụsị ikenye mahadum a ego gawa n’ihu.

Ime mahadum Abia polytechnic

Ebe foto si, Abia Poly/Facebook

Nkọwa foto, Ime mahadum Abia polytechnic

Gịnị bụ “Accreditation”?

Ihe a ndị Bekee na-akpọ ‘Accreditation’ a na-enye ụlọakwụkwọ nke gụnyere ndị mahadum bụ ikike ụlọakwụkwọ ịrụ ọrụ n’ụzọ zuru oke.

Ụlọọrụ gọọmentị nke ‘National Board for Technical Education’ (NBTE) na-ahụ maka inye ndị mahadum Polytechnic nọ na Naịjirịa ikike ebe National Universities Commission (NUC) na-elekọta mahadum ndị University na-ahụ maka ikike nke ha.

Ụlọọrụ ndị na-aga njem ugboro ugboro na mahadum dị icheiche mee nyocha ma usoro ọzụzụ, nkuzi ụmụakwụkwụọ nakwa ọnọdụ ụlọakwụkwọ ndị nọ n’okpuru ha ma ọ zuru oke inye ụmụakwụkwọ agụmakwụkwọ kwụ chim.

Ewepụ itinye anya na agụmakwụkwọ nakwa ihe a n- ekuziri ụmụakwụkwọ, ụlọọrụ na-elekọtakwa ọnọdụ ụlọakwụkwọ, ebe obibi nke ụmụakwụkwọ nọ n’ime mahadum, ọnọdụ akụrụngwa ọrụ e ji enye ụmụakwụkwọ ọzụzụ nakwa ihe ndị ọzọ metụtara ndị nkuzi mahadum.

Ugboro ugboro ụlọọrụ ndị a na-enye mahadum ndị ha nyochapụtara tozuru oke n’ọrụ ikike ịrụ ọrụ, ebe ha na-anapụkwa ndị nke ha nyochapụtara na ha na-adụla azụ n’ọrụ ya bụ ikike.