Fish Magnet: Lee etu ngagharị maka ogbugbu ya si aga

Dịka a na-eme emume nchata Ifesinachi Onyekesi Martin nke a kpọrọ "candlelight" bụ nke e ji akwanyere ya ugwu ikpeazụ, ọtụtụ ndị mmadụ sonyere mee mmemme ahụ.
Cheta na Ifesinachi Onyekesi Martin bụ onye nwe ụlọọrụ ebe a na-ere azụ nke a akpọrọ Fish Magnet.
A tọọrọ Ifesinachi n'ụlọ ha n'Anambra steeti ma gbuo ya n'ọnwa Julaị 2025.
Ndị bịara emume ịmụrụ ya anya abalị nakwa nke a kpọrọ 'candlelight' mere ngagharị bido n'ụlọọrụ Fish Magnet ruo n'ụzọ Aroma.

Ọtụtụ ndị a maama sonyere na ngagharị ahụ gunyere Martins Otse nke e ji VeryDarkMan mara.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ha ga-enyereaka mee ka ngaghari na mmemme olili ozu Ifesinachi gaa n'udo.

Onye bụ Fish Magnet?
Lee nwa nkenke ihe i kwesịrị ịma maka nwaokoroọbịa e jiri Fish Magnet mara:
- Ezigbo aha Fish Magnet bụ Ifesinachi Martin Onyekesi
- A mụrụ ya na Julaị 8.
- A maara ya dịka onye na-akọ azụ ma na-erekwa ya n'ụdị dị icheiche n'Awka Anambra steeti.
- Ọ nwụrụ n'ụbọchị 28 Julaị 2025

Ebe foto si, Fish Magnet/Facebook
Gụọ ihe Gọọmentị Anambra steeti kwuru banyere ọnwụ Ifesinachi Onyekesi Martin nwe Fish Magnet
Gọọmentị Anambra steeti akatọọla etu e si gbuo Ifesinachi Onyekesi Martin nwee ụlọọrụ Fish Magnet.
Kọmịshịọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ Law Mefor mere ka a mata nke a dịka ọ gachara mgbaru akwa n'ezinaụlọ nwa amadị ahụ e gburu egbu.
Law Mefor kọwara na ya agaala tie ezinaụlọ Ifesinachi ma hụ nne ya ma kọwaa ọnọdụ ọ hụrụ ezinaụlọ ahụ dịka ihe na-agbawa obi.
N'okwu ya "a gara m mgbaru akwa gaa hụ nne na ezinaụlọ nwa amadị a na-azụ azụ".
"Nne ya bụ onyeisi ụmụ nwaanyị n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị anyị".
"Ihe m hụrụ na-agbawa obi maka na Ifesinachi bụ naanị otu nwa nwoke nne ya mụrụ".
"E nyere nne ya okwu agbamume maka na nke a bụ ihe na-ewute anyị niile".


Ebe foto si, Fish Magnet/Charlse Soludo / Facebook
Etu gọọmenti si ahụ ihe mere - Mefor
Law Mefor kọwara na "Gọọmenti Anambra steeti na-ahụ ihe mere dịka ịma ụlọọrụ nchekwa dị na steetị ahụ aka."
"Onye ọbụla na-ada iwu, na-eme ihe megidere iwu maara na anyị nwere otu nchekwa Agu na-eche mba na 'Operation udo ga-achị" n' Anambra Steeti na-echere ya."
Cheta na ndị uwojii wepụtara akụkụ n'abalị garaaga kwuo na ha enwetara ụgbọala Fish-Magnet bụ nke ndị omekome ahụ jiri tọrọ ya ".
" Ndị mere ihe na-agba ọsọ ugbua mana anyị ma na mgbe na-eteghị aka ná a ga-ejide ha".
"Onweghi onye ga-akpa udiri arụ a n'Anambra steetị ọzọ ma gbalaga".
Etu e si tọọrọ ma gbuo Ifesinachi Onyekesi Martin nwee ụlọọrụ Fish Magnet dị n'Awka, Anambra Steeti
Akwa na-arị ibe ya elu maka ogbugbu e gburu Ifesinachi Onyekesi Martin bụ nwokoroọbịa a ma ama nwee ụlọọrụ 'Fish Magnet' dị n'Awka nke Anambra Steeti.
Akụkọ kwuru na ndị ntọrị wuchiri n'ụlọ nwamadị dị n'Ezinifite, Okpuno, Awka n'ụbọchị 27 Julaị, gbaa ya egbe n'ụkwụ ma tọọrọ ya.
Na-erughi otu ụbọchị nke a mechara, ndị ntọrị ahụ kpọrọ ezinaụlọ ya n'ekwentị ma sị ha bịa buru ozu nwa ha nwụrụ anwụ.
Dịka ọnwụ nwamadị a pụtara ihe, soshal midia nwuuru ọkụ maka na ọ bụ onye a ma ama na-eji soshal midia ere azụ ya.

Ebe foto si, Anambra State Police
Ndị uweojii Anambra Steeti kwuru na ha na-esi imi n'ala iji chọpụta ma jide ndị ntọrị ahụ tọọrọ ma gbuo otu fish magnet'.
N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Wenezde, ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga kwuru na enwetela ụgbọala nwamadị a ndị ahụ ji tọọrọ ya.
Ikenga kwuru na nnyocha ha mere gosiri na ndị ntọrị a so nwamadị a n'azụ ruo n'ụlọ ya tupu ha awakpo ya, gbaa ma buru ya gbafuo.
O kwuru n'ebe a hụrụ ụgbọala ya bụ n'okporoụzọ Ukwulu/Igbariam dị steeti ahụ.
Ndị uweojii gaara n'ihu kwuo na ụgwọ ha ji ezinaụlọ ya na ndị Anambra bụ ịgba mbọ chọpụta ndị ntọrị ahụ ma taa ha ahụhụ ruuru ha.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ ụlọọrụ nwamadị a bụ 'Fish Magnet' n'ekwentị, otu n'ime ha zara ekwentị kwuru na ọ bụ eziokwu na onyeisi anwụọla.
O nweghi ihe ọzọ o kwuru banyere nke a kama ọ sị ka anyị kpọtụrụ ezinaụlọ ya.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ezinaụlọ Onyekesi.








